Satode Izu uka nke ano n’oge ncheta ahuhu Kristi, Vincent Ferrer Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer 11: 1820
-
Abụọma na azịza ya
Ps 7: 23, 9bc10, 1112
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn 7:4053
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Jer 11: 1820
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jeremaya
Yahweh mere ka m mara maka ọnyà ha naekwere m; nke mere na o gosiri m ihe ọjọọ niile ha mere. Adi m ka nwaaturu akpu aga igbu egbu, mana amaghi m na o bu m ka ha naagbara izu ọchọọ naasi, "Ka anyi mebie osisi ahụ na mkpuru ya; ka anyi gbupu ya n’ala ndị di ndu, ka a hapu icheta aha ya ọzọ." Kama Chineke ji ike niile, onye naekpe ikpe ziri ezi, onye naenyocha uche na obi, mee ka m hu iwe gị n'ebe ha no, maka na ọ bụ na gị ka m tukwasara obi m.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 7: 23, 9bc10, 1112
Azịza: Onyenweanyi na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
1. Onyenweanyi na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
Zoputa m n'aka ndị naesogbu m.
I meghi otu a, ha gaadogbu m dika agu dorichaa m ebe o nweghi onye gaazoputa m.
Azịza: Onyenweanyi na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
2. Kpee m ikpe, Onyenweanyi,
Dikaa eziomume m na ugwu m si di.
Bibie ajọ echiche ndị ajọ mmadụ niile.
Mee ka onye eziokwu kwusie ike,
Ngi Chineke nke ikpe nkwumoto,
onye naenyocha ime mmụọ na mkpụrụobi.
Azịza: Onyenweanyi na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
3. Chineke bụ uta nke naechedo m,
o naechekwa ndị obi ha kwu ọtọ.
Chineke bụ onye ikpe nkwumoto;
O naghi ewe iwe ọsọsọ.
Mana Ọ by Chineke naewesara ndị niile juru ncheghari iwe mgbe ọ bụla.
Azịza: Onyenweanyi na Chineke m, ana m agbaba na nchedo gị.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
unu agbachila obi unu.
Alleluia
OZIỌMA : Jn 7:4053
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jon dere
Mgbe ha nụrụ okwu ndị a, ufodu ndị mmadụ kwuru si, "Onye a bụ onye amuma ahụ n’ezie." Ndị ọzọ siri, "Onye a bụ Kristi ahụ." Ma ufodu juru si, "Kristi ahụ o gaesi na Galili pụta? Ọ bụ na Akwụkwọ Nso ekwughi na Kristi gaesi n’agburu David pụta; na ọ gaesi na Betlehem bụ onumara David?" Nke a mere nkewa jiri dapụta n'etiti ndị mmadụ banyere ya. Ufodu choro ijide ya, ma o nweghi onye obula meturu ya aka. Ndi nche laghachikwuuru ndiisi nchuaja na ndi Farisii, ndi juru ha si, "Gini mere unu akputaghi ya?" Ndi nche ahụ zara ha si, "O dibeghi onye kwuru okwu di ka nwoke a!" Ndi Farisii ahụ juru ha si, "E duhiekwuola unu onwe unu ụzọ? O dila onye obula n'ime ndjisi mobu n'ime ndi Farisii kwere na ya? Mana igwe mmadụ a bụ ndị naamaghị iwu bụ ndị a buru onu." Nikodemus, otu onye n'ime ha bụ onye biakwutere Jesu na mbu gwara ha si, "Iwu anyị o naama mmadụ ikpe n’ebughi ụzọ nu olu ya wee mata ihe o mere?" Ha zaghachiri ya si, "Ị bụkwu onye Galili? Nyochaa Akwụkwọ Nso, ị gaachọpụta na ọ nweghi onye amuma gaesi na Galili pụta." Onye obula n’ime ha labara n’ụlọ ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu