Tọọzde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gen: 17:3-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 105:4-5, 6-7, 8-9.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn: 8:51-59.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Gen: 17:3-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbido (Jenesis)
Mgbe Abram kpọrọ isi ala nye Chineke, Chineke wee gwa ya okwu ndị a sị, “Lee nke a bụ ọgbụgbandụ mụ na gị: ị ga-abụ nna nke ọtụtụ mba. A gaghị akpọkwa gị Abram ọzọ; aha gị ga- abụ Abraham n’ihi na ana m eme gị ka ị bụrụ nna nke ọtụtụ mba. Aga m eme gị ka ị mụọ ụmụ nke ukwu. Aga m esi na gị nweta mba dị iche-iche, ụmụ gị ga-abụ ndịeze. Aga m eme ka ọgbụgbandụ mụ na gị rute ụmụụmụ gị ndị ga-esochi gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ, dịka ọgbụgbandụ dị ebeebe, ịbụ Chineke gị na Chineke nke ụmụụmụ gị ndị ga-esochi. Aga m enye gị na ụmụụmụ gị ala ebe a I bi ugbu a, ala Kenaan ahụ niile, ka ụnụ ga-enwere ebeebe; aga m abụkwa Chineke ụnụ “Chineke gwakwara Abraham sị, “N’akụkụ nke gị, ị ga-edoberịrị ọgbụgbandụ m, gị na ụmụụmụ gị ndị ga-esochi gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:4-5, 6-7, 8-9.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
1. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya,
chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile,
Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
2. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị.
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
3. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebebe,
Iwu nke o tiri puku agbụrụ gara aga,
Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara,
na iyi nke ọñụụrụ Aịzik.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
MBEKU
Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka ụnụ wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndị agha wee nọnyere ụnụ.
Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – Jọn: 8:51-59.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị Juu sị: N’ịgwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ma ọlị.” Ndị Juu gwara ya sị, “Ugbu a, o weela anyị anya na mmụọ ọjọọ bi n’ime gị. Abraham na ndị amụma mechara nwụọ, ma ugbu a ị na-ekwu sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla edebe okwu m, ọ gaghị edetu ọnwụ ire ma ọlị. Ị karịrị nna anyị Abraham, onye nwụrụ anwụ? Ndị amụma nwụkwara anwụ Onyedị ka ị na-eche na ị bụ?” Jesu agwa ha sị, “Ọ bụrụ na m enye onwe m otito, otito nke m bụ ihe efu, onye na-enye m otito bụ Nna m, onye ụnụ na-asị na ọ bụ Chineke ụnụ. Ụnụ amatabeghị ya; ama m ya. Ọ bụrụ na m sị na amaghị m ya, aga m abụ onye asị dịka ụnụ, kama, ama m ya, na-edebekwa okwu ya. Abraham nna ụnụ ñụrịrị ịhụ ụbọchị m, Ọ hụrụ ya wee ñụrịa.” Ndị Juu wee sị ya, “I rubeghị iri afọ ise wee hụla Abraham?” N’ezie, n’ezie, agwa m ụnụ, “Tupu Abraham adị, anọ m.” Ha weere okwute ka ha tụọ ya, ma Jesu zoro onwe ya wee pụọ n’ụlọnsọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu