Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex: 34:29-35
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 99:5, 6, 7, 9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt: 13:44-46
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Ex: 34:29-35
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mgbe Mosis siri n’ugwu Sinaị gbadata, jirikwa mbadamba okwute abụọ nke ọgbụgbandụ ahụ n’aka ya, Ọ maghị na ihu ya na-amụkesi amụkesi n’ihina ya na Yahweh kparịtara ụka. Ka Erọn na ndị Izrel niile hụrụ Mosis, egwu tụrụ ha ịbịaru ya nso n’ihina ihu ya na-amụkesị amụkesị. Mana Mosis kpọrọ ha; Erọn na ndị ndu nke ọgbakọ ụmụ Izrel abịakwute ya, ọ gwa ha okwu. E mechaa ụmụ Izrel niile gbakọtara, o nyere ha iwu niile Yahweh gwara ya n’ugwu Sinaị. Mgbe ha na Mosis kwuchara, o weere akwa isi kpuchie ihu ya. Ma mgbe ọbụla ọ gara n’ihu Yahweh ka ha kwuo okwu ọ na-ekpupụ ya ruo mgbe ọ pụtara gwakwa ụmụ Izrel ihe Yahweh nyere ya n’iwu. Ụmụ Izrel na-ahụ na ihu Mosis na-egbuke egbuke ma ọ na-ezi ha ozi, o zichaa ha ọ na ekpuchikwa ya ọzọ, ruo mgbe ọ ga-eje ịgwa Yahweh okwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 99:5, 6, 7, 9
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ
1. Ka anyị bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,
kpọọnụ isi ala n’ihu ya;
ọ dị nsọ.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ
2. Mosis na Erọn so na ndị ụkọchukwu ya,
Samuel so na ndị na-akpọku aha ya;
ha kpọkuru Onyenweanyị, ọ zara ha.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ
3. Ọ gwara ha okwu site n’ide igweojii,
ha dobere iwu niile o nyere ha.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ
4. Bulienụ Onyenweanyị Chineke anyị elu,
sekpuoronụ ya n’ihu ugwu ya dị nsọ;
n’ihina Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị dị nsọ
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, meghee anya nke obi anyị,
ka anyị wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ anyị.
Alleluia.
OZIỌMA –Mt: 13:44-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara oke igwe mmadụ sị,”Alaeze eluigwe dịka akụ e zoro n’ubi nke otu nwoke hụrụ wee kpuchie ya ihe, o were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ”. “Ọzọ, alaeze eluigwe dịka onye na-azụ ahịa nke na-achọ ụlarị ọma. Mgbe ọ hụrụ otu ụlarị dị oke ọnụ, ọ lara, ree ihe niile o nwere, wee zụta ụlarị ọma ahụ”.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu