Tuzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Act : 2:36-41
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 33:4-5, 18-19, 20, 22.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn : 20:11-18.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Act : 2:36-41
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’ụbọchị Pentikọst, Pita gwara ndị Juu sị: “Ya bụ ka ezinụụlọ Izrel niile mazuo na ọ bụ Jesu nke a, onye ụnụ kpọgburu n’obe ka Chineke mere ka ọ bụrụ Onyenweanyị na Kristi anyị.” Mgbe ha nụrụ nke a, ihe a metụrụ ha n’obi. Ha jụrụ Pita na ndịozi ndị ọzọ, “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme?” Pita azaa ha sị, “Chegharịanụ, sinụ na ihe ọjọọ pụta, onye ọbụla n’ime ụnụ n’otu n’otu ka e mee ụnụ mmirichukwu n’aha Jesu Kristi, maka mgbaghara njọ nke ụnụ niile, ụnụ ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. N’ihina ọ bụ ụnụ, na ụmụ ụnụ, na ndị niile nọ n’ebe dị anya, ka nkwa ahụ dịịrị bụ ndị niile Onyenweanyị Chineke na-akpọkọtara onwe ya.” Pita jikwa ogologo okwuchukwu gwasie ọgbakọ ahụ ike na-adụkwa ha ọdụ sị, “Zọpụtanụ onwe ụnụ n’agbụrụ ọjọọ a.” N’ihi nke a, ọtụtụ ndị nabatara okwu ya ka e mere mmirichukwu. N’ụbọchị ahụ ihe dịka puku mmadụ atọ ka agbakwunyere n’ọnụọgụgụ ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 33:4-5, 18-19, 20, 22.
Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị
1. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu,
Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.
Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,
ịhụnanya ya jupụtara n’ụwa.
Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị
2. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya,
ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya.
Ka o wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ
ma chekwaba ha n’oge ụnwụ.
Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị
3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị;
ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị.
Ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ. O Chineke
ebe nchekwube anyị dị na gị.
Azịza: Ụwa jupụtara n’ịhụnaanya nke Onyenweanyị
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị, ka obi dị anyị ụtọ na ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Jọn : 20:11-18.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Meri kwụ n’akụkụ ili ahụ, na ebe akwa. Ka ọ na-ebe akwa, o hulatara ala leba anya n’ime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị Mmụọọma abụọ yi akwa ọcha, ka ha nọdụrụ ala, otu n’isi, nke ọzọ n’ụkwụ, n’ebe ahụ a tọgbọrọ ozu Jesu.
Ha jụrụ ya sị, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa?” Ọ zara ha sị, “Ha ebupụla Onyenwe m, ma amaghị m ebe ha dọbara ya.” Mgbe o kwuchara nke a, Ọ tụgharịrị hụ Jesu ka ọ kwụ. Ma ọ maghị na ọ bụ Jesu. Jesu sịrị ya, “Nwaanyị, gịnị mere I ji ebe akwa? Onye ka Ị na- achọ?” Nwaanyị ahụ chere na ọ bụ onye ọrụ ubi wee jụọ ya sị, “Nnamukwu, ọ bụrụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe I dobere ya, ka m ga buru ya.” Jesu akpọọ ya sị, “Meri!” Nwaanyị ahụ atụgharịa, zaa ya na Hibru sị “Raboni! Nke pụtara “Onye nkuzi”. Jesu gwara ya sị, “E metụkwala m aka, n’ihina arịgokwubeghị m Nna m. Gakwuru ụmụnna m gwa ha sị, Ana m alakwuru Nna m na Nna ụnụ, Chukwu m na Chukwu ụnụ.” Meri Magdalin bịara gwa ndị na-eso ụzọ Jesu sị,” Ahụla m Onyenweanyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ gwara ya ihe ndị a.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu