Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 3:21-29
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 130: 1-2, 3-4, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:47-54
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 3:21-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ugbu a e gosipụtala na ikpe nkwụmọtọ Chineke dị iche n’iwu. Ọ bụ eziokwu na iwu na ndịamụma gbara akaebe maka ya. Chineke na-agụzi ndị mmadụ na ndị eziomume site n’okwukwe ha nwere na Jesu Kristi, n’agbanyeghị ma ha bụ ndị Juu ma ha bụ ndị mba ọzọ. N’ihina mmadụ niile emehiela, ha etosịkwaghị otito Chineke; ma Chineke emeela ka ha bụrụ ndị eziomume site na mgbapụta nke si n’aka Jesu Kristi. Ọ bụ ya bụ onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja maka mgbaghara njọ site n’okwukwe. N’ụzọ dị otu a, Chineke na-egosịpụta ikpe nkwụmọtọ ya, na mbụ, maka oge garaaga, mgbe o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. Ma n’oge nke taa’ site n’igosi na ya onwe ya bụ onye eziomume, na onye ya na-agụ dịka onye eziomume bụ onye kwere na Jesu Kristi. Olee ebe ịnya isi anyị dịzi? A gụpụla nke ahụ n’ọgụ! Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihina anyị na-edebe ụkpụrụ nke ezi ọrụ na nke iwu Mosis? Mba! Kama, ọ bụ naanị na anyị na-eso ụkpụrụ nke okwukwe anyị kwere na Jesu Kristi. N’ihina anyị kwere na Chineke ka na-agụ mmadụ n’onye eziomume naanị site n’okwukwe. Ọ bụghị site ịrụzu ọrụ niile dị n’iwu. Chineke, Ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụghịkwa Chineke nke ndị mba ọzọ? Ee, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 130: 1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ n’ime ya ka nnukwu Nzọpụta dị.
1. N’ugbu mmiri ka m na-akpọku gị, Onyenweanyị
Onyenweanyị nụrụ akwa enyemaka m na-ebe,
che ntị n’arịrịọ m na-arịọ.
Nụrụ olu nke arịrịọ m.
Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ n’ime ya ka nnukwu Nzọpụta dị.
2. Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị,
na-agụ ajọomume anyị ọnụ,
Onyenweanyị onye ga-eguzo.
Mana ị na-agbaghara anyị,
n’ihi nke a anyị na-asọpụrụ gị.
Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ n’ime ya ka nnukwu Nzọpụta dị.
3. Ana m eche Onyenweanyị.
mkpụrụobi m na-eche ya,
na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị
Karịa otu ndị nche si eche ụtụtụ.
Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ n’ime ya ka nnukwu Nzọpụta dị.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Okwu Chineke dị ndụ, dị ike Ọ bụkwa
ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:47-54
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụnụ! N’ihina ụnụ na-arụ ili ndị amụma, ndị nna ụnụ ha gburu. Ya bụ, ụnụ bụ ndị akaebe ma kwenyekwa n’ihe ndị nna ụnụ ha mere, n’ihina ha gburu ha, ụnụ arụọ ili ha. Ọ bụ maka nke a ka Amamiihe nke Chineke ji kwuo sị, ‘Aga m ezigara ha ndị amụma, na ndịozi, ụfọdụ n’ime ha ka ha ga-egbu, takwa ha ahụhụ.’ Ya mere n’aka ọgbọ a ka Chineke ga-ajụ ese maka ọbara ndị amụma niile a gbafuru site na mbido nke ụwa, site n’ọbara Ebel ruo na nke Zekarịa, onye e gburu n’agbata ebe nchụaja n’ụlọnsọ. Ee, agwa m ụnụ, a ga-ajụ ese ha n’aka ọgbọ a. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị ọkaiwu! N’ihina ụnụ ewepụla igodo e ji agbaghe ọnụụzọ amamiihe, ụnụ abanyeghị n’onwe ụnụ, ụnụ gbochikwara ndị na-agba mbọ ibanye.” Mgbe Jesu si ebe ahụ pụọ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, na-esiri ya ọnya, ka ha mara na ga-ekwuhie ọnụ ka ha hụ ihe ha Ọ ga-eji jide ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu