Tọọzde Izu Uka Nke Anọ N’Oge Ncheta Ahụhụ Kraịst : Richard of Chichester Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ex 32: 714
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 106: 1920, 2122, 23
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJọn 5:3147
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Ex 32: 714
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Opupu
Yahweh wee sị Mosis, "Gbadaba n'ihina ndị ahụ ị si n'ala Ịjipt duputa emeruola onwe ha. Ha ejehiela ụzọ naenweghị oge ọbụla, hapụziri ụzọ ahụ m tụziiri ha aka; ha akpụọla onwe ha nwa ehi, naakpọ ya chi, naachụkwa ya aja naasi, 'Izrel, lee chi unu bụ nke siri n'ala Ịjipt kpụpụta unu.'" Yahweh sikwara Mosis, "Ahụla m ụmụ Izrel, mara kwanu na ha bụ ndị isiike. Ugbu a, hapụzie m ka iwe m dị ọkụ rie ha n'ụba; m gaeme ka gị onwe gị bụrụ nnukwu mba." Ma Mosis rịọrọ Yahweh Chineke sị, "O Yahweh, gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ n'ebe ndị nke gị ị jiri ike aka gị dị egwu kpụpụta n'ala Ịjipt nọ? Maka gịnị ka ndị Ịjipt gaeji kwuo, sị, 'Ahaa, ọ bụ maka ihe ọjọọ ọ buru n'obi ka ọ jiri rapụta ha n'elu ugwu iji gbuo ha werekwa ọkụ rie ha n'elu ụwa?' Biko ka iwe gị dị ọkụ dị oyi, ka ị ghara ime ndị nke gị ihe ọjọọ nke a. Chetakwa ndị odibo gị Abraham, Aịzik na Izrel bụ ndị i jiri onwe gị nọoro iyi, sị, 'Aga m amụba ụmụ unu ka ha dị ka kpakpando nke igwe ma nyekwa ha ala niile a m kwere na nkwa ka ọ bụrụ nke ha mgbe ebighị ebi.'" Nke a mere ka Yahweh tụgharịa uche ya, chefuo ihe ọ chọrọ ime ndị nke ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps: 106: 1920, 2122, 23
Azịza: Cheta mụ, Ọsebụrụwa! N'ihi ịhụnanya i nwere n'ebe ndị nke gị nọ.
1. Ha kpụrụ nwa ehi na Horeb.
Ha kpọọ isiala nye arụsị a pịrị apị,
si otu a were ebube na otito dịịrị Chineke nye onyinyo ehi naata ahịhịa.
Azịza: Cheta mụ, Ọsebụrụwa! N'ihi ịhụnanya i nwere n'ebe ndị nke gị nọ.
2. Ha chefuru Chineke nke zọpụtara ha onye nke rụrụ ọrụ dị egwu n'ala Ịjipt.
Onye nke rụrụ ọrụ ịtụnanya n'ala Ịjipt,
na ihe naatụ egwu n'osimiri uhie.
Azịza: Cheta mụ, Ọsebụrụwa! N'ihi ịhụnanya i nwere n'ebe ndị nke gị nọ.
3. Ya mere o jiri chee echiche ikpochapụ ha,
ọ gara eme nke a, ma a sị na Mosis
onye nke o họtara anọghị n'etiti ha wee meda iwe ya dị ọkụ.
Azịza: Cheta mụ, Ọsebụrụwa! N'ihi ịhụnanya i nwere n'ebe ndị nke gị nọ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
“Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke,
Jisọs bụ ogha mkpụrụ,
onye ọbụla bịakwutere m gaadị ndụ ebighị ebi.”
Alleluia
OZIỌMA : Jọn 5:3147
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jisọs gwara ndị Juu sị, “Ọ bụrụ na m naagbara onwe m akaebe, ihe m naekwu abụghị eziokwu. Ọ dị onye ọzọ nke naagbara m akaebe, amakwakwa m na akaebe ọ naagba banyere m bụ eziokwu. Unu zigaara Jọn ndịozi, o wee gbaara eziokwu ahụ akaebe. Ọ bụghị na akaebe ahụ a naagbara m sitere n'aka mmadụ, kama ana m agwa unu ihe ndị a ka e wee zọpụta unu. Jọn dị ka mpanaka nke a munyere naenwu, naamụkwa. Unu chọkwara ịnụrị ọṅụ n'ọkụ ya nwa ntakịrị oge. Ma akaebe nke m nwere karịrị nke Jọn gbaara m, n'ihi na ọrụ niile m naarụ bụ ọrụ Nna m nyere m ka m rụọ, bụ ihe naagbara m akaebe, naegosikwa na Nna m zitere m. Nna onwe ya, onye nke zitere m, naagbakwa m akaebe. Unu anụbeghị olu ya, nke unu naahụghị oyiyi ya. Unu anaghikwa edobe okwu ya n'ime unu, n'ihi na unu ekwenyeghị na onye ahụ nke o zitere. Unu naenyocha ihe e dere n'Akwụkwọ Nsọ n'ihi na unu naeche na unu gaesite na ha nweta ndụ ebeebe, ma ọ bụ ha naagbara m akaebe. N'agbanyeghị nke a, unu achọghị ibịakwute m ka unu wee nwee ndụ. Anaghị m anata otito nke mmadụ. Amarala m na unu enweghị ịhụnanya nke Chineke n'ime unu. Abiara m n'aha nke Nna m, unu anabataghi m, ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa n'aha nke aka ya, unu gaanabata ya. Olee otú unu gaesi kweere, unu ndị ọ naatọ ụtọ ịnara otito nke mmadụ ibe unu, ma unu anaghị agba mbo inata otito nke sitere naanị n'aka Chineke? Unu echela na m gaebo unu ebubo n'ihu Nna m. Ọ bụ Mosis, onye unu tụrụkwasịrị obi, gaebo unu ebubo. Ọ bụrụ na unu kwenyere na Mosis, unu gaara ekwenye na m, n'ihi na Mosis dere banyere m n'Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na unu ekwenyeghị n'ihe ndị o dere, olee otu unu gaesi kwere n'okwu m?"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu