Wenezde Izu Uka Nke Anọ N’Oge Ncheta Ahụhụ Kraịst : Frances of Paola Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Isa 49: 815
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 145: 89. 13cd14. 1718
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Jọn 5:17:30
- Oziọma
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Isa 49: 815
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Nke a ka Chineke kwuru; “Mgbe unu kpokụrụ m, azara m unu; n'oge nzọpụta enyeere m unu aka. Echekwara m unu, were unu mee ọgbụgba ndụ mụ na ndị mmadụ, enyeghachiri m unu ala ahụ, kesara unu akụnụba a gbahapụrụ agbapụ. Ọ naagwa ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ, ‘Pụta’, ndị nọ n'ọchịchịrị ‘Gosipụta onwe unu.’ Ha gaeri nri n'okporo ụzọ. Aga m azụ ha nri n'ugwu ebe ahịhịa naadịghị. Agụụ mmiri ma ọ bụ nri agaghị agụ ha. Ikuku kpụ ọkụ n'kịta ma ọ bụ oke anyanwụ agaghị achagbu ha, maka onye ahụ nwere ebere n'ebe ha nọ naedu ha; O gaeduga ha n'akụkụ mmiri. Aga m eme ugwu m niile ha bụrụ okporo ụzọ, mee okporo ụzọ m niile ka ha kpọọchịrịam. Lee, ha si n'ebe dị anya naabịa, ụfọdụ si ebe mgbago na ebe ọwụwa anyanwụ, ndị ọzọ si n'ala Sinim.” Eluigwe na ihe niile dị n'ime ya nurịa anụrị; ugwu niile kweenu ukwe ọṅụ maka na Yahweh agọzila ndị nke ya. Ọ gaemere ndị nke ya nọ na nsogbu ebere. Mana Zayon siri, “Onyenwe anyị agbahapụla m, Chineke echefuola m.” Nne ò nwere ike ichefu nwa ya naara ara, nke na ọ gaghị enwe obi ebere n'ebe nwa o mụrụ amụ nọ? Ọ bụrụgodị na ha nwere ike ichefu, agaghị m echefu unu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps: 145: 89. 13cd14. 1718
Azịza: Onyenwe anyị bụ onye amara na onye obi ebere.
1. Onyenwe anyị bụ onye amara na onye obi ebere,
ọ naghị ewe iwe ọsọsọ, o juputara n'ịhụnanya.
Onyenwe anyị naegosi mmadụ niile obiọma ya,
ebere nke Onyenwe anyị naerute ihe niile O kere.
Azịza: Onyenwe anyị bụ onye amara na onye obi ebere.
2. Onyenwe anyị dị ntụkwasị obi n'okwu niile,
ya na omume ya niile juputara n'obi ebere.
Onyenwe anyị naazụ ndị naadaghị ada,
O naekulite ndị akụdarala n'ala.
Azịza: Onyenwe anyị bụ onye amara na onye obi ebere.
3. Onyenwe anyị dị mma n'ụzọ ya niile;
ọrụ aka ya niile naegosi ịhụnanya ya.
Onyenwe anyị nọ nso ndị niile naakpọku ya,
ndị ji ezi obi naakpọku ya.
Azịza: Onyenwe anyị bụ onye amara na onye obi ebere.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
“N'ihi na Chineke hụrụ ụwa n'anya otu a,
nke na o nyere naanị otu nwa ya ka onye ọ bụla nke kweere na ya
ghara ila n'iyi kama ka o nwee ndụ ebebe.”
Alleluia
OZIỌMA : Jọn 5:1730
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jisọs zara ndị Juu sị, “Nna m naarụ ọrụ n'ewepụghị aka ruo ugbu a. Mụ onwe m naarụkwa n'ewepụghị aka.” Nke a mere ndị Juu ji chọọsi ike ụzọ ha gaesi gbuo Jisọs. N'ihi na ọ bụghị naanị na o naemebi iwu ụbọchị izu ike, kama o naekwukwa na Chineke bụ Nna ya, naemekwa ka ya na Chineke hà. Jisọs gwara ha sị: “N'ezie, agwa m unu, Nwa apụghị ime ihe ọ bụla n'onwe ya naabụghị naanị ihe ọ hụrụ Nna ya naeme. N'ihi na ihe ọ bụla Nna naeme ka Nwa ya naemekwa. Ọ hụrụ Nwa ya n'anya, naegosikwa ya ihe ọ bụla O naeme. O gaegosikwa ya ọrụ ebube karịrị ndị a ka o wee ju unu anya. Dị ka Nna si akpolite ndị nwụrụ anwụ ma nye ha ndụ, otu a ka Nwa ya si enye ndị masịrị ya ndụ. Nna anaghị ekpe onye ọ bụla ikpe, kama o werela ike ikpe ikpe niile nye Nwa ya. O mere otu a ka mmadụ niile naasọpụrụ Nwa ahụ dịka ha si asọpụrụ Nna ya. N'ihi na onye ọ bụla naadịghị asọpụrụ Nwa ahụ adịghị asọpụrụ Nna ahụ zitere ya. Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla nke nụrụ okwu m ma kweere na onye nke zitere m nwere ndụ ebebe, a gaghị ama ya ikpe, kama o sitere n'onwu banye na ndụ. N'ezie, oge naabịa, oge ahụ abịala ugbu a, mgbe ndị nwụrụ anwụ gaanụ olu Nwa Chineke; ndị nụrụ ya gaadịkwa ndụ. Dị ka Nna n'onwe ya si bụrụ isi iyi nke ndụ, otu a ka Nwa ya si bụrụkwa isi iyi nke ndụ. O nyerekwa Nwa ya ike ikpe ikpe n'ihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ ahụ. Nke a atụla unu n'anya n'ihi na oge naabịa mgbe ndị niile nọ n'ili gaanụ olu ya, wee si n'ili ha pụta. Ndị mere ihe ọma gaesi n'onwụ bilie dị ndụ; ndị mere ihe ọjọọ gaesikwa n'onwụ bilie nata ikpe. “Apụghị m ime ihe ọ bụla n'ike aka m; otu m si nụ, ka m si ekpe ikpe. N'ihi nke a, ikpe m ziri ezi, maka na ọ bụghị uche m ka m naeme, kama ọ bụ uche onye zitere m.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu