Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 42:1-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 27: 1, 2, 3, 13-14.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn: 12:1-11.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Is: 42:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Nke a bụ nwodibo m onye m ji eme ọnụ, onye m họọrọ, onye ihe ya na-amasị m. Etinyela m mmụọ m n’ime ya. Ọ ga-ewetara mba niile ikpe nkwụmọtọ. Ọ gaghị eti mkpu, ma ọ bụ kwusie okwu ike, a gaghị anụ olu ya n’okporo ụzọ. Ọ gaghị agbaji osisi na-esighị ike, ma ọ bụ menyụọ ọkụ na-achọ ịnyụ anyụ. Ọ ga-akwụdosike n’iweta ikpe nkwụmọtọ. Ike agaghị agwụ ya, ọ gaghị adakwa mba ruo mgbe ọ ga-akwụwa ikpe nkwụmọtọ n’elu n’ụwa. Mba niile bi n’akụkụ osimiri ga-echere nkuzi ya. Nke a ka Osebụrụwa Chineke kwuru: onye kere eluigwe gbasaa ya, kekwa ụwa na ihe niile dị n’ime ya, onye nyere mmadụ niile bi na ya ndụ, tinyekwa mmụọ n’ihe niile na-agagharị na ya.
Mụ onwe m bụ Yahweh, akpọọla m ụnụ ka ụnụ bụrụ ndị eziomume. Esekpụụrụ m ụnụ n’aka nye ụnụ ọnọdụ. Ụnụ abụrụla ihe ọgbụgbandụ mụ na ndị mmadụ ihe nke mba niile. Ụnụ ga-eme ka ndị kpuru isi hụkwa ụzọ, mee ka ndị eji eji nwere onwe ha, mee ka ndị nọ n’ọchịchịrị nweta ihe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27: 1, 2, 3, 13-14.
Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu?
Dinwenụ bụ ide nke ndụ m,
onye ga-eyi m egwu!
Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
2. Mgbe ndị ajọomume na-achụ m,
ka ha dọrie anụ ahụ m,
Ọ bụ ha ndịiro m,
bụ ndị ga-akpọbi ụkwụ, daa.
Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
3. Ọ bụrụgodụ na igwe ndị agha agbaa m gburugburu.
Egwu ọbụla agaghị atụ m
Ọbụladị na e busoro m agha,
okwukwe m ka siri ike.
Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
4. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke,
n’ala ndị dị ndụ,
Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike;
tụkwasị ya obi, chekwube na ya.
Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.
MBEKU:
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Ka anyị toonụ Onyenweanyị, Ọ na-agbaghara njọ ndị nke ya.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – Jọn: 12:1-11.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Ka Emume Ngabiga fọdụrụ mkpụrụ ụbọchị isii, Jesu gara Betani obodo nke Lazụrọs bụ onye Jesu mere ka o si n’ọnwụ bilie. Ha siiri ya nri anyasị n’ebe ahụ. Mata nọ na-eje ozi, ebe Lazụrọs so n’otu n’ime ndị ha na Jesu nọ na-eri nri. Meri weere otu mkpọ ude na-esi isiọma, nke dara oke ọnụ, nke e ji ezi Naad mee, tee n’ụkwụ Jesu werekwa ntụtụisi ya hicha ya. Isi ude ahụ jupụtara n’ụlọ ha nọ n’ime ya. Ma Judas Iskarịọt, otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye kwuru sị, “Gịnị mere e reghị ude a narị atọ, were ego ya nye ụmụ ogbenye?” Nke a ka o kwuru, ọ bụghị maka na-ọkpọrọ ndị ogbenye ihe, kama n’ihi na ọ bụ onye ohi. Dịka onye na-ejide akpa ego nke ndị otu, ọ na-ewebiri ihe e tinyere n’ime akpa ego ahụ. Jesu sịrị, “Hapụnụ nwaanyị a, ka o dobe ya maka ụbọchị olili m. Ụnụ na ndị ogbenye nọ mgbe ọbụla, ma mụ na ụnụ anọghị n’ụdị a mgbe ọbụla.” Mgbe ọtụtụ ndị Juu nụrụ na Jesu nọ na Betani, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ Jesu, kama ka ha hụkwuo Lazụrọs, onye o mere ka o si n’ọnwụ bilie. Nke a mere ndị isi nchụaja ji gbaa izu ka ha gbukwuo Lazụrọs. N’ihi na ọ bụ n’ihi Lazụrọs ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ndị ndu ha, na-ekwerekwa na Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu