Satọde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Acts : 28:16-20, 30-31
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 11: 4, 5, 7.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn : 21:20-25.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Acts : 28:16-20, 30-31
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ka anyị bịaruru Rom, ọchị agha kwenyere ka Pọl biri iche, ya na otu onye agha nke na-eche ya nche. Ka ụbọchị atọ gachara, Pọl kpọrọ ndịisi nke ndị Juu, ndị bi na Rom, nzukọ. Oge ha zukọrọ, ọ gwara ha sị: “Ụmụnne m! N’eziokwu ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị Juu, ma ọ bụ megide omenaala anyị natara n’aka nnanna anyị ha. Ha jidere m na Jerusalem, mee ka m bụrụ onye mkpọrọ, harakwa m nye n’aka ndị Rom. Oge ha kpechara m ikpe ha chọrọ ịhapụ m ka m laa, n’ihina ha chọpụtara na ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ m mere. Ma mgbe ndị Juu ekwetaghị nzube ha ọ dịghịkwa ihe ọzọ m maara m ga-eme karịa ịkpọku Siza, eze Rom. Mgbe ha na-ekwu nke a, ọ bụghị ebubo ka m na-ebogide obodo m. N’ihi nke a, ka m ji chọọ, rịọkwa, ka m hụ ụnụ anya gwa ụnụ okwu, n’ihina ọ bụ maka olileanya nke Izrel ka e ji kee m agbụ a.” Pọl biri na Rom afọ abụọ zuru oke n’otu ụlọ. Ọ na-akwụ ụgwọ n’ọnwa n’ọnwa na ya. N’ebe ahụ, ọ na-anabata nke ọma ndị niile bịara ileta ya. O jikwa nkwuwa okwu, n’asọghị anya na-ekwusa maka alaeze Chineke, na-akuziri ndị mmadụ maka Onyenweanyị Jesu Kristi. Ọ dịghịkwa onye ọbụla na-egbochi ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 11: 4, 5, 7.
Azịza: Ndị eziomume ga-ahụ ihu gị anya O Onyenweanyị.
1. Onyenweanyị nọ n’ụlọ nsọ ya,
Onyenweanyị onye ocheeze ya dị n’eluigwe;
Ọ na-eledata anya n’ụwa.
Ọ na-elezukwa mmadụ niile.
Azịza: Ndị eziomume ga-ahụ ihu gị anya O Onyenweanyị.
2. Onyenweanyị na-enyocha ma ndị eziomume ma ndị ọjọọ,
Ọ na-akpọkwa onye ọbụla hụrụ mmegbu na ọgụ n’anya asị.
Azịza: Ndị eziomume ga-ahụ ihu gị anya O Onyenweanyị.
3. Onyenweanyị bụ onye eziomume,
Ọ hụkwara eziomume n’anya,
ndị eziomume niile ga-ahụ ihu ya anya.
Azịza: Ndị eziomume ga-ahụ ihu gị anya O Onyenweanyị.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Mmụọ Nsọ ahụ ga-akụziri ụnụ ihe niile, ma chetakwara ụnụ ihe niile m kwuru.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jọn : 21:20-25.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Pita tụgharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ Jesu bụ onye ọ hụrụ n’anya ka ọ na-eso ya n’azụ. Ọ bụ onye ahụ dabeere n’akụkụ Jesu na nri anyasị ahụ wee jụọ ya sị, “Onyenweanyị, onye ga-arara gị nye?” Mgbe Pita hụrụ ya ọ jụrụ Jesu sị, “Onyenweanyị kedụ maka onye a?” Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na m chọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa ọzọ, ọ gbasara gị?” Sobe m! Akụkọ a gbasara n’etiti ụmụnna n’ime Kristi na onye ahụ na-eso ụzọ Jesu a gaghị anwụ. Kama ọ sịrị, “Ọ bụrụ na m chọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa ọzọ, ọ gbasara gị?” Ọ bụ onye ahụ na-eso ụzọ Jesu gbara akaebe banyere ihe ndị a. Ọ bụ ya dekwara ihe ndị a. Anyị ma na-akaebe ya bụ eziokwu. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ozo Jesu rụrụ. Ọ bụrụ na-edebe ha niile n’Akwụkwọ, Ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu