Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jl: 1: 13-15; 2:1-2
-
Abụọma na azịza ya
Ps 9: 2-3, 6, 16, 8-9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:15:26
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jl: 1: 13-15; 2:1-2
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Joel
Ndị nchụaja! yinyenụ akwa mkpe, bebenụ akwa. Ndị na-agba odibo n’ekwuaja kwabanụ arịrị. Bịanụ nọrọnụ n’uru abalị niile, ụnụ niile na-arụrụ Chineke m ọrụ. Nke a bụ n’ihina a kwụsịla iweta onyinye mkpụrụ akụkụ na mmanya n’ụlọnsọ ukwu nke Chineke ụnụ. Maanụ iwu ibu ọnụ dị nsọ, nweenụ ọgbakọ dị nsọ, kpọkọtanụ ndị okenye na ndị ala ụnụ niile n’ụlọnsọ ukwu nke Osebụrụwa Chineke ụnụ, ka ụnụ begara ya akwa. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị nke Yahweh dị oke egwu. Ọ na-abịa ọsọọsọ dịka ihe mbibi nke si n’aka onye ji ike niile. Fụọnụ opiike na Zayọn. Fụọnụ ya n’elu ugwu ukwu m dị nsọ ka onye ọbụla nọ n’ime obodo tụọ egwu, n’ihina ụbọchị nke Yahweh na-abịa, ee, ọ nọrọlarị nso. Ọ bụ ụbọchị nke ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụkwa ụbọchị nke urukpu na ụbọchị ọchịchịrị. Dịka nnukwu mba siri ike, nke a na-enwebeghị ụdị ya n’oge ndị gara aga, nke a ga-enwe ya na ndụdụgandụ niile dị n’ihu, ọ na-gbasa n’elu ugwu dịka chi ofufo.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 9: 2-3, 6, 16, 8-9
Azịza: Onyenweanyị ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe
1. Eji m obi m niile ekele gị Onyenweanyị
ana m echeta ọrụ ọma gị niile n’otu n’otu
Ana m enwe añụrị na gị
ana m ekwegara aha gị ukwe otito
Onye kasị elu.
Azịza: Onyenweanyị ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe
2. I nyochaala mba niile, ị laala ndị ajọomume n’iyi
I kpochapụla aha ha n’ụwa ebeebe
Mba ndị a adakpuola n’olulu ha ji aka ha gwuo
Ọnya ha kwere amadola ha.
Azịza: Onyenweanyị ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe
3. Lee, Onyenweanyị na-achị ebeebe,
O doziela ocheeze ya maka ikpe
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe
Jiri eziokwu kpebie ikpe n’etiti mba niile.
Azịza: Onyenweanyị ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Taa, Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:15:26
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a, Jesu na-achụpụ otu ajọ mmụọ nke dara ogbi; mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hapụrụ, nwoke ogbi ahụ kwuru okwu, nke a tụrụ ndị mmadụ n’anya. Ma ụfọdụ n’ime ha kwur sị, “Ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, onyeisi ndị mmụọ ọjọọ,” ma ndịọzọ, iji nwalee ya chọọrọ n’aka ya ihe ama nke si n’igwe. Ebe ọ bụ na Ọ ma ihe ha na-eche Ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla nke kewaranụ megide onwe ya ga-adakpọ, ụlọ ọbụla nke dagidere ibe ya na-adakpọ. Ọ bụrụ na Ekwensu ekewakwa megide onwe ya, kedụ ka alaeze ya ga-esi kwụdo? Ụnụ na-asị na-ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul. Ọ bụrụ na m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, site n’ike onye ka ụmụ ụnụ na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe ụnụ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ site na mkpisi aka nke Chineke ka m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, matanụ na alaeze Chineke abịakwasịla ụnụ. Mgbe dike ji ngwaagha na-eche obi ya, ọ dịghị mfe izute ihe o ji biri. Ma mgbe onye ka ya ike bịara megide ya, wee merie ya, ọ na-anara ya ihe agha ya niile, bụ ihe ntụkwasịobi ya, kesaara ndị otu ya ihe ọ kwatara n’ụlọ dike ahụ. Onye na-anọnyereghị m, na-emegide m; onye ọbụla na-adịghị eso ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa. Mgbe mmụọ ọjọọ siri n’ime onye o ji pụọ, ọ na-akpagharị n’ala kpọrọ nkụ na-achọ ebe izuike. Mgbe ọ chọchara ma ọ chọtaghị, ọ na-ekpebi n’obi ya sị, ‘Aga m alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụta.’ Mgbe o chighatara, ọ hụ na a zachaala ụlọ ahụ dozie ya nke ọma. Ọ na-apụ, kpọta ndị mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị ka ya nwee obi ọjọọ, tinyere ya onwe ya, ha na-abata biri n’ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ adị njọ karịa nke mbụ
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu