Mọnde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Acts: 11:1-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 42: 2-3:43:3, 4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn: 10: 1-10.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Acts: 11:1-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’oge ahụ, ụmụazụ na ụmụnna n’ime Kristi nọ na Judia niile nụrụ na ọbụladị ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. Mgbe Pita garuru Jerusalem ndị Juu ndị na-ákwádó ka e bie ndị mba ọzọ ugwu, malitere na-ekwutọ ya, na-asị, “Gịnị mere I ji gakwuru ndị ebighị ugwu, soro ha rie nri. Pita kọọrọ ha ihe niile merenụ site na isi mbido: “Anọ m n’obodo Jopa na-ekpe ekpere, hụ ọhụ. Ahụrụ m ihe dịka nnukwu ukwu-akwa nke e jidere n’akụkụ anọ ka o si n’eluigwe gbadata ebe m nọ. Mgbe m lere ya anya nke ọma, ahụrụ m ụmụanụmaanụ dị iche-iche, anụ ọhịa ndị na-eri ibe ha, anụ ndị na-akpụ akpụ, na ụmụnnụnụ dị iche-iche. Anụkwara m otu olu ka ọ na-asị m, “Pita! Bilie, gbuo ma rie” Azara m olu ahụ sị “mba, Onyenweanyị: n’ihi na ihe ọbụla rụrụ arụ ma ọ bụ nke adịghị ọcha ababeghị m n’ọnụ. Ma olu ahụ si n’eluigwe zaghachiri sị, “Ihe ọbụla Chineke mere ka ọ dị ọcha, i nweghị ike ọbụla ịkpọ ya ihe rụrụ arụ.” Ihe a mere ugboro atọ, e bughachikwa ihe ahụ n’eluigwe. N’otu mgbe ahụ, ụmụnwoke atọ ndị e si Sizeria zite ka ha kpọọ m bịaruru n’ụlọ ebe anyị nọ. Mmụọ Nsọ gwara m ka m soro ha gaa, n’akpaghị oke ọbụla.
Mụ na ụmụnna mmadụ isii ndị a soro gaa banye n’ụlọ nwoke ahụ. Ọ kọọrọ anyị otu o si hụ mmụọọma ka ọ kwụ n’ụlọ ya, na-asị, “Ziga ozi na Jopa, ka a kpọtara gị Saịmọn onye a na-akpọkwa Pita. Ọ ga-agwa gị okwu nke Chineke ga-eji zọpụta gị na ezinụụlọ gị niile. Mgbe m malitere ịgwa ha okwu, Mmụọ Nsọ dakwasara ha otu o si dakwasa anyị na mbido. N’oge ahụ echetakwara m ihe Onyenweanyị kwuru, sị, “Jọn ji mmiri mee ụnụ mmirichukwu, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu, Ebe ọ bụ na Chineke enyela ha ụdị onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kwenyere n’Onyenweanyị Jesu Kristi, onye ka m bụ igbochi ọrụ Chineke?”
Oge ha nụrụ ihe ndị a, ha kwụsịrị nkagbu ha na-akagbu Pita, too Chineke sị, “O! Chineke enyekwala ọbụladị ndị mba ọzọ ohere ichegharị nweta ndụ.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 42: 2-3:43:3, 4
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
1. Dịka otu agụụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu ahụ ka agụụ si na-agụ m maka gị, O Chineke m.
Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke,
Chukwu nke ndị dị ndụ,
kedụ oge m ga-enwe ike jee hụ ihu nke Chineke?
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
2. Zipụta ihè Gị na eziokwu Gị ka ha na-edu m,
ka ha dubata m n’ugwu gị dị nsọ,
ebe I jiri mere ebe obibi.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
3. Mgbe ahụ aga m aga n’ebe nchụaja nke Chineke,
Chineke nke bụ añụrị m.
Aga m eji añụrị were ụbọ too gị,
Onyenweanyị, Chineke m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ m nkụ maka Chineke.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
“Abụ m ezigbo onye ncheatụrụ, a maara m atụrụ m, atụrụ m marakwa m.”
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jọn: 10: 1-10.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu kwuru sị: “Eziokwu ka m n’agwa ụnụ, onye ọbụla nke na-anaghị esi n’ọnụụzọ abanye n’ogige atụrụ, nke na-esi n’ebe ọzọ ọnụụzọ na-adịghị bụ onye ohi na onye na-apụnahụ mmadụ ihe n’ike. Onye na-esi n’ọnụụzọ bụ onye ọzụzụ atụrụ. Onye nche ọnụụzọ ogige atụrụ na-emeghere ya ụzọ. Atụrụ ya na-anụ ma marakwa olu ya. Ọ na-akpọkwa atụrụ ya aha wee na-edupụ ha. Mgbe ọ chụpụtachara ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga n’ihu ha, ha ana-eso ya n’azụ, n’ihina ha maara olu ya. Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha ga-agbara ya ọsọ, n’ihina ha amaghị olu ndị ọbịa. Ilu a ka Jesu tụụrụ ha, ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Jesu gwakwara ha ọzọ sị, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, Abụ m ọnụụzọ nke atụrụ. Ndị niile buuru m ụzọ bịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnahụ mmadụ ihe n’ike. N’ihi nke a atụrụ egeghị ha ntị. Abụ m ọnụụzọ ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla esi na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ, na-abatakwa, na-achọtakwa nri ọ ga-eri. Onye ohi na-abịa, naanị ka o zuo, gbuo ma mebiekwa. Abịara m ka ha nwee ndụ ma nwee ya n’uju.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu