Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex: 3:1-6, 9-12
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 103:1-2, 3-4, 6-7
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt: 11:25-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ex: 3:1-6, 9-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ Mosis na-echekwa igwe atụrụ ọgọ ya nwoke bụ Jetro, onye nchụaja nke Midian, o duuru igwe atụrụ ndị ahụ gaa n’akụkụ ọdịda anyanwụ ọzara wee garute na Họreb bụ ugwu nke Chineke. N’ebe ahụ ka mmụọọma nke Chineke bịakwutere ya n’ụdị ire ọkụ na-enwu n’ime ọhịa ma ọ naghị erepịa ahịhịa dị n’ọhịa ahụ. Mosis we kwuo sị, “Aga m agaru nso ma lee ihe ịtụnaanya nke a mere na ahịhịa ndị a dị n’ọhịa anaghị ere ọkụ”. Mgbe Chineke hụrụ ka ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, o si n’ime ọhịa ahụ kpọọ ya oku sị, Mosis, Mosis” ọ zara ya sị, “Anọ m ebe a”. Yahweh asị ya, “Abịakwala nso; yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihina ebe i guzo bụ ala nsọ”. Chineke gwakwara ya sị, “Abụ m Chineke nke nna gị ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb”. Mosis were kpuchie ihu ya n’ihina egwu na-atụ ya ile Chineke anya n’ihu. Ugbu a akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụla m otu ndị ụmụ ljipt si emekpa ha ahụ. Bịa, aga m ezigara gị Fero ka ị gaa kpọpụta ndị nke m, ụmụ Izrel n’ala ljipt.” Mana Mosis jụrụ Chineke sị, “Onye ka m bụ m ga-eji gakwuru Fero wee kpọpụta ụmụ Izrel n’ala ljipt? Chineke zara ya sị, “Aga m anọnyere gị, ma nke a bụ ihe ga-egosi gị na ọ bụ m zigara gị, mgbe ị dupụtachara ụmụ Izrel site n’ala ljipt, ụnụ ga-efe Chineke ofufe n’elu ugwu a”.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2, 3-4, 6-7
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gọzie Onyenweanyị mkpụrụobi m,
echezọkwala obi ebere ya niile.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
2. Nke o ji gbaghara njọ gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,
nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
3. Onyenweanyị, onye na-eme iheọma,
na-anọkarị n’akụkụ ndị a na-emegbu emegbu,
O mere ka Mosis mata echiche ya,
ma gosịkwa ụmụ Izrel ike ya.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa,
n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke eluigwe.
Alleluia.
OZIỌMA –Mt: 11:25-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ Jesu kwuru sị, “Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe ndị a i zonahụrụ ndị amamihe na ndị okemmụta. Ee, Nna, otu a ka o siri masị gị. Nna m ahanyela m ihe niile n’aka, o nweghị onye ọbụla maara Nwa ahụ ma e wezuga Nna. Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara Nna ma e wezuga Nwa, ya na onye ọbụla Nwa ahụ chọrọ ka ọ mara ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu