Fraịde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Acts : 13:26-33
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 2: 6-7, 8-9, 10-11.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn : 14:1-6
HE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Acts : 13:26-33
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe Pọl ruru Antiọk nke dị n’ala Pisidia, Ọ banyere n’ụlọnzukọ ndị Juu kwuo sị: “Ụmụnne m, ndị si n’agbụrụ Abraham, na ndị niile na-atụ egwu Chineke nọ n’etiti ụnụ. Ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi nzọpụta nke a. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha aghọtaghị na Jesu bụ onye nzọpụta. Ha aghọtaghị ihe ndị amụma kwuru nke a na-agụpụtara ha ụbọchị Sabat niile. N’ihi ya, ha mezuru ihe ndị amụma kwuru site n’ịma ya ikpe ọnwọ. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere a ga-eji ma ya ikpe, ha rịọrọ Paịlet ka o gbuo ya. Mgbe ha mezuru ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Jesu, ha siri n’elu obe wedata ya, lie ya. Ma Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie. O gosiri ndị na-eso ụzọ ya ndị si Galili soro ya ruo Jerusalem, onwe ya. Ndị a bụzi ndị akaebe ya ugbu a n’ihu ndị mmadụ. Anyị bịara iwetara ụnụ oziọma na ịgwa ụnụ na ihe ahụ Chineke kwere nnanna anyị ha na nkwa, ka o mezurula anyị bụ ụmụ ha site n’ime ka Jesu si n’ọnwụ bilie, nke a bụ dịka e si dee ya n’Akwụkwọ Abụọma, n’isi nke abụọ sị, “Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 2: 6-7, 8-9, 10-11.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
1. Okwuru sị, “Nke a bụ eze
nke m kwụbara na Zayọn, ugwu nke m dị nsọ.
Aga m ekwupụta iwu nke Onyenweanyị;
n’ihina Onyenweanyị gwara m sị,
Ị bụ nwa m, taata A bụrụla m nna gị.”
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
2. Rịọ m arịrịọ, aga m enye gị mba niile ka ha bụrụ nke gị;
ka akụkụ ụwa niile bụrụ ebe ọchịchị gị.
Ị ga-eji mkpara igwe kụwaa ha,
ma kụrichaa ha dịka ite onye ọkpụ ite.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
3. Ya bụ ugbu a, ụnụ ndị eze, mụtanụ akọ,
ndị ọchịchị nke ụwa, kpacharanụ anya.
Febenụ Yahweh, tụbanụ ya egwu;
maanụ jijiji n’ihu ya, ma susuo ụkwụ ya ọnụ.
Azịza: Ị bụ nwa m. N’ụbọchị taa ka m mụtara gị!”
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ dị mkpa na Kristi ga-ata ahụhụ,
sikwa na ndị nwụrụ anwụ bilie,
wee banye n’ọchịchị nke ebube ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jọn : 14:1-6
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Obi alọla ụnụ mmiri, kwerenụ na Chineke kwerekwanụ na m. N’ụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, agara m agwa ụnụ na m na-aga ịkwadoro ụnụ ebe obibi?
Ọ bụrụ na mụ agaa dozichaara ụnụ ebe obibi, aga m abịaghachi ịkpọrọ ụnụ, ka ebe m nọ bụrụ ebe ụnụ ga-anọ. Ụnụ ma ụzọ ebe m na-ala.” Tọmọs asị ya, “Onyenweanyị, anyị amaghị ebe ị na-ala. Olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?” Jesu sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu