Emume Nnwogha nke Onyenweanyị.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dn: 7:9-10, 13-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps 97: 1-2, 5-6, 9.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2Pt : 1:16-19
- OziọmaLk: 9:28-36
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dn: 7:9-10, 13-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Daniel
Ka m na-ele anya ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha. Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe Ọ nọ wee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọozi nọ ya gburugburu imere ya ihe ọbụla Ọ chọrọ. Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya e bido ikpe ikpe wee meghee akwụkwọ ikpe. Ahụkwara m na nrọ ahụ onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii. Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya. E nyere ya ike ọchịchị na otito na ala eze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 97: 1-2, 5-6, 9.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
1. Onyenweanyị bụ eze! ka ụwa ñụrịba;
Ñụrịbanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;
o jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ
n’ihu Onyenweanyị nke uwa niile.
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya,
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
3. N’ihina ị bụ Onyenweanyị,
onye kachasị elu n’ụwa niile,
onye kachasị chi ndịọzọ elu.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze! onye kachasị elu n’ụwa niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2Pt : 1:16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pita dere
Mgbe anyị mere ka ụnụ mata ike na ọbịbịa nke Onyenweanyị Jesu Kristi, ọ bụghị akụkọ ifo ka anyị kọọrọ ụnụ. Kama anyị jiri anya anyị hụ ịdị ukwu ya.Anyị nọ ebe ahụ mgbe Chineke Nna kwanyeere ya ugwu, nyekwa ya otito, mgbe otu olu dakwara n’ebube, sị, “Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya, onye ihe ya na amasị m!” Anyị nụrụ olu ahụ si n’eluigwe n’ihina anyị na ya nọ n’elu ugwu ahụ. O doola anyị anya na ihe ahụ ndị amụma kwuru bụ eziokwu. Gbakwaanụ mbọ na-ege ntị n’okwu ahụ dị ka ọkụ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ n’obi ụnụ, anyanwụ ụtụtụ achawapụta na ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Nke a bụ Nwa m hụrụ n’anya,
onye ihe ya na-amasị m, geenụ ya ntị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Lk: 9:28-36
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka ihe dịka ụbọchị asatọ gachara mgbe Jesu kwuchara okwu ndị a, Ọ kpọọrọ Pita, Jemis, na Jọn wee rịgoro n’elu ugwu ikpe ekpere. Mgbe Ọ na-ekpe ekpere ihu ya enwoghaa. Uwe ya bidoro chaba ọcha nke ukwu. Ma lee, ya na mmadụ abụọ na-akparịta ụka. Ndị ahụ bụ Mosis na Elaija. Ndị pụtara n’otito wee kwuo okwu maka nlaghachi ya nke Ọ ga-emezu na Jerusalem. N’oge ahụ ụra ji Pita na ndị ya na ha nọ nke ukwu; ha hụrụ ebube ya tinyekwara mmadụ abụọ ya na ha guzoro. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-ahapụ Jesu laba, Pita sịrị Jesu, “Nna anyị ukwu ọ dị mma na anyị nọrọ ebe a, ka anyị rụọ ụlọ ikwu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elijah.”Ma Pita amaghị ihe ọ na-ekwu. Ka ọ na-ekwu nke a, urukpu bịara kpugide ha; ha wee tụọ oke egwu ka urukpu ahụ na-ekpugide ha. Olu siri n’urukpu ahụ daa sị, “Nke a bụ Nwa m, onye m họọrọla, geenụ ya ntị!”Mgbe olu ahụ kwuchara ha hụrụ nanị Jesu, ma ha mechiri ọnụ ha, ha akọrọghị onye ọbụla n’oge ahụ akụkọ ọbụla banyere ihe ha hụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu