Tuzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Act: 4:32-37
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 93: 1, 1-2, 5.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn : 3:7-15
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Act: 4:32-37
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi.
N’oge ahụ, ọha ndị kwere na Kristi jikọrọ ọnụ n’otu mmụọ na n’otu obi, nwekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị onye ọbụla n’ime ha na-asị na ihe ọbụla ya nwere bụ nke naanị ya. Ha ji ike ha niile na-agba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu. Amara nke Chineke pụtakwara ihe n’ahụ ha niile n’ụba n’ụzọ pụrụ iche. Ọ dịghị onye ọbụla n’etiti ha a hapụrụ ka ọ nọdụ n’ụkọ. Ndị nwere ala ubi, ma ọ bụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, dobe ha n’ụkwụ ndị ụmụazụ. Ha na-ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọbụla n’otu n’otu dịka mkpa ya si dị. Otu a ka Josef, bụ onye Levaị, onye amụrụ n’ala Saịprọs, onye ndịozi kpọrọ Banabas nke pụtara: “Nwa nke nkasịobi,” si ree ala ubi weta ego ya dobe n’ụkwụ ndị ụmụazụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 93: 1, 1-2, 5.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
1. Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe;
kere ike n’ukwu ka ajị.
O mere ka ụwa kwụrụ chịm;
nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
2. O mere ka ụwa kwụrụ chịm;
nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya.
Ocheeze gị dị bido na mgbe ochie,
Ị dịrịị tupu e kee ụwa.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
3. Iwu gị niile kwụsiri ike,
ebe obibi gị dị nsọ Onyenweanyị
ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu Kristi, Ị bụ onye akaebe dị ntụkwasịobi, onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta, Ị hụrụ anyị n’anya, were ọbara gị sachapụ njọ anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jọn : 3:7-15
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara Nịkọdemus sị, Ya atụla gị n’anya, na m sị, ‘A ga-amụgharịrị gị ọzọ. Ifufe na-efe ebe ọ bụla ọ sọrọ ya. Ị na-anụ mkpọtụ ya, ma Ị maghị ebe o si abịa na ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dị onye ọbụla amụrụ site na Mmụọ Nsọ.” Nịkọdemus jụrụ ya sị, “Olee otu nke a ga-esi mee?” Jesu jụrụ ya sị, “Ị bụ onye nkuzi Izrel ma Ị maghị ihe ndị a? N’ezie agwa m gị, anyị na-ekwu ihe anyị maara, na-agbakwa akaebe ihe anyị hụrụ, ma ụnụ anaghị anara ịgba akaebe anyị. Ọ bụrụ na I kwereghị mgbe m gwara gị ihe nke ụwa, olee otu Ị ga-esi kwere ma m kọọrọ gị ihe nke eluigwe? O nwebeghị onye ọbụla rịgorola n’eluigwe mbụ ma ọ bụghị naanị Nwa nke mmadụ onye si n’eluigwe rịdata. Dịka Mosis si welie agwọ elu n’ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esi welie Nwa nke mmadụ elu. Ka onye ọbụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebeebe.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu