Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Mal: 3:13-20
-
Abụọma na azịza ya
Ps 1: 1-2, 3, 4, 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:5-13
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Mal: 3:13-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Malachi
Ụnụ ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m, ọ bụ Yahweh na-ekwu. Ma ụnụ na-asị, “Kedụ ka anyị si kwuo okwu megide gị?” Ụnụ ekwuola sị, ọ bụ iheefu ife Chineke. Kedụ uru ọ baara anyị idebe iwu ya, mọbụ na-aga ka ndị na-eru ụjụ n’ihu Yahweh nke igwe ndịagha? Bidozie ugbu a, anyị na-ahụ ndị ngala dịka ndị a gọziri agọzi; anyị na-echekwa na ndị arụrụala na-aga n’ihu, ma mgbe ha nwalere Chineke ha na-alafere.Mgbe ahụ ndị na-atụ Yahweh egwu gwarịtara onwe ha okwu. Yahweh nụrụ, ma gee ha ntị; e dekwara akwụkwọ ncheta n’ihu ya maka ndị niile na-atụ Yahweh egwu, ma na-eche echiche banyere aha ya. Ha ga-abụ ndị nke m, Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu, ndị m ga enwe n’ụzọ pụrụ iche n’ụbọchị m ga-akpa ike. Ọzọkwa, aga m agbaghara ha dịka nna si agbaghara nwa na-asọpụrụ ya. Mgbe ahụ ị ga-ama ihe dị iche n’etiti onye eziomume na onye ajọomume, n’etiti onye na-efe Chukwu na onye anaghị efe ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 1: 1-2, 3, 4, 6
Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ
1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ
nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume,
mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,
mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;
kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị;
ma na-echegharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị.
Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ
2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya
nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,
ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ
3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ
Mba! n’ihina ha dịka afụrụ ọka
nke ikuku na-ebugharị
N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,
mana ụzọ ndị ajọ mmadụ ugwu nke m dị nsọ.
Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Okwu gị Onyenweanyị na-enye obi añụrị.
Nkụzi gị bụ ihe e ji ahụ ụzọ
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 11:5-13
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye n’ime ụnụ nwere enyi ga-agakwuru ya n’etiti abalị sị ya, ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihina otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m. Enweghịkwa m ihe oriri ọbụla m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi n’ime ụlọ zaghachi sị, ‘Esogbula m, anyị emechiela ụzọ ugbu a, mụ na ụmụaka m alabaala ụra, agaghị m enwe ike ikuli nye gị ihe ọbụla?’ Agwa m ụnụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekuli nye ya ihe ọbụla n’ihina ọ bụ enyi ya, ma n’ihi nsogbu ya ọ ga-ekuli nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. Ya mere agwa m ụnụ, rịọnụ, a ga-enye ụnụ, chọọnụ, ụnụ ga-achọta, kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ. N’ihina onye ọbụla na-arịọnụ na-arịọta, onye ọbụla na-achọnụ na-achọta, onye ọbụla na-akụ aka ka a ga-emeghere. Kedụ nna n’etiti ụnụ nwa ya ga-arịọ azụ, o nye ya agwọ; mọbụ ọ rịọ ya akwa, o nye ya akpị? Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ ụnụ onyinye dị mma, nna ụnụ nke bi n’igwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya!”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu