Nnukwu Emume Nne anyị dị asọ Ezenwaanyị na Nne-Egwu nke Naịjiria.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 11:1-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 72: 1. 7-8. 12-13. 17.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Ephe: 2:13-22
- OziọmaMt: 2:13-15, 19-23.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 11:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Ome ga-esi n’ukwu osisi nke Jesse pụta, alaka ga-etopụta na mgbọrọgwụ ya. Mmụọ nke Osebụrụwa ga-adakwasa ya, mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ike, mmụọ nke ọmụma na iwu nke Chukwu. Ịtụ egwu nke Chukwu ga-abụ ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ gaghị eji naanị ihe anya na-ahụ kpe ikpe, nke a ga-eji naanị ihe ọ nụrụ na ntị wee kpebie okwu. Kama eziomume ka ọ ga-eji kpere ndị ogbenye ikpe; ọ ga-enye ndị dị umeala n’ụwa ikpe nkwụmọtọ; Okwu ya ga-abụ mkpara igwe ga-akụtu ụwa, ikpe ya ga-ewetara ndị ajọ mmadụ ọnwụ. Eziomume ga-abụ akwa ọ ma n’ukwu ya, ịkwụdosike ga-abụ ajị o kere n’ukwu ya. Nkịta ọhịa na ụmụ atụrụ ga-ebi otu ebe, agụ na ụmụ ewu ga-edina. Nwa ehi na ọdụm na nwa ọdụm ga-anọkwa otu ebe; Obere nwa ga na-edu ha, Ehi na edi ga na-edina otu ebe; ọdụm ga na-ata ahịhịa ka ehi. Nwa na-añụ ara ga-egwu egwu n’ọnụ agwọ, nwa na-eto eto ga-amanye aka n’ọnụ agwọ ajụala. Ha agaghị emebi ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ n’elu ugwu m dị nsọ, n’ihi na ụwa ga-ejupụta n’amamihe nke Yahweh, dịka otu mmiri si jupụta n’osimiri. N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ nke Jesse, ga-akwụrụ dịka ihe akara n’ihu mmadụ niile. Mba niile ga-achọba ya, ebe obibi ya ga-adị ebube.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 72: 1. 7-8. 12-13. 17.
Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze eziomume nke gị,
Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.
2. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,
udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,
Alaeze ya ga-esi n’osimiri ruo n’osimiri,
bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa.
Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.
3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,
na ndị niile chọrọ enyemaka ya.
Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,
na-azọpụta ndụ ha.
Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.
4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,
ka ọ dịgide dịka anyanwụ,
ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya,
ka mba niile kpọọ ya onye dị ngọzi.
Azịza: N’oge ya eziokwu ga-achawapụta, udo ga adịkwa ruo na njedebe ụwa.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Ephe: 2:13-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl dị asọ Degaara Ndị Efesọs
Ugbu a n’ime Jesu Kristi, ụnụ bụ ndị nọbu n’ebe dị anya ka e wedeberela nso n’ime ọbara Kristi. Ya bụ udo anyị, onye merela anyị ka anyị bụrụ otu ma kwatuokwa mgbidi nkewa nke na-eweta iro. O sitere n’ahụ Ya weta n’isi njedebe, iwu na atụmaatụ nke ndị Juu, ka O wee ji mmadụ abụọ ahụ mepụta otu mmadụ ọhụrụ n’ime onwe Ya, si n’ụzọ dị otu a ka udo dị. N’ụzọ dị otu a ka Ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site n’obe Ya, wetakwa n’isi njedebe, iro dị n’etiti ha abụọ. Ọ bịakwara kwusaara ụnụ ndị nọ n’ebe dị anya na ụnụ ndị nọ nso, oziọma nke udo. Ọ bụ site na ya ka anyị ji nwee ike n’ime otu mmụọ ahụ ịbịakwute Nna. Ya bụ ụnụ esorola ndị nsọ bụrụ ndị a mụrụ n’ala, n’ezinụụlọ Chineke, nke a rụkwasara n’elu ntọala nke ụmụazụ na ndịamụma, nke Jesu Kristi n’onwe ya bụ okwute ntọala ya. Ọ bụ n’ime ya ka ihe ndị a niile jikọtara ọnụ, too, wee bụrụ ụlọnsọ n’ime Dinwenụ. N’ime Ya ka a rụnyekwara ụnụ dịka ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
“Ekele! I jupụtara na graasịa,
Osebụrụwa nọnyeere gị.
Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwaanyị niile.
ALLELUIA
OZIỌMA –Mt: 2:13-15, 19-23.
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ndị amamihe ahụ labara mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere Josef na nrọ sị ya, “Bilie, kpọrọ nwata ahụ na nne ya gbaga Ijipt. Nọrọ ebe ahụ, ruo mgbe m ga-agwa gị, n’ihina Herọd bụ n’uche ịchọ nwatakịrị ahụ ka o gbuo ya.” Josef biliri kpọrọ nwata ahụ na nne ya n’ime abalị gbaga Ijipt. Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a bụ ji mejupụta ihe Dinwenụ kwuru site n’ọnụ onye amụma sị, “Esiri m n’ljipt kpọpụta nwa m.” Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere Josef na nrọ n’ljipt sị ya, “Bilie kpọrọ nwata ahụ na nne ya laghachi n’ala Izrel, n’ihina ndị chọrọ igbu ya anwụọla.” O biliri, kpọrọ nwata ahụ na nne ya, laghachi n’ala Izrel. Ma mgbe Josef nụrụ na Akeleus anọchiele anya nna ya Herọd dịka eze Judia, egwu tụrụ ya ịga ebe ahụ. Ebe ọ bụ na a dọọla ya aka na ntị na nrọ, ọ gara biri na Galili, n’obodo a na-akpọ Nazaret. Nke a bụ iji mejupụta ihe ndị amụma kwuru sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu