Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Bar: 4: 5-12, 27-29
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 69:33-35, 36-37
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 10:17-24
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Bar: 4: 5-12, 27-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Baruch
Obi sie ụnụ ike, ndị nke m. Ụnụ ndị na-echetara ọha na eze aha Izrel. Ọ bụghị ka a laa ụnụ n’iyi ka e jiri were ụnụ resị ndị mba ọzọ. E duuru ụnụ dunye n’aka ndịiro ụnụ maka na ụnụ kpasuru Chineke iwe, maka na ụnụ mere ka iwe wee onye kere ụnụ, site n’ịhapụ ịchụnyere Chineke aja, bịa na-achụnyere ekwensu. Ị chezọrọ Chineke dị ebeebe, onye zụlitere gị; ị mekwara ka Jerusalem nwee obi uru, Jerusalem dịka nne nyere gị ara. N’ihina Jerusalem hụrụ ọnụma na nsogbu dakwasara ụnụ nke sitere n’aka Chineke, o kwuru sị, “Geenụ ntị ụnụ ndị agbataobi Zayọn, Chineke eziterela m nnukwu uru na nsogbu. N’ihina ejirila m anya m hụ ụmụ m ndị nwoke na ndị nwaanyị ka a dọọrọ ha n’agha laa n’ala mba ọzọ. Nke a sitere n’aka onye ahụ bụ Ebighịebi. Obi añụrị ka m jiri zụpụta ha mana anya mmiri na obi mwute ka m jiri nọrọ na-ele mgbe e jiri nara m ha. Onye ọbụla egorikwala n’ihina m nọ na nsogbu; añụrịkwala ọñụ n’ihina m bụzi ajadụ a naara ọtụtụ ụmụ. Maka njọ nke ụmụ m mere ka m ji bụrụ onye gba aka nwa, onye a jụrụ ajụ, sọ ya nọ. Ihe kpatara ọnọdụ a bụ maka na ha gbakụtara iwu Chineke azụ. Nweenụ obi siri ike, ụmụ m, kpọkuonụ Chineke. Onye ahụ mere ka ihe ọjọọ a dakwasị ụnụ ga-echetakwa ụnụ. Otu ahụ ụnụ siri gbakụta Chineke azụ, chegharịzianụ ugbu a, werenụ obi ịnụ ọkụ mmaji iri chọba ya. N’ihina onye ahụ mere ka nsogbu niile a dakwasị ụnụ ga-azọpụtakwa ụnụ, ma nye ụnụ añụrị ebeebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:33-35, 36-37
Azịza: Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile
1. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a, ha ga-añụrị,
ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke!
Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile
Ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji eji
Ka eluigwe na ụwa too ya
Osimiri na ihe niile dị na ya!
Azịza: Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile
2. Maka na Chineke ga-azọpụta Zayọn,
Wugharịa obodo Juda ọzọ:
ụmụodibo ya ga-ebi na ha, nwerekwa ha.
Ụmụụmụ odibo ya ga-eketakwa ha
ndị niile hụrụ aha ya n’anya ga-ebikwa na ya.
Azịza: Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị nna Dinwenụ nke eligwe na ụwa,
n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluia
OZIỌMA –Lk: 10:17-24
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ndịozi iri asaa ahụ jiri ọñụ lọta sị, “Onyenweanyị ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị nyere ha iwu n’aha gị!” O wee sị ha, “Ahụrụ m Ekwensu ka o siri n’eluigwe daa dịka amụma. Lee, enyela m ụnụ ike ịzọkwasa agwọ na akpị ụkwụ na imegide ike onye iro ahụ, o nweghịkwa ihe ga-emerụ ụnụ ahụ. N’agbanyeghị nke a, ụnụ añụrịla na ndị mmụọ ọjọọ na-ehubere ụnụ isi, kama nweenụ ọñụ na e deela aha ụnụ n’eluigwe. N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, “Ekelee m gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị. Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị nsọ. Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, mọbụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọbụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya.” Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzi dịịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ! Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndịeze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ha.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu