Emume Ncheta Meri Magdalin dị Asọ.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Songs: 3:1-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 63: 1, 2-3, 4-5, 7-8.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn : 20: 1-2, 11-18.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Songs: 3:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Abụ ka Abụ (Song of Solomon)
Elere m anya onye ahụ m hụrụ n’anya n’elu akwa m n’abalị. Achọrọ m ya ma ahụghị m ya. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị. Aga m ebilite gagharịa n’ime obodo, gaa n’ụzọ ya niile na n’ebe ọgbakọ ya niile. Aga m achọ ya bụ onye ahụ dị m n’obi. Achọrọ m ya ma ahụghị m ya. Ezutere m ndị nche ka ha na-agagharị n’obodo na-arụ ọrụ ha, m jụọ ha sị, Ụnụ ahụla onye ahụ m hụrụ n’anya? O teghị aka m hapụchara ha, m chọta onye ahụ dị m n’obi. Ejisiri m ya ike, ekweghị m ahapụ ya ruo mgbe m kpọọrọ ya rute n’ụlọ nne m banye n’ime ụlọ onye mụrụ m.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 63: 1, 2-3, 4-5, 7-8.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
1. O Chineke, Ị bụ Chineke m, ana m achọ gị,
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị,
anụahụ m na-achọ gị.
dịka ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebe nsọ gị
na ịhụ ike na otito gị.
ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya,
ọnụ m ga-ekwupụta otito gị.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
3. Aga m eto gị na ndụ m niile,
n’aha gị aga m achili aka m elu;
Mkpụrụobi m ga-enwe nnukwu oriri,
Egwu ọñụ ga-adị n’ọnụ m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
4. N’ihi Ị na-enyere m aka oge niile
ana m ekwe ukwe ọñụ n’okpuru nku gị,
Mkpụrụobi m na-atapara na gị
aka nri gị na-akwado m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ m na Chineke m.
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Meri, gwa anyị, gịnị ka Ị hụrụ n’ụzọ?
Ahụrụ m ebube mbilite n’ọnwụ Kristi na okpokoro ili ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jn : 20: 1-2, 11-18.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
N’isi ụtụtụ n’ụbọchị mbụ nke izuụka mgbe chi na-abọchabeghị, Meri Magdalin gbara ụzọ bịa n’ili, hụ na e bupụla okwute nke e jiri mechie ọnụụzọ. Ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na nwaazụ ahụ Jesu hụrụ n’anya sị ha, “Ha ebupụla Onyenweanyị n’ili, anyị amaghịkwa ebe ha dotere ya”. Meri kwụ n’akụkụ ili ahụ, na-ebe akwa. Ka Ọ na-ebe akwa, o hulatara ala leba anya n’ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n’isi, nke ọzọ n’ụkwụ, n’ebe ahụ e dotere ozu Jesu. Ha jụrụ ya sị, “Nwaanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ zara ha sị, “Ha ebupụla Onyenwe m, ma amaghị m ebe ha dọbara ya. Mgbe o kwuchara nke a, Ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ. Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa? Onye ka Ị na-achọ? “Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya sị, “Nna m ukwu, ọ bụrụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m gaa buru ya. Jesu akpọọ ya sị, “Meri” Nwaanyị ahụ atụgharịa zaa ya na Hibru sị “Raboni!” nke pụtara, Onye nkuzi” Jesu gwara ya sị, “E metụkwala m aka, n’ihina arịgokwubeghị m Nna m. Gakwuru ụmụnna m gwa ha sị, Ana m alakwuru Nna m na Nna ụnụ, Chukwu m na Chukwu ụnụ.” Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu sị, “Ahụla m Onyenweanyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ gwara ya ihe ndị a.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu