Ụka nke Iri Abụọ na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hb: 1:2-3.2:2-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 94:1-2.6-9. Az. 9
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2 Tim: 1:6-8. 13-14
- OziọmaLk: 17:5-10
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Hb: 1:2-3.2:2-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Habakuk
Onyenweanyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu, ma Ị naghị aña ntị? Ka m na-eti “mmegbu” na ntị Gị, ma Ị naghị azọpụta? N’ihi gịnị ka I jiri kwụba ihe ọjọọ n’ihu m? Gịnị kpatara I ji ele sọ anya, ebe e nwere ọchịchị nchịgbu? Oke iwe, na ihe ike, mbibi, bụ sọ ihe m na-ahụ. Iwe na ọnụma, na obi abụ otu, na-abawanye. Onyenweanyị were zaa sị: “Detuo ọhụ nke a n’Akwụkwọ! Kanye ya na mbadamba nkume, ebe a ga-agụta ya nke ọma! Ebe ọ bụ na ọhụ nke a nwere oge nke aka ya; mmezu ya ga-abịarịrị. Aghụghọ ọ bụla adịghị na ya. Ọ bụrụ na mmezu ya ji nwayọọ abịa, were ndidi chere ya, maka na ọ ga-abịarịrị. Lee ka onye obi ya na-akwụghị ọtọ si atụ uche, ma onye ezi omume jiri okwukwe biri.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 94:1-2.6-9. Az. 9
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchikwala obi ụnụ.
1. Bịanụ ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe añụrị.
Ka anyị too nkume nke nzọpụta anyị.
Ka anyị were inye ekele kpọọrọ Ya isi ala.
Bịakwa were obi añụrị bụọrọ Ya abụ ọma.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchikwala obi ụnụ.
2. Bịanụ ka anyị sekpuoro Ya, bịakwa kpọọrọ Ya isi ala.
Ka anyị sekpuru ala n’ihu Onyenweanyị, Onye kere anyị.
N’ihi na Ọ bụ Chineke anyị. Anyị bụkwa ndị Ọ na-azụ ka atụrụ,
bụrụ igwe atụrụ Ọ na-eduzi ụzọ.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchikwala obi ụnụ.
3. Taa ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya!
Ụnụ akpọchikwala obi ụnụ dịka na Meriba;
dịka n’ụbọchị ahụ na Masa n’ime ọzara,
ebe nna ụnụ ha nọrọ leghaa M.
Ha leghara M, ma ọ bụ ezi okwu na ha ahụa aka ọrụ M.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchikwala obi ụnụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –2 Tim: 1:6-8. 13-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ Pọl degaara Timoti
Ana m echetara gị, ka i mee ka onyinye amara ahụ nwuru ọkụ; onyinye amara ahụ Chineke nyere gị mgbe m bịakwasịrị gị aka n’isi. Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere anyị, abụghị mmụọ nke ụjọ. Kama ọ bụ mmụọ nke ike, na ịhụnanya na ichedo onwe anyị. N’ihi ya, ihere emekwala gị ịgbara Onyenweanyị akaebe. Ihere emekwala gị, n’ihi mụ onwe m bụ onye mkpọrọ n’ihi Ya. Kama dabere n’ike Chineke, soro m kere oke n’ịta ahụhụ maka Oziọma. Jide okwu ahụ na-enye ezi ndụ, nke ị nụrụ n’ọnụ m, ka ọ bụụrụ gị ihe ilere anya, na ihe ị ga-eso. Nọgide na ụdị okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Jesu Kristi. Were ike Mmụọ Nsọ, nke dị n’ime anyị, debe akụ na ụba niile nke okwukwe enyere gị n’aka idebe nke ọma.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Okwu nke Onyenweanyị ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi;
Okwu a bụ Oziọma ahụ e zisaara ụnụ.
Aleluya!
OZIỌMA –Lk: 17:5-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ndị Ụmụazụ gwara Onyenweanyị: “Mụbaa okwukwe anyị.” Onyenweanyị zara ha sị: “Ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe nke ha ibu ka otu mkpụrụ osisi mọstad, ụnụ nwere ike inye osisi sikamọ iwu, sị: Site na mgbọrọgwụ foro, fopụta onwe gị gaa kụnye onwe gị n’oke osimiri”! Ọ ga-eme ya”. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụnụ nwere odibo nọ n’ubi na-akọ ugbo, ma ọ bụ nke na-azụ atụrụ, ọ na-agwa odibo ahụ: ‘Ngwa! bịa buru nri gị rie,’ mgbe o si ubi lọta? Mba! Kama ụnụ na-asị ya, ‘Mee ngwa doziere m nri anyasị! Gbokwasị akwa ije ozi n’ụkwụ gị, guzo ijere m ozi na nri, ruo mgbe m rijuru. E mesịa, ị gaa rie nke gị. Ọ dịghị enye odibo ahụ ekele ọ bụla, ọ bụ ezie na o mere ihe a gwara ya ka o mee. Otu a ka ọ dị n’ebe ụnụ nọ: Mgbe ụnụ mechara ihe niile a gwara ụnụ mee, kwuonụ: “Anyị bụ sọ ụmụ odibo! Ọ bụ sọ ihe anyị kwesịrị ime, ka anyị mere!””
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu