Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is : 66:10-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps : 65:1-7.16.20 Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Gal: 6:14-18
- OziọmaLuk: 10:1-12. 17-20
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is : 66:10-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Jerusalem, ñụrịwa. Ụnụ bụ ndị hụrụ ya n’anya, nweenụ obi ụtọ maka ya. Ụnụ bụ ndị na-eruburu ya ụjụ, ñụrịwanụ, ñụrịwaranụ ya; ñụọnụ ara ya na-enye nkasi obi, were ya ñụjuo afọ, jirinụ obi ụtọ ñụọ ara ya jupụtara n’otito.
N’ihi na Onyenweanyị kwuru sị: “Ana M eziga udo na-ehu ehu dịka mmiri n’ebe ọ nọ; nnukwu mmiri na-aga aga ka M ga-eji nye mba niile otito. Ọ ga-ebu ụmụ ọ na-azụ azụ n’obi ya, kuru ha n’apata ụkwụ. Dịka nwa si enweta nkasị obi n’ahụ nne ya, otu ahụ ka M ga-esi kasie gị obi. Na Jerusalem ka ị ga-enweta nkasị obi. Obi gị ga-enwe añụrị mgbe ị hụrụ ya anya; ọkpụkpụ dị gị n’ahụ a na-eto dịka ahịhịa ndụ. Dinwenụ ga-asaghepụrụ ụmụ odibo Ya aka Ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps : 65:1-7.16.20 Az. 1
Azịza: Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
1. Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
Kweerenụ aha Ya ukwe otito.
Nyenụ Ya otito kwesịrị ekwesị.
Gwanụ Chineke sị: Lee ka ọrụ Gị si dị ịtụnanya.
Azịza: Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
2. Ụwa niile ga-egbu ikpere ala nye Gị.
Ha ga-ekwere aha Gị ukwe.
Bịanụ ka ụnụ hụ aka ọrụ Chineke.
Ọrụ Ya dị ịtụnanya n’etiti ndị mmadụ.
Azịza: Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
3. O mere osimiri ọ bụrụ ala kpọrọ nkụ.
Ha wee si n’etiti osimiri gafee dịka n’elu ala.
Ka añụrị anyị dịrị n’ime ya.
Ike Ya ka O ji achị ebighị ebi.
Azịza: Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
4. Bịanụ ka ụnụ nụrụ, ụnụ bụ ndị na-atụrụ Chineke egwu.
Aga m ekwupụta ihe O meere mkpụrụobi m.
Ngọzi dịrị Chineke onye na-ajụghị ekpere m,
nke Ọ na-ajụ inye m ịhụnanya Ya.
Azịza: Mba niile, werenụ añụrị tigara Chineke mkpu ọñụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Gal: 6:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia
Ma Chineke ekwela ka m nyaa isi ma ọ bụghị n’obe nke Onyenweanyị Jesu Kristi. N’ihi na Chineke sitere n’obe Ya mee ka ụwa bụrụ ihe nwụrụ anwụ n’ebe m nọ. O sikwara ya mee ka m nwụọ n’ebe ụwa dị. N’ihi na obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe. Kama ihe dị mkpa bụ mmadụ ịbụ onye e kegharịrị ọhụrụ. Ka udo na ebere Chineke dịkwasị ndị na-adị ndụ dịka ụkpụrụ nke a si dị; ka udo na ebere Chineke dịkwasịkwa ndị Izrel ọhụrụ nke Chineke. Na nkwubi okwu m: Site n’ugbu a, onye enyekwala m nsogbu ọzọ. N’ihi na ebu m n’ahụ m ọtụtụ apa nke na-egosi na abụ m ohu Jesu. Ụmụnna m, ka amara nke Onyenweanyị Jesu Kristi dịnyere mmụọ ụnụ! Amen.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Ihe a na-ewe n’ubi hiri nne.
Ma ndị ọrụ ga-achịkọta ya dị sọ olemole.
Aleluya!
OZIỌMA – Luk: 10:1-12. 17-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Onyenweanyị họpụtakwara iri ụmụ nwoke asaa na abụọ ndị ọzọ, wee zipụ ha, abụọ abụọ ka ha buru ụzọ baa n’obodo ọ bụla na ebe ọ bụla Ya onwe Ya na-ejikere ịbịa. Ọ gwakwara ha sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne; ma ndị ọrụ dị sọ olemole. Na-arịọnụ Onyenwe ihe a na- ewe n’ubi, ka O zite ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi Ya. Jeenụ! Lee, ana M ezipụ ụnụ dịka ụmụ atụrụ e zijere n’etiti agụ. Ụnụ ewela akpa ego, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ. Ụnụ akwụsịkwala n’ụzọ ikele onye ọ bụla. Tupu ụnụ abanye n’ụlọ ọ bụla, burunụ ụzọ sị: ‘Udo dịrị ụlọ a’. Ọ bụrụ na onye udo bi n’ebe ahụ, ka ekpere udo ụnụ dakwasị ya; ma ọ bụrụ na onye udo ebighị n’ebe ahụ, ka ekele udo ụnụ laghachi-kwute ụnụ. Ụnụ esila n’otu ụlọ baa n’ụlọ ọzọ, n’enweghị ebe ụnụ nọ anọ. Kama nọgidenụ n’ụlọ ahụ a nabatara ụnụ nke ọma, na-erinụ, na-añụkwanụ ihe ha chere n’ihu ụnụ, n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya. N’ime obodo ọ bụla ụnụ banyere, ndị obodo anara ụnụ nke ọma, rienụ ihe ọ bụla ha chere n’ihu ụnụ. Gwọọnụ ndị ọrịa nọ n’obodo ahụ, gwanụ ndị obodo ahụ, sị: ‘Alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.’ Ma mgbe ụnụ banyere obodo ọ bụla, ndị obodo ahụ anaraghị ụnụ nke ọma, pụọnụ n’okporo ụzọ ya, kwuo sị: “Ọ bụna aja si n’obodo ụnụ, nke takụrụ n’ụkwụ anyị, anyị na-etichapụ ya, ka ọ bụrụ akaebe a gbagidere ụnụ. Otu ọ dị, maranụ nke ọma na Alaeze Chineke abịaruola nso”. N’ịgwa ụnụ eziokwu, n’Ụbọchị Ikpe Chineke, obodo Sodom ga- aka obodo ahụ mma!” Ụmụ nwoke iri asaa na abụọ ahụ wee lata n’ọñụ. Ha wee sị: “Onyenweanyị, ọ bụna ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị nyere ha iwu n’aha Gị!” Jesu we zaa ha, sị: “Ahụrụ M ekwensu ka o siri n’eluigwe daa n’ala ọsọsọ dịka amụma. Lee, enyela m ụnụ ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike onye iro ahụ. Ọ dịghịkwa ihe ga-emerụ ụnụ ahụ ma ọlị. Ma ụnụ añụrịla ọñụ naanị na ndị mmụọ ọjọọ na-erubere ụnụ isi. Kama ñụrịanụ ọñụ na e deela aha ụnụ n’Akwụkwọ Nke Ndụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu