Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Prv : 8:22-31
-
Abụọma na azịza ya
Ps : 8:4-9. Az. 2
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Rom : 5:1-5
- OziọmaJn : 16:12-15
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu
Amamihe nke Chineke na-eti mkpu na-asị: Onyenweanyị kere M n’oge ebum n’uche Ya pụtara ihe, tupu O kee ihe ọ bụla ọzọ. Abụ M mbute ụzọ nke ọrụ ebube Ya site n’ọgbọ niile. Site na mgbe ochie, n’isi mbido tupu e kee ụwa, apụtala M. A mụọla M tupu ogbu mmiri ọ bụla adị, mgbe a na-enwebeghị isi iyi ma ọ bụ mmiri ọgba n’elu, tupu ugwu ukwu ọ bụla apụta n’ụwa. A mụọla M tupu ugwu nta ọ bụla apụta, mgbe a na-emebeghị ala na mbara ọhịa ọ bụla, tupu e nwee aja mmiri ọ bụla n’elu ụwa. Anọ M ya mgbe e kere mbara igwe; mgbe ahụ a kpara oke ahụ dị n’etiti mbara igwe na ogbu mmiri. Mgbe ahụ O mere ka mbara igwe sie ike, bịakwa mee ka ntọala ụwa gbaa mgbọrọgwụ. Mgbe ahụ Ọ kpara oke, nke oke osimiri na-agaghị agafe, iji mee ka mmiri ghara inupụ isi n’iwu Ya. Mgbe ahụ, anọ M Ya n’akụkụ dịka omenka. Ihe M na-amasị Ya kwa ụbọchị kwa ụbọchị. Oge niile a, ana M egwurị egwu n’ihi Ya, na-egwurịkwa egwu n’elu ụwa. Ihe ụmụ mmadụ na-eme na-amasị M.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps : 8:4-9. Az. 2
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị si dị ebube n’ụwa niile.
1. Mgbe m lechara mbara igwe nke bụ ọrụ mkpịsị aka Gị rụrụ,
bịakwa hụ ọnwa na kpakpando ebe I nyere ha ọnọdụ.
Gịnị bụ mmadụ, nke na Ị na-echeta ya?
Gịnị bụ nwa mmadụ nke na Ị na-akpachapụrụ ya anya?
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị si dị ebube n’ụwa niile.
2. I mere ya nke na ọ fọdụrụ nwa ntakịrị ka ọ ghọọ Mmụọma.
I ji ebube na nsọpụrụ kpube ya okpu eze.
I nyere ya ike ka ọ na-achị ihe niile I jiri aka Gị mee,
bịakwa were ihe niile tinye ya n’okpuru ụkwụ.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị si dị ebube n’ụwa niile.
3. Ma atụrụ, ma ehi na anụ ọhịa niile.
Ma nnụnụ na-efe n’elu,
ma azụ nọ n’oke osimiri,
na ihe niile na-egwu mmiri
n’okporo ụzọ nke oke osimiri.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha Gị si dị ebube n’ụwa niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – Rom : 5:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Ebe a gụrụla anyị na ndị ezi omume site n’okwukwe, anyị na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenweanyị Jesu Kristi. Jesu akpọbatala anyị n’ime amara Chineke, site n’okwukwe. Anyị na-erugharịkwa n’ime amara ahụ ugbu a. Anyị na-añụrị ọñụ, n’ihi na anyị nwere olile anya na anyị ga-eketa otito Chineke! Ma ọ bụghị naanị nke a: Anyị na-añụrịkwa ọñụ n’ime mkpagbu anyị niile. N’ihi na anyị ma na mkpagbu na-arụpụta ndidi. Ndidi na-arụpụtakwa agwa ọma site na nnwale. Agwa ọma na-arụpụta olile anya. Olile anya ahụ adịghịkwa aghọ anyị ahịa. N’ihina Chineke wụsara ịhụnanya Ya n’ime obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ ahụ O nyere anyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ. Chineke ahụ dị adị, Onye dị ugbu a, na Onye na-abịanụ.
Aleluya!
OZIỌMA – Jn : 16:12-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu gwara ndị Ụmụazụ ya, sị: enwekwara M ọtụtụ ihe ọzọ M ga-agwa ụnụ. Ma ụnụ agaghị anabata ha ugbu a. Ma mgbe Mmụọ nke eziokwu ahụ bịara, Ọ ga-eduba ụnụ n’eziokwu niile. Ọ gaghị ekwu naanị n’onwe Ya. Kama Ọ ga-ekwu ihe niile Ọ nụrụ, kọkwaara ụnụ ihe nke gaje ịbịa. Ọ ga-enyekwa M otito. N’ihi na Ọ ga-esite n’aka M nata ihe Ọ ga-akọrọ ụnụ. Ihe niile Nna m nwere bụ nke M. Nke a ka M ji sị na Mmụọ Nsọ ga-esite n’aka M nata ihe Ọ ga-akọrọ ụnụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu