Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Bar: 1: 15-22
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 79: 1-2, 3-5, 8, 9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 10:13-16
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Bar: 1: 15-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Baruch
Ụnụ ga-ekwu sị, “Eziomume bụ nke Yahweh Chineke anyị, ihere bụ nke anyị dịka ọ dị n’ụbọchị taa. Anyị niile, ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ndịeze anyị na ụmụeze anyị ndị nwoke, ndị nchụaja, ndịamụma anyị na ndị nna anyị ha, n’ihina anyị emehiela megide Yahweh. Anyị nupụụrụ ya isi, egeghị ntị n’okwu nke Yahweh Chineke anyị, ịga n’atụmaatụ ndị o nyere anyị. Bido n’ụbọchị Yahweh si n’ala Ijipt dupụta nna anyị ha ruo taa, anyị na-eleli ya, anyị añaghị ntị n’okwu ya. Ya mere na, ihe ọjọọ dị icheiche adakwasịla anyị na ịbụ ọnụ nke Yahweh kwupụtara site n’aka Mosis nwodibo ya, oge o si n’ala ljipt dupụta nna anyị ha, ka e nye anyị ala ebe mmiri ara ehi na mmanụ añụ jupụtara. Anyị egeghị ntị n’ihe nke Yahweh Chineke anyị gwara anyị site n’okwu nke ndịamụma o ziteere anyị, kama, onye ọbụla n’ime anyị sooro ihe obi ọjọọ ya na-agwa ya na-efe chi ndịọzọ, na-emekwa ihe dị njọ n’ihu nke Yahweh Chineke anyị.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 79: 1-2, 3-5, 8, 9
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta anyị maka otito nke aha gị
1. Chineke ndị amaghị gị abala ndị nke gị ọgụ;
ha emerụọla ụlọ gị dị nsọ;
ha etikpọọla Jerusalem.
Ha ewerela ozu ụmụodibo gị nye
ụmụ nnụnụ ka ọ bụrụ nri ha,
ahụ ndị nke gị dị nsọ ka e nyere ụmụanụọhịa.
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta anyị maka otito nke aha gị
2. Ha kwafuru ọbara ha dịka mmiri
na Jerusalem niile.
E nwezighị ọbụladị otu onye ga-eli ozu ha.
Anyị abụrụla ihe ndị agbataobi anyị ji akpa ọchị
Mba niile gbara anyị gburugburu na-akparịzi anyị
Kedụ mgbe iwe gị ga-akwụsị O Onyenweanyị?
Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adị ebeebe?
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta anyị maka otito nke aha gị
3. Atala anyị ahụhụ maka njọ nnanna anyị ha mere;
Kama ka obiọma gị bịakwute anyị ọsọọsọ
N’ihina ha ewetuola anyị ala nke ukwuu.
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta anyị maka otito nke aha gị
4. Nyere anyị aka, O Chineke onye nzọpụta anyị,
maka otito nke aha gị;
zọpụta anyị, ma gbagharakwa anyị njọ anyị
n’ihi aha gị!
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta anyị maka otito nke aha gị
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị iwu gị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile,
nke a mere ka ọ dị ebeebe ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA –Lk: 10:13-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kwuru sị, “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin! Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaịda! N’ihina a sị na ọrụ niile dị ike nke a rụrụ n’ime ụnụ, na a rụrụ ha na Taịa na Sidọn, ha garala echegharị ogologo mgbe, nọdụ n’akwa mkpe na ntụ. Mana a ga-egosi Taịa na Sidọn ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ. Ma ngị Kapanaum, ị na-atụ anya na a ga-ebuli gị n’eluigwe? A ga-eweda gị n’olulu ọkụ alammụọ.” Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọbụla na-anụ okwu ụnụ na-anụ okwu m; onye ọbụla jụrụ ụnụ ajụla m, onye ọbụla nke jụrụ m jụkwara onye ahụ nke zitere m.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu