Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 4:1-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 32: 1-2, 5, 11
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 12:1-7
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 4:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ka anyị were nnanna anyị Abraham dịka ihe ọmụmaatụ. A sị na a gụrụ ya dịka onye eziomume site n’ọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, mana ọ bụghị n’ihu Chineke. N’ihi Akwụkwọ Nsọ kwuru sị, “Abraham kwenyere n’ihe Chineke gwara ya; n’ihi okwukwe ya, e wee gụnye ya n’onye eziomume. N’ebe onye na-arụ ọrụ nọ, ụgwọ ọrụ ya abụghị afọọma e meere ya kama ọ bụ oke ruuru ya. Ma onye enweghị ọrụ ma tụnye okwukwe ya na Chineke, bụ onye na-agụnye ndị ajọomume na ndị eziomume, a ga-eji okwukwe ya gụnye ya na ndị eziomume. Devid n’onwe ya kwukwara banyere ngọzi dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ n’onye eziomume n’agbanyeghị ọrụ ya: “Ngọzi dịịrị ndị Chineke gbagharala njọ ha niile, ndị o kpuchikwara mmehie ha niile! Ọ dị ngọzi bụ onye Chineke na-anaghị agụrụ mmehie ya!”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 32: 1-2, 5, 11
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
1. Ngọzi na-adịrị onye nke a gbaghaara njọ ya;
Onye nke e kpochapụrụ mmehie ya
Ngọzi dịrị onye ahụ Onyenweanyị amaghị ikpe,
Onye aghụghọ adịghị n’ime obi ya.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
2. N’ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ
anakwaghị ezo njọ m ezo
Asịrị m: Aga m ekwupụtara Onyenweanyị njọ m
I wee gbaghara m njọ m niile.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
3. Ụnụ ndị eziomume, nwebenụ añụrị n’Onyenweanyị,
Tiwenụ mkpu ọñụ ụnụ ndị obi ha kwụọtọ.
Azịza: Gị bụ ebe mgbaba m, Ị na-echebe m n’oge nsogbu, I ji ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnanya dị n’iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 12:1-7
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara ọnụ nke mere ka ha na-azọgbu ibe ha, Jesu buru ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Zerenụ ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ. Ọ dịghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, mọbụ nke e zoro ezo nke mmadụ na-agaghị ama. Ihe ọbụla ụnụ kwurula n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ihe, ihe ụnụ takwụnyeerela mmadụ na ntị n’ime ụlọ, a ga-ekwusa ya n’elu ụlọ.” Agwa m ụnụ ndị enyi m, ụnụ atụla egwu ndị na-egbu anụ ahụ ha gbuchaa ya, o nweghị ihe ọzọ nke ha pụrụ ime. Kama, aga m adọ ụnụ aka na ntị onye ụnụ ga-atụ egwu: tụọnụ ya egwu bụ onye ahụ nke nwere ike ịtụba mkpụrụobi ụnụ n’ọkụmmụọ ka o gbuchara anụ ahụ, ee agwa m ụnụ tụọnụ ya egwu! Ọ bụ na ọ bụghị peni abụọ ka a na-ere ụmụnnụnụ ise? Ma Chineke anaghị echefu otu n’ime ha. Ọ bụladị ntụtụisi ụnụ a gụrụ ha niile ọnụ. Ụnụ atụla egwu; ụnụ dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụnnụnụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu