Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn: 18:1-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps : 14:2-5 Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Col : 1:24-28
- OziọmaLuk: 10:38-42
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Gn: 18:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Osebụrụwa Chineke bịakwutere Ebreham n’okpuru osisi nke Mamre. Oge ahụ Ebreham nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ikwuu ya n’ihi na ọ bụ n’oge ehihie, mgbe oke okpomọkụ dị. Ka o welitere anya elu, ọ hụrụ ụmụ nwoke atọ ka ha kwudebere ya ebe ahụ. Ozigbo ọ hụrụ ha, o jiri ọsọ, si n’ọnụ ụzọ ụlọ ikwuu gbakwuje ha izute ha. O hulatara isi n’ala sekpuo sị: “Dinwenụ m, ọ bụrụ na Ị hụrụ m n’anya, a gafekwala nwodibo Gị. Aga m ekutere ụnụ obere mmiri ka ụnụ jiri sachaa ụkwụ ụnụ, bịa dina ala zuru ike n’okpuru osisi a. Aga m ewetara ụnụ obere achịcha nke ga-agba ụnụ ume tupu ụnụ agawa n’ihu n’ije ụnụ. Ka ọ bụrụ uru e ritere na ụnụ batara n’ụlọ nwodibo ụnụ.” Ha wee zaa ya sị: “Mee otu i kwuru.” Ebreham, wee jiri ọsọ gbaba n’ime ụlọ ikwuu ahụ wee kpọọ Sara sị ya: “Kulie ọsọ ọsọ, gwakọọ iko ụtụ ọka atọ, were ya meta achịcha.” Ebreham abịakwa, jiri ọsọ gaa kpụta otu nwa ehi doro ahụ, mara mma, kpụnye ya nwodibo ya, onye ji ọsọ, were ya kwado ihe oriri. Mgbe e sichara, o buteere ha nri ahụ, ma mmiri ara ehi ma anụ nwa ehi ahụ, dọsa ya n’ihu ha; ya onwe ya guzo ọtọ n’ihu ha n’okpuru osisi ahụ. Ka ha na-eri nri, ha jụọ ya sị: “Ebee ka nwunye gị Sara nọ?” O wee zaa ha sị: “Ọ nọ n’ime ụlọ ikwuu.” Onye ọbịa ahụ wee gwa ya sị: “N’oge ugbu a n’afọ ọzọ, aga m abịa leta gị. Mgbe ahụ nwunye gị ga-eku nwa nwoke n’aka.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps : 14:2-5 Az. 1
Azịza: Dinwenụ, Onye pụrụ ịbanye n’ụlọ nsọ ikwuu Gị?
1. Onyenweanyị, onye pụrụ ịnọ n’ugwu Gị dị nsọ?
Onye ezi omume aka ya kwụrụ ọtọ;
onye na-eche eziokwu n’obi ya.
Onye na-ejighị ire ya ekwutọ mmadụ ibe ya.
Azịza: Dinwenụ, Onye pụrụ ịbanye n’ụlọ nsọ ikwuu Gị?
2. Onye anaghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ;
onye ya na onye agbata obi ya na-anọghị n’ịbanye n’okwu na ụka;
Onye na-ejighị anya ahụ onye kpọrọ ekwu nkụ na njọ;
ma o nwere nnukwu nsọpụrụ maka ndị na-atụ egwu Onyenweanyị.
Azịza: Dinwenụ, Onye pụrụ ịbanye n’ụlọ nsọ ikwuu Gị?
3. Onye na-ebinye mmadụ ihe n’anaghị ọmụrụ nwa;
onye anaghị anara awufu iji kpegide onye ikpe laara.
Onye ọ bụla na-eme ihe ndị a ga-enwe ume na obi iru ala.
Azịza: Dinwenụ, Onye pụrụ ịbanye n’ụlọ nsọ ikwuu Gị?
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – Col : 1:24-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi
Ma ugbu a, ana m añụrị ọñụ n’ahụhụ m na-ahụ n’ihi ụnụ. N’ihi na n’anụ ahụ m, ana m emezu ihe fọdụrụnụ n’ahụhụ Kristi na-atara ahụ Ya, bụ Nzukọ Ya. Aghọọla m onye na-agba odibo na Nzukọ nke a mgbe Chineke kenyere m ọrụ ikwupụtara ụnụ okwu Ya n’uju ya; nke bụ na ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ụwa bidoro ka a na-ekpughere ndị nsọ Ya n’oge ugbu a. Ọ bụ uche Chineke ime ka ha mata ebube ahụ karịrị akụ na ụba nke ụwa, nke ihe omimi nke a na-ewetara ndị mba ọzọ. Ọ bụ ihe omimi nke Kristi, onye bi n’ime ụnụ na onye bụ nchekwube nke otito ụnụ. Lekwa Kristi ahụ anyị na-ekwupụta. Anyị na-adụkwa mmadụ niile ọdụ, werekwa uju amamihe na-akuziri ha ihe, bịakwa na-atụ anya ime ka onye ọ bụla tozuo oke n’ime Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, Aleluya!
Ha dị ngọzi bụ ndị ji ezigbo obi dị ọcha were dobe okwu nke Chineke;
ha ga-eji ndidi mịta nnukwu mkpụrụ.
Aleluya!
OZIỌMA –Luk: 10:38-42
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu na Ụmụazụ Ya batara n’otu obodo nta ebe otu nwanyị a na-akpọ Mata nabatara Ya ka oke ọbịa n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri, onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị ịnụ nkuzi Ya. Ma uche Mata gbasasịrị agbasasị ebe ọ na-adọlị naanị ya maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere Jesu jụọ ya sị: “Onyenweanyị, ọ gbasaghị Gị na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka”! Ma Onyenweanyị zara ya sị: “Mata! Mata! Ị na- echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe. Ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọtala oke ka mma, nke a na-agaghị anapụ ya.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu