Tuzdee nke izu ụka ise nke Lent

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Numbers: 21:4-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 102:2-3, 16-18, 19-21
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn: 8:21-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Numbers: 21:4-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onu ogugu
Umu Israel si n'ugwu Hoa bulie ije n'uzọ Oké Osimiri Uhie, igabiga ala Edom. Ma mb͕e ntachi-obi-ha gwusiri n'ije ahu, ndi Israel we tamu ntamu megide Chineke na Moses, si , Gini mere unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu a n'ọzara nka, ebe ihe- oriri na miri nādighi? Jehova we zite agwọ ahu n'etiti ndi Israel, we ta ndi Israel aru, ewe nwua. Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo n'i tamu ntamu megide Jehova, na gi onwe-gi: kpenu Jehova ka O napu ayi agwọ ahu. Moses we kpere ekpere bayere ndi Israel, Jehova we si Moses, Mere onwe-ya sarafu, wukwasi ya n'osisi : ma onye ọ bula nke nēle ya anya mb͕e atasiri ya gādi ndu. Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'osisi: ma mb͕e ọ bula onye agwọ tara aru legidere agwọ ọla ahu anya, ọ di ndu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps: 102:2-3, 16-18, 19-21
Azịza: Onyeweanyi, nuru ekperem, ka nkpu akwa m ruo gi nti.
1. Jehova, nuru ekperem,
ka iti-nkpum biakute Gi.
Ezonahụla m iru gị
n'ụbọchị ahụhụ m.
Tọ nti-gi n'ala nyem;
n'ubọchi m'nākpọ, zam ọsọsọ.
Azịza: Onyeweanyi, nuru ekperem, ka nkpu akwa m ruo gi nti.
2. Mba nile gātu egwu aha-Gi, Jehova,
na ndi-eze nile nke uwa ebube-Gi,
mb͕e Jehova wughachiworo Zaion
, hu kwa anya n'ebube-Ya;
Mb͕e Ọ nēlekwasi ekpere ndi-ob͕eye anya,
Ọ we leda ekpere-ha anya.
Azịza: Onyeweanyi, nuru ekperem, ka nkpu akwa m ruo gi nti.
3. Ka e dee ihe a n’ọgbọ na-abịa,
ka ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu too Jehova:
“Jehova si n’ebe dị nsọ ya dị elu ledara anya,
O sikwa n’eluigwe legide ụwa anya,
ka o wee nụ ịsụ ude nke ndị mkpọrọ,
ka Ọ hapụ ndị a ga-anwụ anwụ. "
Azịza: Onyeweanyi, nuru ekperem, ka nkpu akwa m ruo gi nti.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Nkpuru ahu bu okwu Chineke, Kraist bu onye-agha;
ndi nile nābiakute Ya gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
Alleluia
OZIỌMA : Jọn: 8:21-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jizọs gwara ndị Farisii, sị: “Ana m ala, unu ga-achọkwa m, ma unu ga-anwụ ná mmehie unu. Ebe m na-aga, unu apụghị ịbịa.” Ya mere ndi-Ju siri, Ọ gaghi-egbu onwe-ya, ọ̀ bu, n'ihi na ọ siri, Ebe M'nāla, unu apụghị ibia? Ọ si ha, Unu onwe-unu bu nke di n'okpuru, Mu onwem bu nke di n'elu: unu onwe-unu bu nke uwa, ma esiteghm n'uwa nka: n'ihi nka ka M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu : ọ bụrụ na unu ekwetaghị na mụ onwe unu, unu ga-anwụ ná mmehie unu.” Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? Jisus siri ha, Ihe M'gwaworo unu site na mbu, enwerem ọtutu okwu bayere unu n'amam-ikpe: ma Onye ziterem bu onye ezi-okwu, ihe Mu onwem nuru n'ọnu-Ya ka M'nāgwa kwa uwa. Ha aghọtaghị na ọ na-agwa ha banyere Nna. Ya mere Jisus siri ha, Mb͕e unu nēbuli Nwa nke madu, mb͕e ahu unu gāmara na Mu onwem bu, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama Mu onwem nēkwu nání ihe Nnam kuzirim: Onye ziterem nọyere Ya . Ọ hapụbeghị naanị m, n'ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile. Ebe ọ bụ na o kwuru otú a, ọtụtụ ndị kweere na ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu