Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Zec: 2:5-9, 14-15
-
Abụọma na azịza ya
Jer 31: 10, 11-12, 13
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 9:43-45
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Zec: 2:5-9, 14-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Onye Amụma Zecharịa
Ka m weliri anya m elu, ahụrụ m nwoke ji eriri e ji atụ ihe n’aka ya. Ajụrụ m ya sị, “Kedụ ebe ị na-aga?” Ọ zara m sị: “Ana m aga ịtụ Jerusalem mara ka ogologo ya na uhie ya ha. Mgbe ahụ ka mmụọọma nke na-agwa m okwu pụbara, mmụọọma ọzọ zutere ya. Ọ sịri ya, “Gbaa ọsọ ka ị gwa nwokorobịa ahụ nke a, agaghị ejikwa mgbidi gbaa Jerusalem gburugburu n’ihi ụba mmadụ na ehi nke nọ n’ime ya.’ N’ihina mụ onwe m bụ Yahweh na-ekwu ‘aga m abụ mgbidi nke ọkụ gbaa ya gburugburu, ebube m ga-adịkwa n’ime ya.” Kwee ukwe ọñụ, nwaada Zayọn, n’ihina ugbu a ana m abịa ibinyere ụnụ.” Ọ bụ Yahweh na-ekwu. N’ụbọchị ahụ ọtụtụ mba ga-echegharị, bịakwute Yahweh. Ee, ha ga-abụ ndị nke ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jer 31: 10, 11-12, 13
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
1. Geenụ ntị n’okwu nke Yahweh, ụnụ mba niile
Meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile,
Kwuonị sị na onye nke kposara Izrel,
Ga-ekpokọtakwa ya ọnụ ọzọ
ọ ga-echekwa ya
dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
2. Maka na Yahweh agbapụtala Jekọb,
Mee ka o nwere onwe ya n’aka ndị na-akpagbu ya
Ha ga-abịa bụọ abụ na-adasi ụda ike n’elu Zayọn
Ha ga na-egbuke site n’afọọma na ịmamma Chineke.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
3. Mgbe ahụ ụmụagbọghọ ga-agba egwu ọñụ,
ụmụokorobịa na ndị okenye ga-ejupụtakwa n’añụrị
Aga m agbanwe iru uju ha ma ma mee ka ha nwee añụrị,
Aga m atasị ha obi were obi añụrị gbanwee ahụhụ ha.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi meghee anya nke obi ụnụ
ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 9:43-45
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ma ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eche gbasara ọrụ ịtụnanya Ọ rụrụ, Jesu gwara ha sị, “Ka okwu ndị a baa ụnụ n’ime ntị: N’ihina a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.” Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a, e zonarịrị ha ya, ka ha ghara ịghọta ya, egwu jikwa ha ịjụ ya maka okwu a.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu