Fraịde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer: 20:10-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 18:2-3, 3-4, 5-6, 7.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn: 10:31-42.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Jer: 20:10-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Jeremaya
Ana m anụ ntamu, nsogbu nọgidere m n’akụkụ niile. Ka anyị jụnụ ya, ka anyị jụ ya bụ ihe ndị enyi m niile na-ekwu, ndị nke na-achọ nsogbu m na ọdịda m.“E nwere ike anyị aghọgbuo ya, merie ya, ma megwarakwa ya.” Ma Chineke nọnyere m mgbe niile dịka n’agha, ya mere, ndịiro m ga-adasị, ha agaghị emerikwa m ọzọ, ihere ga emegbu ha, ma ha agaghị emerikwa.A gaghị echefukwa ihere ha. O Yahweh nke igwe ndị agha, onye na-ekpe ikpe nkwụmọtọ, onye na-ahụzu obi na echiche mmadụ mee ka m hụ ọbọ ị ga-abọtara m n’isi ha, maka na ọ bụ n’aka gị ka m tinyere ihe niile.Kweere Yahweh ukwe, nye ya otito! Maka na ọ zọpụtala ndụ nke onye ahụ nọ na mkpa n’aka ndị omenjọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 18:2-3, 3-4, 5-6, 7.
Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
1. Ahụrụ m gị n’anya Osebụrụwa, gị bụ ike m.
Osebụrụwa bụ nkume m,
na ebe nkwụdosike m, onye ogbugbo m.
Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
2. Onye nzọpụta m bụ Chineke m,
Onye ogbugbo m,
Ebe nchedo m na ebe mgbaba m,
Osebụrụwa kwesịrị inye otito,
N’ihi na-akpọrọ m ya,
Ọ zọpụtara m n’aka ndịiro m.
Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
3. Eriri nke ọnwụ agbaala m okirikiri,
Ajọomume ndị mmadụ na-akpagbu m,
Eriri nke ala mmụọ ekedosielam ike,
Ejila ọnwụ kweere m ọnya.
Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
4. Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ nsogbu,
bekuere Chineke m akwa enyemaka,
O si n’ụlọnsọ ya wee nụ olu m,
Mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
Azịza: Akpọkuru m Osebụrụwa mgbe m nọ na nsogbu, mkpu akwa m wee ruo ya ntị.
MBEKU
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Mkpụrụ ahụ bụ okwu nke Yahweh, Kristi bụ onye na-agha mkpụrụ,
onye ọbụla bịakwutere ya ga-adị ndụ ebeebe.
Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – Jn: 10:31-42.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe ndị Juu tụtụkwaara okwute ọzọ ka ha tụọ ya, Jesu gwara ha sị, “Ezila m ụnụ ọtụtụ ezi ọrụ nke sitere n’aka Nna m. Olee nke ọ bụ n’ime ndị a ka ụnụ ga-eji tụọ m okwute?”Ndị Juu azaa ya sị, “Anyị anaghị atụ gị okwute n’ihi ezi ọrụ gị kama n’ihi nkwulu nke i na-ekwulu Chukwu; Ị bụ naanị mmadụ nkịtị, ma ị na-eme onwe gị Chineke!” Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na-edeghị ya n’iwu ụnụ sị, ‘Ekwuru m, ụnụ bụ chi.’ Anyị makwa na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ enweghị mgbanwe. Ndị Chineke zitere okwu ya ka ọkpọrọ ndị bụ chi. Ụnụ na-asị na onye Chineke doro nsọ wee zite n’ime ụwa, na-ekwulu Chineke n’ihina ọ sị, ‘Abụ m nwa Chineke’ Ọ bụrụ na m anaghị arụ ọrụ nna m, ụnụ ekwela na m. Ma ọ bụrụ na m, na- arụ ha, ọ bụladị na a sị na ụnụ ekweghị na m, kwerenụ n’ọrụ ndị a, ka ụnụ wee mata ma ghọta nke ọma na Nna m bi n’ime m, m biri n’ime Nna. Ha chọkwara ijide ya ọzọ, ma o siri n’aka ha mịpụ. Jesu laghachiri azụ ọzọ, n’ofe osimiri Jọdan n’ebe Jọn na-eme mmirichukwu na mbụ, Ọ nọgidere ebe ahụ.Ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya, na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ebube ma ihe niile o kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu. Ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ kwenyere na ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu