Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jon: 1:1-2:1, 11
-
Abụọma na azịza ya
Jona 2: 2, 3, 4, 5, 8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 10:25-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jon: 1:1-2:1, 11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jona
Ugbu a okwu nke Chineke bịakwutere Jona nwa Amịtaị sị: “Bilie, gaa na Ninive obodo ukwu ahụ, gwa ha na ajọomume ha emetụtala m.” Ma Jona biliri gbafere ọsọ, gbagaba Tashish iji gbalahụ Chineke. Ọ garuru Jopa, hụ ụgbọmmiri na-aga Tashish, kwụọ ụgwọ, banye iji gbalahụ Chineke. Ma Chineke wetara oke ebili mmiri n’osimiri ahụ, nke mere na ụgbọmmiri ahụ chọrọ ịgbawa. Ụjọ jidere ndị na-anya ụgbọ ahụ nke mere na onye ọbụla n’ime ha bidoro na-akpọku chi nke ọ na-efe. Ha tụbara ibu ụgbọmmiri a bu n’ime osimiri iji mee ka ọ dị mfe. Ma Jona gara n’ala ụgbọmmiri a, tọgbọrọ n’ebe ahụ na-arahụ ụra ya. Onyeisi ụgbọmmiri ahụ gakwuru ya sị: “Kedụ ihe bụ na ị na-arahụ ụra? Kulite kpọkuo chi nke gị! O nwere ike nụrụ arịrịọ gị wee zọpụta anyị.” Mgbe ahụ ha gwarịtawara onwe ha sị, “Bịanụ ka anyị fee nza iji chọpụta onye nsogbu a si n’aka ya.” Nke a mere na ha fere nza, o wee ma Jona. Ha gwara ya sị: “Gwa anyị ihe wetaara anyị nsogbu a, kedụ aka ọrụ gị? Ebee ka I siri bịa? Kedụ obodo gị? Kedụ onye ebe ị bụ? Jona zara ha sị: “Abụ m onye Hibru na-efekwa Yahweh Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala ọkpọọ.” Oke egwu jidere ndị na-anya ụgbọmmiri ahụ mgbe Jona kwuru nke a, nke na ha sịrị, “Kedụ ihe I mere ihe a?” Ha maara na ọ na-agbara Yahweh ọsọ n’ihina ọ gwara ha otu ahụ. Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Kedụ ihe anyị ga-eme gị iji hụ na mmiri a daara anyị jụụ?” Ha kwuru nke a n’ihina ebili mmiri ahụ na esiwanye ike. “Jona zara ha sị, “Kpụrụnụ m tụba m n’ime osimiri, ụnụ mee nke a, ebili mmiri a ga-akwụsị. Amaara m na ọ bụ n’ihi m ka oke ebili mmiri a jiri dakwasị ụnụ.” Ndị na-anya ụgbọ nyasiri ike ka ha ruo n’ikpere mmiri, mana nke a enweghị isi n’ihina ebili mmiri ahụ na-esiwanye ike karịa. Nke a mere na ha kpọkuru Chineke sị: “O Chineke ekwela ka anyị laa n’iyi n’ihi ndụ nwoke a, emela ka ọbara ya dị anyị n’isi n’ihina I meela ka I siri chọọ.” Ha kpụụrụ Jona tụba ya n’ime osimiri, ebili mmiri ahụ akwụsị. Ka nke a mere, ndị mmadụ niile nọ n’ụgbọmmiri ahụ tụụrụ Chineke egwu. Ha chụnyeere Yahweh aja, bịakwa kwe ya nkwa n’ihina ha hụrụ ike ya. Chineke mere ka otu nnukwu azụ loo Jona. Jona nọrọ n’afọ azụ a ehihie atọ na abalị atọ. Chineke gwara azụ ahụ ka ọ gbọpụta Jona. Azụ ahụ gbọpụtara Jona n’elu ala.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jona 2: 2, 3, 4, 5, 8
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
1. Ka Jona nọrọ n’ime afọ azụ ahụ
Ọ rịọrọ Chineke ya arịrịọ.
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
2. N’oke ihe ụfụ m, ebegaara m Chineke akwa,
O wee za m.
Sitekwa n’afọ ala mmụọ ebere m akwa,
Ị nụrụ olu m.
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
3. Ị tụbara m n’ime olulu nakwa n’etiti osimiri,
mmiri ekpuchigide m.
Ikuku na ebili mmiri gị niile
Na-agafe m n’isi.
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
4. Mgbe ahụ ka m kwuru sị: A chụpụla m n’ihu gị
kedụ ka m ga-esi ahụkwanụ ụlọnsọ gị ọzọ?
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
5. Mgbe mmụọ m na-ada mba n’ike
echetara m gị Chineke
ekpere m rutere gị ntị n’ụlọnsọ gị.
Azịza: Onyenweanyị, Gị ga-azọpụta ndụ m n’ime olulu.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya,
Ọ ga-edobe okwu m Nna m ga-ahụ ya n’anya.
Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 10:25-37
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Otu onye ọkaiwu biliri ịnwale Jesu wee jụọ ya sị, “Onyenkuzi, gịnị ka m ga-eme wee keta ndụ ebighịebi?” Jesu jụghachiri ya, “Gịnị ka e dere n’iwu? Ọ bụ gịnị ka ị gụtara nay a?” O wee zaa sị, “Ị ga-eji obi gị niile, na mmụọ gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile hụ Dinwenụ Chineke gị n’anya, hụkwa onye agbataobi gị n’anya ka ị siri hụ onwe gị n’anya.” Jesu sịrị, “Ị zara nke ọma. Mee nke a, ị ga-adị ndụ.” Ka ọ na-achọsi ike ịgụnye onwe ya dịka onye eziomume, ọ jụrụ Jesu sị, “Onye bụkwanụ onye agbataobi m?” Jesu zaghachiri ya sị, “Otu nwoke si na Jerusalem na-aga Jeriko. Ọ dabara n’aka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tikwaa ya ihe, wee hapụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma, gbalaga. E mechaa, otu onye ụkọchukwu si n’otu ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ nwoke ahụ, o siri n’akụkụ nke ọzọ gafee. Otu aka ahụ, mgbe otu onye agbụrụ Levaị bịaruru ebe ahụ, ọ hụkwara nwoke ahụ, si n’akụkụ nke ọzọ gafere. Ma otu onye Sameria, ka ọ na-aga njem, bịaruru n’ebe nwoke ahụ tọgbọrọ. Mgbe ọ hụrụ ya, o meere ya ebere. O wee jekwuru ya, kechie ọnya ya, bịa wụkwasakwa ya mmanụ na mmanya. O kukwasara ya n’ịnyịnyaibu ya, kpọba ya n’ụlọ ndị ọbịa, wee leta ya anya nke ọma.” N’echi ya, onye Sameria ọma ahụ nyere onye na-elekọta ụlọ ndị ọbịa ahụ ego ọlaọcha abụọ sị, “Biko lezie nwoke a anya nke ọma. Ihe ọ bụla I mefuru n’elu nke a m nyere gị, mgbe m lọghachiri aga m akwụghachi gị.” Jesu wee jụọ onye ọkaiwu ahụ sị, “onye n’ime mmadụ atọ ndị a ka I chere gosiri onwe ya onye agbataobi nwoke ahụ nke dabara n’aka ndị ohi?” Ọ zara sị “Onye ahụ nke meere ya ebere.” Jesu agwa ya sị, :Gaa ka I mee otu ahụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu