Sonde Izu nke ise n’oge ncheta ahuhu Kristi : Psalter Week 1 Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 43: 1621
-
Abụọma na azịza ya
Ps 126: 12, 23, 45, 6 (3)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Phil 3: 814
- OziọmaJn 8:111
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Is 43: 1621
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Otu a ka Chineke siri kwuo, onye naawa ụzọ n’ime mmiri, tinyekwa okporo ụzọ n’ime osimiri, onye naeduputa ugbojinya na inyinya, na ndị dike n’agha; kutuo ha n’ala nke na ha enweghi ike ikuli ọzọ. A gaemenyu ha, pinyuo ha dịka oku. Ọ baghi uru icheta ihe ndị a gara aga, ma ọ bụ tughariba uche n’ihe ndị mere na mbu. Lee, ana m eme ihe ọhụrụ; ugbu a, o chawaputala, ọ bụ na unu ahughị ya? Aga m awa ụzọ n’ime ikpa, mee ka mmiri dịrị n'ime ozara. Anụ ọhịa niile gaasopuru m, ma nkịta ọhịa ma enyi nnụnụ, maka na emeela m ka mmiri dịrị n'ikpa, osimiri dirikwa n'ime ozara, ka ndị m, ndị m hoorola nwee mmiri ọnwụnụ. Ha bụ ndị m họọrọ ka ha buru ndị nke m, ka ha were kwupụta ọ̀tọ m.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 126: 12, 23, 45, 6 (3)
Azịza: Leenu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị, n’ezie obi dị anyị uto.
1. Mgbe Onyenweanyi zoputara Zayon n’ọnọdụ igba ohu,
ọ dị ka ihe mere na nro. Mgbe ahụ ka ọnụọgụ anyị bụ so ọchị;
egbugbere ọnụọgụ anyị aburu so ukwe.
Azịza: Leenu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị, n’ezie obi dị anyị uto.
2. Ndị ogommụo n’onwe ha naasi:
Leenu oru ebube Dinwenu ruru ha!
Leekwanu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị.
N’ezie, obi dị anyị uto.
Azịza: Leenu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị, n’ezie obi dị anyị uto.
3. Onyenweanyi, zoputa anyị n’ọnọdụ igba ohu
dị ka mmiri naasọ si eme n’ala kporo nku.
Ndị bụ anya mmiri naakụ mkpuru ihe gaejiri ọnụọgụ naaghọ ha.
Azịza: Leenu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị, n’ezie obi dị anyị uto.
4. Ha bụ anya mmiri, buru mkpuru ihe ha gaakụ naeje n’ubi:
ha naekwe ukwe mgbe ha naalota, buruchaa iheowuweubi ha.
Azịza: Leenu oru ebube Onyenweanyi ruru anyị, n’ezie obi dị anyị uto.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : Phil 3: 814
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Filipians
N’eziokwu, ewere m ihe niile ka ihe lara n’iyi n’ihi oke uru ọ bara imata Jesu Kristi Dinwenu. N’ihi ya, anarala m ahụhụ nke itufu ihe niile m nwere, were ha dịka ihe abụghị uru, ka m wee rite Kristi n’uru na ka e wee hu m n'ime ya. Enweghi m eziomume nke aka m, nke dabeere n’iwu, kama Ọ bụ nke sitere n’okwukwe na Kristi, eziomume si na Chineke nke dabeere n’okwukwe. Nke a bụ ka m wee nwee ike imata ya, na ike nke mbilite n’onwu ya. Ka m nwee ike isoro ya keta oke n’ahụhụ ya, wee yie ya n’onwu ya. Ọ bụrụ na Q gaekwe omume, ka m nwee ike ruo na mbilite n’onwu. Ọ bụghị na m enwetala nke a, ma ọ bụ na m ezuola oke, kama, ana m agba mbo ka ọ buru nke m n’ihina Jesu Kristi emeela ka m buru nke ya. Ụmụnne m, anaghị m eche na m emeela ya ka ọ buru nke m. Mana otu ihe ka m naeme ugbu a, ana m echefu ihe gara aga, naagbasi mbo ike maka ihe dị n’ihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji ruo n’isi, maka irite ihe ahụ a naagbata n’sọ, bụ okpukpo ibanye na ndu eluigwe ahụ nke Chineke kporo anyị site na Jesu Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Dinwenu naekwu ugbu a si:
Loghachinu azụ.
Werenu obi unu niile biakwute m
n’ihi na abụ m so ebere na jhụnanya.
Alleluia
OZIỌMA : Jn 8:111
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jon dere
Jesu gabara n’ugwu Oliv, n’isi ụtụtụ, ọ biakwara ọzọ n’ụlọ nsọ. Mmadụ niile biakwutere ya, o doo ala kuziere ha ihe. Ndi odeakwụkwọ na ndi Farisii kputara otu nwaanyị e jidere ebe ọ naakwa iko, kwuba ya ọtọ n’etiti mmadụ niile. Ha siri ya, "Onyenkuzi, e jidere nwaanyị a ebe ọ naakwa iko. Iwu Mọses nyere anyị ikike ka e were okwute tụọ onye mere ihe dị otu a. Kedu ihe i kwuru maka nwaanyị a?" Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha gaeji bo ya ebubo. Jesu hulatara ala, were mkpịsị aka ya debe ihe n’ala. Ka ha nọgidere naajụ ya ajụjụ, Jesu hulitere gwa ha si, "Onye obula n’ime unu nke naemehịbeghị mbụ buru ụzọ tụọ nwaanyị a okwute." Ọ hụrụ takwara ọzọ, were mkpịsị aka ya debe ihe n’ala. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile malitere puba n'otu n'otu, bido na ndị kacha okenye. Ha hapụziri Jesu na nwaanyị ahụ kwụ n’ihu ya. Jesu welitere anya elu juo ya si, "Nwaanyị, olee ebe ha nọ? Ọ bụ na ọ nweghi onye mara gị ikpe?" Nwaanyị ahụ zara si ya, "Ọ dịghị onye obula, Onyenweanyi." Jesu wee si, "Ma onwe m amachikwa gị ikpe, gaba, emekwala njọ ọzọ."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu