Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jl: 4:12-21
-
Abụọma na azịza ya
Ps 97: 1-2, 5-6, 11-12
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:27-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jl: 4:12-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Joel
Ka mba niile jikere ọgụ bịa na ndagwurugwu nke Jehoshafat. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba niile gbara Zayọn gburugburu ikpe. Bido webe ihe ubi, n’ihina ọ kaala. Gaanụ ka ụnụ paa mmanya, n’ihina ihe e ji apacha mmanya ejula; ite mmanya ejufeela, n’ihina obi ọjọọ ha dị ukwu. Igwe mmadụ kwuru igwe mmadụ nọ na ndagwurugwu mkpebi ikpe; n’ihina ụbọchị nke Yahweh abịala nso na ndagwurugwu ahụ. Anyanwụ na ọnwa agbaala ọchịchịrị, kpakpando akwụsịla mmuke ha. Yahweh nọ na Zayọn na-ebigbo, a na-anụ olu ya na Jerusalem; eluigwe na ala na-ama jijiji, mana Chineke bụụrụ ndị nke ya ihe nchedo, Ọ bụụrụ Izrel ebe mgbaba siri ike. Mgbe ahụ ka mụ ga-amara na abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, onye bi na Zayọn ugwu m dị nsọ. N’oge ahuụ Jerusalem ga-abụzi ebe dị nsọ nke na o nweghị ndị mba ọzọ ga-atụ ya aka n’ihu ọzọ. N’ụbọchị ahụ, nnukwu ugwu niile ga-edepụta mmanya ụtọ. Mmiri ara ehi ga na-ehupụta n’obere ugwu ndịọzọ. Mmiri ga-eju n’iyi niile dị na Juda. Mmiri ga-esikwa n’ụlọ Yahweh gbapụta were wụjuo ndagwurugwu Shitiim. Ijipt ga atọgbọrọ chakoo, ebe Edọm ga-abụkwa ọzara, n’ihi ihe ọjọọ e mere ndị Juda. Ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha n’obodo ha. Mana ndị mmadụ ga-ebigide na Juda na Jerusalem ndụdụgandụ niile. Aga m abọ ọbọ maka ọbara ha, agaghị m ahapụ onye ọbụla ikpe mara n’ihina Yahweh bi na Zayọn.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 97: 1-2, 5-6, 11-12
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
1. Onyenweanyị bụ eze! Ka ụwa ñụrịba;
Ñụrịanụ ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;
O jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ
were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ n’ihu Onyenweanyị
n’ihu Onyenweanyị nke ụwa niile.
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
3. Ihe na-achakwasị ndị na-akwụba aka ha ọtọ,
añụrị na-adịrị ndị obi ha dị ọcha.
Ñụrịanụ n’Onyenweanyị, ụnụ bụ ndị eziomume,
tookwanụ aha ya dị nsọ.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke,
were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike,
werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:27-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara Ị ñụrụ!” Ma Jesu zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu