Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dt : 30:10-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps : 68:14. 17. 30-31, 33-34. 36-37. Az. 33
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Col : 1:15-20
- OziọmaLuk : 10:25-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Dt : 30:10-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Diuterọnọmi
Mosis gwara ndị mmadụ sị: “Nụrụnụ okwu nke Dinwenụ Chineke ụnụ. Debenụ iwu na atụmatụ Ya niile, nke e dere n’akwụkwọ iwu nke a: Werenụ obi ụnụ niile na mmụọ ụnụ niile wee laghachi azụ n’ebe Dinwenụ Chineke ụnụ nọ.
N’ihi na iwu nke a m na-enye ụnụ taa abụghị nke karịrị ike ụnụ ma ọ bụ echiche ụnụ. Ọ dịghị n’eluigwe nke na ụnụ ga-asị: “Onye ga-arịgo n’eluigwe wetara anyị iwu ahụ, ka anyị wee nụrụ ya, were debekwa ya? Ọ dịghịkwanụ n’okpuru osimiri, nke na ụnụ ga na-asị “Onye ga-agafe osimiri wee wetara anyị iwu ahụ, ka anyị wee nụrụ ya, wee debekwa ya?” Kama, okwu ahụ nọ ụnụ nso; ọ dị n’egbugbere ọnụ ụnụ, na n’obi ụnụ ka ụnụ wee mezuo ya.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps : 68:14. 17. 30-31, 33-34. 36-37. Az. 33
Azịza: Chọwanụ Dinwenụ mgbe ụnụ nọ na mkpa, ka ụnụ wee dị ndụ.
1. Nke a bụ ekpere m; ekpere m ji anata ihe ọma n’aka Gị.
Chineke m, were nnukwu ịhụnanya Gị za m;
Gosi m enyemaka Gị na-enweghị ngwụcha.
Onyenweanyị, na nnukwu ịhụnanya Gị za m oku,
n’ihi na ịhụnanya Gị ebuka.
Were nnukwu ebere Gị tụgharịa, lee m anya.
Azịza: Chọwanụ Dinwenụ mgbe ụnụ nọ na mkpa, ka ụnụ wee dị ndụ.
2. Abụ m onye e megburu emegbu nke nọkwa na ahụ mgbu.
Chineke m, jiri enyemaka Gị kulite m.
Aga m eji ukwe too aha Chineke,
werekwa ekele nye aha Ya otito.
Azịza: Chọwanụ Dinwenụ mgbe ụnụ nọ na mkpa, ka ụnụ wee dị ndụ.
3. Mgbe ụmụ ogbenye hụrụ ya, ha ga-enwe obi ụtọ.
Ndị obi ha na-achọ Chineke ga-adị ndụ ọhụrụ;
N’ihi na Chineke na-ege ndị nọ na mkpa ntị.
Ọ naghị agbaketa ụmụ odibo Ya azụ na mkpa ha.
Azịza: Chọwanụ Dinwenụ mgbe ụnụ nọ na mkpa, ka ụnụ wee dị ndụ.
4. N’ihi Chineke ga-eweta enyemaka na Zayọn.
Ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda.
Agbụrụ ụmụ odibo Ya niile ga-eji ya mere ebe obibi.
Ndị niile hụrụ aha Ya n’anya ga-ebikwa na ya.
Azịza: Chọwanụ Dinwenụ mgbe ụnụ nọ na mkpa, ka ụnụ wee dị ndụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Col : 1:15-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi
Kristi bụ onyinyo nke Chineke ahụ a na-adịghị ahụ anya, bụrụkwa onye e buru ụzọ mụọ, n’ihe niile e kere eke; ma ihe ndị a na-ahụ anya ma ihe ndị a na-adịghị ahụ anya. E sitere na Ya mee ihe niile. Ọ bụkwa Ya ka emeere ihe niile, ma ọ bụ ocheeze ma ọ bụ ugwueze, ma ọ bụ ike ọchịchị, ma ọ bụ ike mmụọ na nke mmadụ. Ya buru ihe niile ụzọ dịwa. Ọ bụkwa na Ya ka ihe niile si adị. Kristi bụ isi nke ahụ bụ Nzukọ. Ọ bụ Isi Mbido na onye mbụ e siri na ndị nwụrụ anwụ mụọ; ka o wee bụrụ E Kwucha Ọ Gwụ dị n’ihe niile. Ọ masịrị Chineke ime ka izuoke niile O jiri bụrụ Chukwu zuo oke n’ime Kristi, ka e wee mee udo n’agbata ihe niile n’ime Kristi; mgbe m kwuru ihe niile, ekwupụtara m na esitere n’ọbara Ọ gbara n’elu obe mee ka udo dị n’agbata ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’elu ụwa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ,
ha bụ ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA –Luk : 10:25-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ma lee, otu onye ọka-iwu biliri chọ ụzọ ịnwụde Jesu site n’ajụjụ. O wee jụọ Ya, sị: “Onye Nkuzi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi”? Jesu wee jụghachi ya sị: “Gịnị ka e dere n’Iwu n’ime Akwụkwọ Nsọ” Olee otu i si agụ ya?” Onye ọka-iwu ahụ wee za sị, “Ị ga-eji obi gị niile, na mmụọ gị niile, na ike gị niile na uche gị niile hụ Onyenweanyị bụ Chineke gị n’anya. Ị ga-ahụkwa onye agbata obi gị n’anya otu i si hụ onwe gị n’anya”. Jesu wee za ya sị: “Ị zara nke ọma. Mee otu a. Ị ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” Ma ebe onye ọka-iwu ahụ na-achọ ịgụ onwe ya n’onye ezi omume, ọ jụrụ Jesu sị: “Onye bụkwanụ onye agbata obi m? Jesu wee zaghachi ya sị: “Otu nwoke si Jerusalem na-agbada ịga Jeriko. O wee daba n’aka ndị abalịdịegwu, ndị gbara ya ọtọ, tie ya ihe, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma, wee gbalaga. Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja si ụzọ ahụ agafe. Ọ hụrụ nwoke ahụ, wee gafere. Otu aka ahụ, otu onye Livaị sikwara ụzọ ahụ agafe. Ọ hụkwara nwoke ahụ, bịakwa site n’akụkụ ụzọ ahụ gafeekwa. Ma otu onye Samerịa, nọ na njem bịaruru ebe nwoke ahụ tọgbọrọ. Ebere juru ya obi mgbe ọ hụrụ ya. O wee bịakwute ya, wụkwasị ya mmanụ igbochi ihe mgbu, na mmanya ọkụ ịgbasị ọnya, wee kechie ọnya ya. O kukwasị ya n’ịnyịnya ibu nke aka ya, kpọbata ya n’ụlọ ndị ije, ebe ọ nọrọ lekọtazie ya anya nke ọma. N’echi ya, onye Samerịa ahụ fọpụtara naịra abụọ, nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ wee rịọ ya: ‘Biko, lezie nwoke a anya nke ọma. Ihe ọ bụla i mefuru n’elu ihe a m nyere gị, mgbe m bịaghachiri, aga m akwụghachi gị.” Jesu wee jụọ onye ọka-iwu ahụ, sị: “N’ime mmadụ atọ ndị a, onye ka ichere gosiri na ya bụ onye agbata obi nwoke ahụ nke dabara n’aka ndị abalịdịegwu?” Onye ọka-iwu ahụ wee zaa, sị: “Onye ahụ meere ya ebere.” Jesu sịrị ya, “Gaa, gị onwe gị, meekwa otu ahụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu