Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex : 2:1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 69:3, 14, 30-31, 33-34
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt : 11:20-24
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ex : 2:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ otu nwoke si n’agbụrụ Levaị gara lụrụ otu nwaada sikwa n’agbụru Levaị. Nwaanyị a tụụrụ ime, mụta nwa nwoke, mgbe ọ hụrụ ka nwata ahụ siri maa mma nke ukwuu, o zobere ya ọnwa atọ. Ka ọ hụrụ na o nweghịkwa ka ọ ga-esi zobe ya bụ nwa ọzọ, o tinyere ya na nkata e jiri etere ete mmanụ korota wee mechisie oghere ya dote ya n’etiti ahịhịa miri dị n’akụkụ osimiri Naịl. Nwanne ya nwaanyị guzoro ebe dị anya ịmata ihe ga-eme ya. Mgbe ada Fero bịara ịsa ahụ n’osimiri Naịl, ma ụmụodibo ya nwaanyị nọ na-agagharị n’akụkụ osimiri ahụ, ọ hụrụ nkata dọ n’etiti obere ọhịa dị n’agịga mmiri wee zie otu odibo ya nwaanyị ka ọ gaa bute ya. Mgbe o kpughere nkata ahụ, lee, nwa nọ n’ime ya na-akwa akwa. Ebere nwatakịrị ahụ mere ya o wee sị, “Nke a bụ otu n’ime ụmụ ndị Hibru”. Ozigbo, nwanne nwaanyị nwantakịrị ahụ pụtara jụọ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa kpọọrọ gị otu nwaanyị onye Hibru ga-enyere gị aka zụọ nwa a?” Ada Fero zara ya sị, “Gaba”. Nke a mere nwata nwaanyị ahụ jiri ga-kpọọ nne nwa ahụ. Ada Fero wee gwa nne nwa ahụ sị, “Kuru nwa a gaa zụwara m ya, aga m akwụ gị ụgwọ ọrụ gị”. Nwaanyị a wee kuru obere nwa ahụ gaa zụọ ya. Oge nwa ahụ topụtara, o kuteere ya ada Fero onye jiri ya mere nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Mosis makana o kwuru sị, “Esi m n’osimiri gụpụta ya”. Otu ụbọchị mgbe Mosis topụtarala okorobịa, ọ gara ileta ụmụnne ya, wee hụ ka ha siri nọrọ n’ime ahụhụ. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na eti otu nwanne ya onye Hibru ihe. O legharịrị anya gburugburu. Mgbe ọ hụrụ na o nweghị onye na-ele anya, o gburu onye ljipt ahụ lie ya n’aja. Ka ọ pụrụ echi ya, ọ hụrụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ jụrụ onye nke chọrọ okwu sị, “Gịnị mere i ji etigbu nwanne gị?” Ọ zara ya sị, “Onye mere gị onye ọchịchị na onye ọkaikpe n’etiti anyị? Ị chọwala igbu m otu i si gbuo onye ljipt?” Ozigbo egwu jidere Mosis, o wee chee n’ime onwe ya sị, ‘N’ezie ihe a apụtala ihe’ Mgbe Fero nụrụ nke a ọ chọrọ igbu Mosis, ma Mosis gbapụrụ ga biri n’ala Midian. Ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri nke dị n’ebe ahụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:3, 14, 30-31, 33-34
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
1. Ana m emikpu n’ime ude mmiri
N’enweghị ebe m ga-azọkwasị ụkwụ;
Adamiela m n’ime ụmị mmiri,
Ebili mmiri na-eburu m.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
2. Ana m arịọ gị, Onyenwe m,
Oge masịrị gị
n’oke ịhụnanya gị, za m
N’ịkwụsiike nke nzọpụta gị.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
3. Ma, n’ebe m nọ, nwa ogbenye a na-emegbu emegbu,
Site n’ike nke nzọpụta gị, Chineke, kulite m elu
Aga m eji ukwe too aha nke Chineke
Aga m eji ekele m bulie aha ya.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
4. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a, ha ga-añụrị
Ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke
Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile,
ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji e ji.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị meeghe obi anyị
ka anyị gee ntị n’ihe niile nwa gị na-ekwu.
Alleluia.
OZIỌMA –Mt : 11:20-24
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ahụ, Jesu malitere ịbara obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube mba, n’ihina ha echegharịghị. Azị gba ụnụ Korazin, azị gba ụnụ Betsaịda! N’ihina a sị na ọ bụ n’ime obodo Taya na Sidọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime ụnụ, ha gaara echegharị kamgbe site n’iyiri akwa mkpe na ite onwe ha ntụ. Ma agwa m ụnụ, “a ga-emere obodo Taya na Sidọn ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ. Ma gị Kapanaum, a ga ebuli gị ruo eluigwe?
A ga-eweda gị ruo olulu ala mmụọ. N’ihina a sị na ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime gị, na a rụrụ ha na Sodọm, ọ gaara adị ruo ugbu a. Agwa m ụnụ, a ga-emere obodo Sodọm ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu