Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Cor : 1:18-22
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 119:129, 130, 131, 132, 133, 135.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMat : 5:13-16
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2 Cor : 1:18-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ma dịka Chineke kwesịrị ntụkwasịobi, nkwa m kwere ụnụ abụghị nke gwa m ọzọ mee ọzọ. N’ihina Jesu Kristi nwa Chineke onye mụ na Sịlvanọs na Timoti kwusara n’etiti ụnụ abụghị ee na mba, kama ọ bụ ee mgbe ọbụla. N’ime Kristi ka anyị hụrụ Ee na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee Amen n’inye Chineke otito. Ma ọ bụ Chineke n’onwe ya na-eme ka anyị na ụnụ kwụdosie ike n’ime Kristi, O zipukwala anyị; Ọ kara anyị akara n’ihu nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka ọ biri n’obi anyị dịka Onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:129, 130, 131, 132, 133, 135.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
1. Iwu gị niile dị ịtụnaanya,
ya mere na ana m asọpụrụ ha.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
2. Okwu gị na-enye ihe,
ọ na-enye ndị umeala nghọta.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
3. A na m atụbọ, ọnụ egherekwa oghe
n’ihi agụụ nke iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
4. Biko, che ihu gị n’ebe m nọ, meere m ebere,
dịka otu i si emere ndị hụrụ aha gị n’anya.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
5. Duzie nzọ ụkwụ m dịka i siri kwe na nkwa,
ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịchị m.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
6. Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị,
ma kuziere m ime uche gị.
Azịza: Onyenweanyị, mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị.
MBEKU :
Alleluia, Alleluịa:
Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.
Alleluia.
OZIỌMA – Mat : 5:13-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ bụ nnu nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu atụfuo ụtọ ya, kedụ otu a ga-esi weghachi ụtọ ya? O nweghịkwa uru ọzọ ọ bara karịa ịwụfu ya n’ezi ndị mmadụ azọba ya ụkwụ. Ụnụ bụ ihe nke ụwa. Obodo a rụrụ n’elu ugwu adịghị na nzuzo. Ndị mmadụ anaghị amụnye ọkụ were ite kpuchie ya. Kama, a na-amụnye ya dọba ya n’elu ihe e ji adọba ọkụ, ka ọ na-enye ndị niile nọ n’ime ụlọ ihe. Meenụ ka ihe ụnụ chawapụta n’ihu mmadụ niile, ka ha wee hụ ọrụ ọma ụnụ wee too nna ụnụ nke bi n’eluigwe.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu