Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 1:1-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps 98: 1, 2-3, 3-4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:29-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 1:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Pọl, nwodibo Dinwenụ Jesu Kristi, onye Chineke kpọrọ ịbụ onyeozi, na onye Ọ họpụtara iche ikwusa oziọma, na-edetara ụnụ akwụkwọozi nke a. Chineke kwere nkwa na mgbe ochie izi anyị oziọma nke a site n’ọnụ ndịamụma ya, dịka e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Oziọma nke a bụ maka nwa ya bụ Dinwenụ Jesu Kristi, onye a mụrụ n’ụdị nke mmadụ site n’agbụrụ nke Devid. Onye e jiri ike gosi dịka nwa nke Chukwu na mmụọ nke ịdị asọ site na mbilite n’ọnwụ ya. Site n’aka ya anatara m amara na ikikere ịbụ onyeozi, ka mba niile kwere na Chineke na egekwa ya ntị. Ụnụ ndị bi na Rom sokwa na mba ndị ahụ, ma site n’ọkpụkpọ Chineke, ụnụ abụrụla nke Kristi. Ya bụ, ụnụ ndị Chineke hụrụ n’anya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ, ka udo na amara nke Chineke nna anyị na Dinwenụ anyị Jesu Kristi dịrị ụnụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 98: 1, 2-3, 3-4
Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya.
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihina ọrụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ
eweterela ya mmeri.
Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya.
2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,
O meela ka mba niile mata eziomume ya.
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.
Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya.
3. Akụkụ ụwa niile
ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Jerusalem toonụ Onyenweanyị;
Ọ na-ezipụ okwu ya n’ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:29-32
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe igwe mmadụ ahụ na-abawanye, Jesu bidoro na-ekwu sị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ; ọ na-achọ ihe ama, ma ọ dịghị ihe ama a ga-enye ya karịa ihe ama nke Jona. N’ihina otu Jona si bụụrụ ndị obodo Ninive ihe ama, otu ahụ ka Nwa nke Mmadụ ahụ ga-esi bụụrụ ọgbọ a ihe ama. N’ụbọchị ikpe ahụ, Ezenwaanyị Ndịda ugwu ga-ebili so ọgbọ a guzo n’ikpe, kpegbue ya. N’ihina o si nsọtụ nke ụwa bịa ịnụ okwu amamiihe Solomọn. Ma lee, ihe karịrị Solomọn nọ ebe a. Ndị obodo Ninive ga-eso ọgbọ a kulie n’ụbọchị ikpe, kpegbue ya, n’ihina ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkuzi Jona, ma lee, ihe ka Jona dị n’ebe a.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu