Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Col: 1:1-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 52:10, 11
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLuk: 4:38-44
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Col: 1:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi
Pọl, onyeozi nke Jesu Kristi dịka uche nke Chineke siri chọ, ya na nwanne anyị bụ Timoti, na-edegara ndị nsọ na ụmụnne anyị ndị kwụsiri ike na Kristi, ndị nọ na Kolosi akwụkwọozi. Amara na udo nke si n’aka Chineke Nna anyị dịrị ụnụ. Anyị na-ekele Chineke, Nna nke Onyenweanyị Jesu Kristi mgbe ọbụla anyị na-echeta ụnụ n’ekpere. Anyị anụla maka okwukwe ụnụ nwere n’ime Jesu Kristi, ya na maka ịhụnaanya ụnụ nwere n’ebe ndị nsọ niile nọ, maka nchekwube nke a kwadobeere ụnụ n’eluigwe. Nke a ka ụnụ nụrụla n’okwu nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke bịaruterela ụnụ. N’ezie, dịka o si dị n’ụwa niile ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa dịka o si eme n’etiti ụnụ, site n’ụbọchị ụnụ nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke n’eziokwu; dịka ụnụ siri mụta ya n’aka Epafras, onye anyị hụrụ n’anya anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasịobi n’ijere Kristi ozi, n’aha anyị. O meela ka anyị mara ụdị ịhụnaanya ụnụ nwere n’ime mmụọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 52:10, 11
Azịza: A tụkwasara m obi m n’ịhụnaanya nke Chineke ebeebe ebeebe.
1. Ma n’akụkụ nke m adị m ka osisi oliv
na-eto n’ụlọ Chineke,
A tụkwasara m obi m n’ịhụnaanya nke Chineke
ebeebe ebeebe.
Azịza: A tụkwasara m obi m n’ịhụnaanya nke Chineke ebeebe ebeebe.
2. Aga m na-ekele gị mgbe niile;
n’ihu ndị ahụ hụrụ gị n’anya, maka ihe i meere m,
aga m etinyekwa olileanya m
n’aha gị jupụtara n’obi ebere.
Azịza: A tụkwasara m obi m n’ịhụnaanya nke Chineke ebeebe ebeebe.
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Zọpụta m, Onyenweanyị ka m wee nwee ike idobe iwu gị.
Alleluia
OZIỌMA – Luk: 4:38-44
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu hapụrụ ụlọnzukọ banye n’ụlọ Saịmọn. Ugbu a oke ahụọkụ jidesiri ọgọ nwaanyị Saịmọn ike nke mere ha ji gwa Jesu maka ya. O guzooro ebe nwaanyị ahụ nọ baara ahụọkụ ahụ mba o wee hapụ ya. Ngwa ngwa nwaanyị ahụ biliri, lee ha ọbịa. Mgbe anyanwụ na-ada, ndị niile nwere ndị ọrịa na ụdị ọrịa dị icheiche kpọkọtaara ha ya. O bikwasa ha aka n’isi n’otu n’otu ahụ wee dị ha mma. Ọtụtụ Mmụọ ọjọọ sikwara n’ime ọtụtụ ndị mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, Ị bụ Nwa Chineke!” Ma Ọ gbọjara ha. O kweghịkwa ka ha kwuo okwu n’ihina ha matara na ọ bụ Kristi ahụ. Mgbe chi foro, Jesu siri n’obodo ahụ pụọ gaa nọrọ naanị ya n’ebe dara jụụ. Ndị mmadụ chọgharịrị ya, mgbe ha chọtara ya, ha achọghị ka O si n’obodo ha pụọ. Ọ sịrị ha, “Aga m agbasakwurịrị oziọma nke alaeze Chineke n’obodo ndị ọzọkwa, n’ihina ọ bụ maka nke a ka e jiri zite m.” Ọ gakwara n’ihu na agbasa oziọma n’ụlọnzukọ niile nọ na Judia.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu