Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex: 17:8-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 120:1-8 Az. 2
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2 Tim: 3:14 4:2
- OziọmaLk: 18:1-8
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ex: 17:8-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Ndị Amalek bịara buso ụmụ Izrel agha na Refidim. Mosis were gwa Joshua sị: “Họpụtara onwe gị ụmụ okorobịa. N’ụtụtụ echi, gaanụ ka ụnụ na ndị Amalek lụọ agha. Mgbe a na-alụ agha ahụ, aga m eguzo n’elu ugwu, jide mkpara Chineke n’aka.” Joshua mere ihe Mosis gwara ya, wee lụso ndị Amalek agha. Ma Mosis na Erọn na Hur rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ bụla aka Mosis lara elu, ụmụ Izrel na-enwe mmeri; ma mgbe ọ bụla Mosis wedatara aka ya ala, mmeri abụrụ nke ndị Amalek. Ma aka bidoro nyịwa Mosis arọ; N’ihi ya, ha were okwute dowere ya ka ọ nọdụ ala. Erọn na Hur ewere na-akwalite aka Mosis; otu onye na-akwalite aka nri ya, onye nke ọzọ na-akwalite aka ekpe ya. Ihe a ka aka ya jiri lagide elu ruo mgbe anyanwụ dara. Joshua were mma agha gbuchapụ Amalek na ndị nke ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 120:1-8 Az. 2
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.
1. Eleliri m anya n’ugwu: Olee ebe enyemaka m ga-esi abịa?
Enyemaka m ga-esi n’aka Onyenweanyị,
Onye mere eluigwe na ala.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.
2. Ya ekwekwala ka ụkwụ gbachapụ gị.
Ụra atụkwala Onye ahụ na-eche gị.
Mba! Onye ahụ na-eche Izrel mụ anya;
Ọ naghị arahụ ụra.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.
3. Onyenweanyị bụ Onye nche gị,
bụrụkwa ebe nchedo gị. Ọ nọ gị n’aka nri.
Anwụ agaghị emerụ gị ahụ n’ehihie.
Ọnwa agaghị emerụ gị ahụ n’abalị.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.
4. Onyenweanyị ga-echekwaba gị,
ka ajọ ihe ọ bụla ghara irute gị.
Ọ ga-echekwaba ndụ gị.
Onyenweanyị ga-echekwaba ọpụpụ na mbata gị,
bido ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –2 Tim: 3:14 4:2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Timoti
Jidesie aka ike n’ihe a kuziri gị, na ihe ahụ were gị anya na ọ bụ eziokwu. Chetakwa ndị kuziiri gị ihe a, na, otu o si bụrụ, na i bidoro na nwata mụta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ n’ihe ndị a, ka i si amụta amamihe nke na-eduba na nzọpụta, site n’ikwere na Jesu Kristi. Ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ ihe Chineke kwuru. Ha niile bara uru maka ikuzi nkuzi, maka ịgbaziri onye gahiere ụzọ, maka iduzi ndụ ndị mmadụ na ikuziri ha ịdị nsọ. Ọ bụ otu a ka onye ihe Chineke na-anụ ọkụ n’obi, sị abụ onye e nyere ngwa ọrụ, na onye a kwadoro nke ọma maka ịrụpụta ezi ọrụ. N’ihu Chineke na n’ihu Kristi Jesu, Onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, ana m eche gị ọrụ a n’ihu, n’aha Ịpụta ihe nke alaeze Ya. Na-ekwupụta ozi ahụ, ma a nabatara ya, ma a nabataghị ya, kwụsie ike na ya. Tụọ mmadụ mmehie ya n’anya. Gbaziere ndị gahiere ụzọ. Gwa ndị mmadụ ka ha na-erube isi. Ma were ndidi mee ihe niile ndị a. Buru n’obi na ọ bụ nkuzi ka ị na-akuzi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU
Aleluya, aleluya!
Okwu Chineke bụ okwu dị ndụ,
na-adịkwa ire. Ọ na-enyocha echiche na izu niile nke obi.
Aleluya!
OZIỌMA –Lk: 18:1-8
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu, banyere mkpa ọ dị ikpe ekpere ugboro ugboro, n’ekweghị ka obi daa mba: “Otu ọkaikpe bi n’otu obodo, onye na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịkwaghị asọpụrụ mmadụ. Ma n’otu obodo ahụ kwa, otu nwanyị isimkpe na-abịakwute ya akwụsị akwụsị na-asị ya: “Achọrọ m ka i kpeziere m ikpe, kpepụta m n’aka onye iro m. “Na mbụ ọ jụrụ ajụ ime ihe nwanyị ahụ gwara ya. Ma mgbe ogologo oge gasịrị, ọ mesịrị sị onwe ya: ‘Ọ bụ ezie na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghịkwa m asọpụrụ mmadụ. Ma nsogbu nwanyị isimkpe a na-enye m akarịala! Ọ naghị ekwe ka ume na obi ruo m ala. N’ihi ya, aga m ekpeziri ya ikpe, ka m ghara ịnwụchuru ya na nsogbu ya.” Onyenweanyị wee sị: “Ụnụ anụla ihe ọkaikpe arụrụala ahụ kwuru? Ọ bụ na ụnụ echeghị na Chineke ga-ekpeziri ndị Ọ họtara ahọta ikpe, ndị na-akpọku Ya abalị na ehihie, ma ọ bụrụgodụ mgbe O gburu oge n’ịgbatara ha ọsọ enyemaka? Nkwa M kwere ụnụ bụ na Ọ ga-ekpeziri ha ikpe n’oge na-adịghị anya. Ma mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, Ọ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu