Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Acts : 20:17-27
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 68: 10-11, 20-21.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn : 17:1-11.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Acts : 20:17-27
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Pọl siri na Miletus ziga ozi n’Efesus ka ndị okenye nzukọ Kristi nọ ebe ahụ bịakwute ya. Mgbe ha bịaruru, ọ sịrị ha, “Ụnụ maara nke ọma otu m si nọọ n’etiti ụnụ ogologo oge a niile site n’ụbọchị mbụ m zọrọ ụkwụ n’ala Eshịa ruo taa. Ụnụ hụrụ na-ejiri m obi umeala, na anya mmiri na-agara Onyenweanyị ozi, n’ime ọnwụnwa dị iche-iche dakwasịrị m, site n’ajọ izu niile nke ndị Juu gbara megide m. Ụnụ hụrụ na-ahapụghị m ime ka ụnụ mara ihe ọbụla ga-abara ụnụ uru, mgbe ọbụla m na-akuziri ụnụ ihe n’ụlọ ma ọ bụ n’ihu ọha. Adọrọ m ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ aka na ntị, ka ha chegharịa, bịakwute Chineke, ka ha kwerekwa na Onyenweanyị Jesu. Ma ugbu a lee, ana m aga Jerusalem, site na mmanye nke Mmụọ Nsọ, amaghị m ihe ga-adakwasa m ebe ahụ. Naanị ihe m ma bụ na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama, n’obodo ọbụla m ruru, na ịga mkpọrọ na mkpagbu chere m. O nweghị ihe m ji ndụ m kpọrọ. Agụghịkwa m ya n’ihe oke ọnụ karịa ije ozi m, ka m gbazuo ọsọ m gazukwaa ozi nke m natara n’aka Onyenweanyị Jesu, nke bụ ịgba akaebe nye oziọma nke amara Chineke. Ugbu a, lee, amatala m na ụnụ bụ ndị m gagharịrị n’etiti ha, na-ekwusa oziọma alaeze Chineke, agaghị ahụ m ọzọ. Ya bụ, n’ụbọchị taa ana m agba akaebe na aka m dị ọcha n’ebe ọbara ụnụ niile dị. N’ihina ahapụghị m ime ka ụnụ mara ndụmọdụ niile nke Chineke.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68: 10-11, 20-21.
Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.
1. Chineke i mere ka ngọzi gị na-erudata n’ala dịka mmiri ozuzo,
oge ndị nke gị dara mba i nyere ha ike;
Ndị ezinụụlọ gị chọtara ụlọ ebe obibi,
nke i wetara site n’afọọma gị maka ndị dị umeala.
Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.
2. Ngọzi dịrị Onyenweanyị n’ụbọchị niile,
Chineke onye na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu arọ anyị:
Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta,
ọ bụ Onyenweanyị Chineke nwe ụzọ e si agbanarị ọnwụ.
Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’aka nri nke Chukwu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jọn : 17:1-11.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe Jesu kwuchara ihe ndị a, o leliri anya n’eluigwe, sị, “Nna, oge eruola; nye nwa gị otito ka nwa gị wee nye gị otito. Ebe ọ bụ na i nyere ya ike n’ebe mmadụ niile nọ, ka o nye ndị niile i tinyere ya n’aka ndụ ebeebe. Nke a bụ ndụ ebeebe ahụ: ka ha mara gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke; marakwa Jesu Kristi onye nke i zitere. Enyela m gị otito n’elu ụwa, n’ihi na-arụzuola m ọrụ i nyere m ka m rụọ. Ugbu a Nna m, nye m otito n’ihu gị, ụdị otito ahụ nke mụ na gị nwere tupu e kee ụwa. Emeela m ka ndị ahụ i siri n’ụwa kpọnye m mara onye ị bụ. Ha bụ ndị nke gị, i were nye m ha. Ha dobekwara okwu gị. Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si n’aka gị bịa. N’ihi na eziela m ha ozi i ziri m zie ha. Ha onwe ha naara ozi ahụ marakwa n’eziokwu na-esi m n’ebe ị nọ bịa. Ha kwerekwaara na ọ bụ gị zitere m. Ana m ekpere ha ekpere. Ọ bụghị ụwa ka m na-ekpere ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, n’ihi na ha bụ ndị nke gị. Ihe niile m nwere bụ nke gị; ihe niile i nwere bụkwa nke m. Aga m enwekwa otito n’ime ha. Ugbu a, anọghịkwa m n’ime ụwa, ha ka nọ n’ime ụwa, ma ana m alaghachikwute gị. Ya bụ, Nna dị nsọ, dokwaa ha nke ọma site n’ike nke aha gị, bụ aha ahụ nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu