Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 2:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 62:2-3, 6-7,9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:42-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 2:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
N’ihi nke a, gị bụ mmadụ, onye ọ sọrọ gị bụrụ, Ị nwegịi ngọpụ mgbe ị na-ama onyeọzọ ikpe. N’ihina mgbe ọbụla ị na-ama onyeọzọ ikpe ma gị onwe gị nọ na-eme ihe ahụ, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe. Anyị ma na o ziri ezi mgbe ikpe Chineke na-adakwasa ndị na-eme ihe ndị dị otu a. Gị bụ mmadụ, gịnị mere I ji ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe, mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ? I chere na ị ga-agbanahụ ikpe Chineke? Ihe I ji eleli eziomume anya ọ bụ n’ihina Chineke nwere oke obiọma, obi nnagide na ndidi? Ọ bụ na ị maghị na ihe Chineke ji emere gị ebere bụ ka o wee duba gị na nchegharị? Site n’obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke n’ụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. Chineke ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya niile si dị. Ndị ji ndidi nọgide n’eziomume, na-achọ otito, na nsọpụrụ n’anwụghị anwụ ka Chineke ga-enye ndụ ebighịebi. Mana ndị ahụ na-ebute ịkpaoke, ndị jụrụ ikwenye n’eziokwu ahụ, ma na-eso ụzọ ajọomume, ka Chineke ga-awụkwasa iwe na ọnụma. Mkpagbu na ihe mgbu ga-adịrị mmadụ niile ndị na-eme ihe ọjọọ, mbụ ọ ga-adịrị ndị Juu; e mechaa ọ ga-adikwara ndị mba ọzọ. Chineke ga-enye ndị niile na-eme iheọma otito, nsọpụrụ na udo; mbụ, Ọ ga-enye ndị Juu; Ọ ga-emechaa nyekwa ndị mba ọzọ. N’ihina Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 62:2-3, 6-7,9
Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị
1. Sọ na Chineke ka mkpụrụobi m nwere ezumike,
Nzọpụta m si n’aka ya abịa;
Ebe ọ bụ sọ ya bụ nkume m na nzọpụta m
ebe nchedo m enweghị m ike ịda.
Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị
2. Sọ na Chineke ka obi m ga-ezuike
na ya ka olileanya m si abịa
Naanị ya bụ nkume m nzọpụta m,
Ebe ọ bụ ebe nchedo m enweghị m ike ịda;
Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị
3. Na Chineke ka m chọtara ebe nchedo
Ndị mmadụ daberenụ na ya oge niile;
buterenụ ya mkpa ụnụ,
Chineke bụ ebe nchedo anyị.
Azịza: Onyenweanyị gị n’onwe gị na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya si dị
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya,
ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:42-46
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụnụ ndị Farisii! Ụnụ na-enye onyinye ego na nke osisi na nke nkpa akwụkwọ dị icheiche, ma leghara ikpe nkwụmọtọ na ịhụnaanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka ụnụ kwesịrị ime n’elegharaghị ndịọzọanya. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ, ndị Farisii! N’ihina ọ na-amasị ụnụ ịnọ n’oche kacha mma n’ụlọnzukọ niile na ịnara ekele pụrụ iche n’ọma ahịa. Ahụhụ ga-adịrị ụnụ! N’ihina ụnụ dịka ili ndị na-apụtaghị ihe nke ndị mmadụ na-agafe n’elu ha n’amaghị na ha dị.” Otu onye n’ime ndị ọkaiwu zara ya sị, “Onyenkuzi, mgbe Ị na-ekwu otu a, anyị sokwa na ndị Ị na-akparị. Jesu wee sị, “Ahụhụ ga-adịkwara ụnụ, ndị ọkaiwu! N’ihina ụnụ na-ebo ndị mmadụ ibu dị arọ ma ụnụ onwe ụnụ adịghị emetụ ibu ahụ ọ bụladị otu mkpịsị aka ụnụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu