Ncheta Martha dị Asọ.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jn: 4:7-16
-
Abụọma na azịza ya
Ps 33: 2-3, 4-5, 6-7, 8-9, 10-11.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn: 11: 19-27.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jn: 4:7-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ nke Jọn
Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịtanụ onwe anyị n’anya, n’ihina ịhụnaanya si na Chineke pụta. Onye ọbụla nwere ịhụnaanya bụ nwa nke Chukwu. Ọ makwaara Chukwu. Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya. Otu a ka ịhụnaanya Chineke si pụta ihe n’ebe anyị nọ, na o zitere naanị otu nwa ya n’ụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. N’ụdị a ka ịhụnaanya dị: Ọ bụghị na anyị ahụla Chineke n’anya, kama ọ hụrụ anyị n’anya ma zite nwa ya, ka ọ bụrụ onye a ga-esi n’aka ya gbaghara njọ anyị. Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta onwe anyị n’anya. O nwebeghị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị. Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihina o nyela anyị mmụọ ya. Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa. Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ nwa Chineke, Chineke na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 33: 2-3, 4-5, 6-7, 8-9, 10-11.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile
Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla
Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị
Ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị
Soronụ m too aha ya
Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ za m
Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke
ihere anaghị eme ya ma ọlị
Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye
Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche
Ọ na-azọpụta ha
Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
5. Ụnụ ndị nsọ niile, tụọnụ Onyenweanyị egwu
n’ihina ndị niile na-atụ Onyenweanyị egwu enweghị ihe na-akpa ha
Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm
mana iheọma anaghị akọ n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ.
Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m
agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jn: 11: 19-27.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Ọtụtụ ndị Juu bịara ka ha kasie Mata na Meri obi maka ọnwụ nwanne ha nwoke, Mgbe Mata nụrụ na Jesu na-abịa, ọ gara zute ya, ma Meri nọdụrụ n’ụlọ. Mata gwara Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke akaraghị ịnwụ. Ọ bụladị ugbu a, ama na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla Ị rịọrọ n’aka ya. Jesu gwara ya sị, Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ. Mata aza sị ya, “Ama m na ọ ga-ebilite ọzọ na mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Jesu wee sị ya, “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ, onye ọbụla kwere na m ọbụladị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ. Ma onye ọbụla nke dị ndụ, kwerekwa na m, agaghị anwụ ma ọlị. I kwere nke a?” Ọ zara Jesu sị, “Ee, Onyenweanyị, ekwere m na Ị bụ Kristi ahụ, nwa Chineke, onye nke ga-abịa n’ime ụwa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu