Fraide Izu uka nke ano n’oge ncheta ahuhu Kristi, Isidore of Seville Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Wis 2: 1a, 1222
-
Abụọma na azịza ya
Ps 34: 1718, 1920, 21 and 23
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn 7: 12, 10, 2530
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Wis 2: 1a, 1222
he Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
N’ihina ha naeche echiche n’uzo n’ezighi ezi, ha naagwa onwe ha si, "Ndu anyi di nkenke, bja juputa n’uru, mgbe ndu a gwuchara, o gaghi ekwe mmezi ozo; nke ozo, o nwebeghi onye siri n’ala mmuo laghachi azu. Ngwanu ka anyi cherenụ ezigbo mmadu n’ihina o naakpasu anyi iwe, naemegide usoro anyi si ebi ndu, naeche anyi mmehie anyi n’ihu, n’ihina anyi naemebi iwu, naata anyi uta na anyi anaghi eso usoro ndu e jiri zọpụta anyi. O naegosi na ya maara Chineke, bia naakpo onwe ya nwa nke Yahweh. O kwuchiiri anyi uzo, buru ihe uta n'ebe usoro anyi si ebi ndu. Naanị ihụ ya anya naeme ka obi juo anyi oyi. Uzo ndu ya adighi ka nke ndí ọzọ, uzo o si ebi ndu dị iche na nke ndí ọzọ. O naeleda anyi anya dika ihe ruruaru naasokwa uzo anyi si ebi ndu. O naakowaputa na njedebe ndu onye eziomume bụ anuri; naetu onu na Chineke bụ nna ya. Ka anyi nwakelenu ya, mara ma ihe o naekwu bụ eziokwu. Ka anyi hu ka njedebe ndu ya gaadi. O buru na onye eziomume bu nwa nke Chineke n’ezie, Chineke n’onwe ya gaenyere ya aka, ma zoputa ya n’onya nile nke ndí iro ya. Ka anyi werenu imesi ike na ahuhu nwalee ya, ka anyi chọputa udi umeala ya nke a, ka anyi tinyenu ndidi ya n'ime onwunwa. Ka anyi manu ya ikpe onwu ihere, ebe o bu na o kwuru na a gaechekwaba ya." Otu a ka ha si eche echiche, kama echiche ha ezighi ezi. Omume ojoo ha mechiri ha anya. Ha enwekwaghi ike imata ihe nzuzo niile nke Chineke, mobu hu ugwo dijiri ibi ndu di aso. Mobu kwenye na ugwo mmuo naenweghi ntupo naerite.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 34: 1718, 1920, 21 and 23
Azịza: Onyenweanyi naano ndi obi loghara elogha nso.
1. Onyenweanyi naagbaru ihu n'ebe ndi ajo omume no,
O naeme ka a ghara ichetakwa ha n'uwa.
Ndi eziomume kpokuru Onyenweanyi, o za ha,
wee zoputa ha na nsogbu ha niile.
Azịza: Onyenweanyi naano ndi obi loghara elogha nso.
2. Onyenweanyi naano ndi obi loghara elogha nso,
naenyere ndi dara mba na mmuo aka.
O bu eziokwu na nsogbu onye eziomume kariri akari,
mana Onyenweanyi naesi na ha niile zoputa ya.
Azịza: Onyenweanyi naano ndi obi loghara elogha nso.
3. O naechekwaba okpukpu ya niile;
o nweghi nke obula n'ime ha gaagbaji agbaji.
Onyenweanyi naazoputa ndu ndi odibo ya,
ndi niile gbabara na ya agaghi akwu ugwo obula.
Azịza: Onyenweanyi naano ndi obi loghara elogha nso.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otu a,
nke na o nyere so otu nwa ya nke kwere na ya ghara ila n'iyi.
Alleluia
OZIỌMA : Jn 7: 12, 10, 2530
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jon dere
Mgbe nke a gachara, Jesu gaghariri na Galili. Ọ chọghị igaghari na Judia n’ihina ndiisi ndi Juu naacho uzo igbu ya. Emume Tabanakul ndi Juu adila nso. Mgbe umunne ya jebechara Jerusalem maka Emume ahu, Jesu n'onwe ya jebekwara. Ọ meghi ka ndi mmadu mara, kama o jebere na nzuzo. Ufodu n'ime ndi obodo Jerusalem naaju si, "O bughi nwoke a bu onye ha naacho igbu? Lee ebe o no naekwu okwu n'ihu oha ma o dighi ihe obula ha siri ya. O gaabụ na ndiisi amarala n'eziokwu na onye a bu Kristi ahu? Ma otu o di, anyi ma ebe nwoke a si puta, ma mgbe Kristi gaabia o dighi onye gaama ebe o si puta." Jesu wee kwuwaputa, mgbe o naakuzi nkuzi n'ulonso si: "Unu ma m, marakwa ebe m si puta? Abjaghi m n'ike aka m, onye nke zitere m bu onye eziokwu ahu, unu amaghi onye o bu. Mu onwe m ma ya, n'ihina esi m na ya bia, O bu ya onwe ya zitere m."Ha choro ijide ya, ma o dighi onye obula meturu ya aka n'ihina oge ya erubeghi.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu