Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 49:1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 139: 1-3, 13-14, 14-15
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Acts: 13:22-26
- OziọmaLuk: 1:57-66, 80
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Is: 49:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Geenụ m ntị, O, ala ndị dị n’akụkụ mmiri, ụnụ ndị bi ebe tere aka, geenụ ntị. Chineke họọrọ m site n’afọ nne m, ọ kpọrọ m aha tupu a mụọ m. O meela ọnụ m ọ dị nkọ ka mmagha. O zoro m n’okpuru aka ya; o mere m ka m bụrụ akụ a pịrị nke ọma; ọ na-echekwa m n’ime ọbọ ya. Ọ sịrị m “Ị bụ nwaodibo m, Izrel, onye m ga-esi na ya nweta otito. Maka ekwuru m sị, ataala m ahụhụ lara n’iyi, emefuola m ike m n’ihe na-abaghị uru; mana ihe nketa m dị n’Osebụrụwa. Ụgwọ ọrụ m dị na Chineke. Ma ugbu a Yahweh, onye kpụrụ m n’ime afọ nne m, ka m bụrụ nwodibo ya, ka m kpọghachiri ya Jekọb azụ, ka m chịkọtara ya Izrel, maka na-enwere m nsọpụrụ n’ihi ya, onye bụ ike m, kwuru sị, “Ọ bụghị naanị na ị bụ nwodibo m ka i were kpọlite agbụrụ Jekọb kpọghachi ụmụ Izrel ndị fọdụrụnụ; Aga m eme gị ihe nke mba niile ka nzọpụta were ruo na nsọtụ nke ụwa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 139: 1-3, 13-14, 14-15
Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.
1. Onyenweanyị I nyochaala m, marakwa m!
Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ;
Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche,
Ị mazuru omume m niile,
mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.
Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.
2. Ọ bụ gị kere mmụọ m,
Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m,
Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a,
maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m,
nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile.
Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.
3. Ị maara m nke ọma!
Ị maara otu ọkpụkpụ m miile siri dị oge a na-akpụ m na nzuzo,
oge a na-ejikọta m ọnụ n’afọ nne m.
Azịza: Ana m ekele gị maka ihe ịtụnaanya dị n’okike I kere m.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – Acts: 13:22-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndịozi
Pọl kwuru sị, mgbe Chineke wepụrụ Sọl na ọchịchi. Ọ kpọlitere Devid ka ọ bụrụ eze ha, onye ọ gbaara akaebe, sị, “Ahụla m Devid nwa Jese dịka ụdị mmadụ m chọrọ, onye ga-eme ihe niile bụ uche m. Ọ bụ site n’ụmụụmụ nwoke a ka Chineke si wetara ụmụ Izrel onye nzọpụta dịka o si kwee na nkwa. Tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusaarala ndị Izrel banyere mmirichukwu nke nchegharị. Na ngwụcha ọrụ Jọn, o kwuru sị, “Onye ka ụnụ chere na m abụ? Abụghị m onye ahụ ụnụ na-atụ anya ya. Kama leenụ! otu onye na-esochi m n’azụ, onye mụ etorughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ụmụnne m ndị si na agbụrụ Abraham, na ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n’etiti ụnụ, Ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi nzọpụta nke a.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ma gị bụ nwa, ka m ga-akpọ onye amụma nke onye kacha elu;
N’ihina Ị ga-aga n’ihu Dinwenụ idoziri ya ụzọ ya niile.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Luk: 1:57-66, 80
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ugbu a, oge ruru mgbe Elizabet ga-eji mụọ nwa, o wee mụọ nwa nwoke. Mgbe ndị agbataobi na ndị ikwu na ibe ya nụrụ na Dinwenụ egosịla ebere ya n’ebe ọ nọ, ha sooro ya ñụrịa ọñụ. N’ụbọchị nke asatọ ha zukọrọ ibi nwata ahụ ugwu, ha gaara akpọ ya Zakarịa, aha nna ya. Ma Elizabet zara sị, “Mba; a ga-akpọ ya Jọn.” Ha azaa ya sị, “O nweghị onye ọbụla n’ime ndị ikwu na ibe gị na-aza aha dị otu a.” Ha meere nna ya akara ka ha mara aha ọ chọrọ ka a kpọọ nwa ya. O wee rịọ ka enye ya ihe eji ede akwụkwọ. O dere, “Aha ya bụ Jọn.” Nke a tụrụ ha niile n’anya. Ozigbo ahụ ọnụ ya meghee, ire ya tọghepụ, ọ bịa kwube okwu, na-agọzi Chineke. Ụjọ tụrụ ndị agbataobi ha niile. Ndị mmadụ kwusara ihe ndị a n’obodo niile nke Judịa; Ndị niile nụrụ ihe merenụ chebaara ihe ndị a echiche, na-ajụ sị, “Gịnị ka nwatakịrị a ga-abụ?” N’ihina ike nke Dinwenụ nọnyeere ya. Nwata ahụ toro, bịa dịkwa ike na mmụọ. Ọ nọrọ n’ime ọzara ruo ụbọchị ọ pụtara ihe n’ihu ụmụ Izrel.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu