Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jon: 4:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps 86: 3-4, 5-6, 9-10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 11:1-4
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jon: 4:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jona
Ihe Chineke mere amasịghị Jona, o were wee iwe. Ọ rịọrọ Chineke arịrịọ sị, “Biko Yahweh ọ bụ na ọ bụghị ihe a ka m kwuru ga-emenụ mgbe m ka nọ n’obodo m? N’ihi ya ka m jiri chọọ ịgbalaga n’obodo Tashish n’ihina amaara m na ị bụ onye obi ịhụnaanya na Chineke onye obi ebere, ị naghị ewe iwe ọsọọsọ, I jupụtakwara n’ịhụnaanya dị ọkpụ. Ị bụ onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. Ya mere ugbu a Chineke, biko napụ m ndụ m n’ihina ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” Chineke zara Jona sị, “Iwe ị na-ewe o ziri ezi?” Jona hapụrụ obodo Ninive gaa nọdụ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. N’ebe a ọrụụrụ onwe ya ụlọ ndo iji zere anwụ, wee nọdụkwa na ya na-eche ịhụ ihe ga-eme obodo Ninive. Chineke mere ka osisi tolite n’ebe ahụ wee kpuchie Jona ka ahụ juo ya oyi. Mgbe Jona hụrụ nke a, o nwere añụrị nke ukwuu. Ma mgbe chị bọrọ n’ụbọchị nke so ya, Chineke mere ka ahụhụ tagbuo osisi ahụ nke mere ka ọ kpọnwụọ. Mgbe anwụ wara, Chineke zitere oke ikuku ọwụwa anyanwụ nke na-agbakasị ahụ. Anwụ chara Jona nnukwu n’isi nke na ike gwụrụ ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya sị: “Ọ kaara m mma na m nwụrụ anwụ karịa na m dị ndụ.” Ma Chineke jụrụ Jona sị, “O kwesịrị ekwesị na ị ga-ewere osisi a iwe?” Jona azaa ya sị, “Ee, o kwesịrị na m ga-ewe iwe, ọ bụladị iwe iwe ruo n’ọnwụ.” Chineke zara ya sị: “Ị na-ewe iwe maka osisi nke ị kụghị, nke i mekwaghị ka o too, nke topụtara n’otu abalị nwụọkwa n’otu abalị. Ọ bụ na m agaghị emere Ninive ebere, obodo ukwu ahụ nke mmadụ karịrị puku otu narị na puku iri abụọ bi n’ime ya, ndị na-enweghị ike ikwu nke bụ aka nrị ha na aka ekpe ha, na-agụnyeghị ọtụtụ anụmaanụ dị n’ime ya?”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 86: 3-4, 5-6, 9-10
Azịza: Onyenweanyị, ijupụtara n’ịhụnaanya na ịkwụdosiike
1. Ị bụ Chineke m meere m ebere Onyenweanyị
ọ bụ gị ka m na-akpọkukwa ụbọchị niile
Mee ka mkpụrụobi nwodibo gị jupụta n’ọñụ, Onyenweanyị
n’ihina ọ bụ gị ka m na-akpọku n’ekpere m.
Azịza: Onyenweanyị, ijupụtara n’ịhụnaanya na ịkwụdosiike
2. Onyenweanyị Ị dị ebere dị mgbaghara,
i nwere nnukwu ịhụnaanya
n’ebe ndị niile na-akpọku gị nọ.
Onyenwanyị nụrụ ekpere m,
Gee m ntị nụrụ arịrịọ m.
Azịza: Onyenweanyị, ijupụtara n’ịhụnaanya na ịkwụdosiike
3. Mba niile ga-abịa kpọọrọ gị isi ala Onyenweanyị
N’ihina ị dị ukwuu na-emekwa ihe ịtụnaanya,
ọ bụ sọ gị bụ Chineke.
Azịza: Onyenweanyị, ijupụtara n’ịhụnaanya na ịkwụdosiike
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenweanyị,
na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia
OZIỌMA –Lk: 11:1-4
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere. Mgbe ọ kwụsịrị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Onyenweanyị kuziere anyị ka e si ekpe ekpere dịka Jọn si kuziere ndị na-eso ụzọ ya.” Ọ sịri ha, “Mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, sịnụ: “Nna, ka otito dịrị aha gị, ka ọchịchị gị bịa, nye anyị taa, nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyị niile dịka anyị siri gbaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu