Ncheta Ndị Mmụọọma Ndị Nche.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex: 23:20-23
-
Abụọma na azịza ya
Ps 91: 1-2, 3-4, 5-6, 10-11.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt: 18: 1-5, 10.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ex: 23:20-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
“Lee ana m ezite Mmụọọma nke ga-edu ụnụ ruo n’ala ahụ m kwadooro ụnụ. Geenụ ya ntị n’olu, ụnụ enupụkwarala ya isi n’ihina ọ gaghịkwa agbaghara mmehie ụnụ ọbụla, aha m nọkwa ya n’ime. Ma ọbụrụ na ụnụ egee ya ntị n’olu, ma meekwa ihe niile m kwuru, aga m abụ onye iro nke ndịiro ụnụ ma megidekwa ndị niile na-emegide ụnụ. Mgbe Mmụọọma m ahụ ga-edurute ụnụ n’etiti ndị Amọ, na ndị Hit, ndị Periz, ndị Kenaan, ndị Hiv na ndị Jebus, aga m ekpochapụ obodo ha niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 91: 1-2, 3-4, 5-6, 10-11.
Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
1. Onye bi na ndo nke onye kasị elu,
onye nọgidesiri ike na nchedo nke onye ji ike niile,
ga-asị Onyenweanyị, “Ị bụ onye nchedo m na ike m,
Chineke m, onye m tụkwasara obi!”
Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
2. Ọ ga-azọpụta gị na ọnya niile nke ndịiro,
na ajọ ọrịa niile.
Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị,
Ọ bụ na okpuru nku ya ka ị ga-enweta nchodo.
Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
3. Ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla nke abali
mọbụ akụ ndị na-efe n’ehihie,
mọbụ ajọ ọrịa ndị na-ezo n’ọchịchịrị,
mọbụ ihe mberede na-egbu n’ehihie.
Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
4. Ma onweghị ajọ ihe ọbụla ga-adakwasị gị,
o nweghịkwa ihe ọjọọ ọbụla ga-abịaru ụlọ gị nso.
N’ihina ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị,
ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
Azịza: Ọ ga-enye ndị mmụọọma ya iwu ka ha nọnyere gị, ka ha na-echekwa gị ebe niile Ị na-aga.
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Gọzienụ Onyenweanyị,
ndị agha ya niile, ụnụ ndị odibo ya, ndị na-eme uche ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Mt: 18: 1-5, 10.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Olee onye kachasị ibe ya ukwuu n’alaeze eluigwe?” O wee kpọrọ otu nwatakịrị kwụba ya ọtọ n’etiti ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ bụrụ na ụnụ agbanweghị dịka ụmụntakịrị, ụnụ agaghị aba n’alaeze eluigwe. Onye ọbụla nke wedara onwe ya ala dịka nwantakịrị a, ọ bụ ya kachasị ukwu n’alaeze eluigwe. “Onye ọbụla nke ga-anabata nwatakịrị dị otu a nke ọma n’aha m, anabatala m.” Lezienụ anya ka ụnụ ghara ilelị otu n’ime ụmụaka ndị a. N’ihina ana m agwa ụnụ na ndị mmụọọma ha nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe oge niile.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu