Monde Izu uka nke ano n'oge ncheta ahuhu Kristi Daniel of Murano Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 65: 17-21
-
Abụọma na azịza ya
Ps 30: 2 and 4, 5-6, 11-12a and 13b
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn 4: 43-54
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Is 65: 17-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Ma lee, ana m eke eluigwe na uwa ohuru, a gaghi echetakwa ihe ndi gara aga, nke ha na-abatakwa ozo n'uche mmadu. Nwee obiuto, ma nuria onu n'ihe m kere, n'ihi ana m eke Jerusalem ka o buru ihe onụ, ka ndi no n'ime ya nwee obianuri. Aga m anuri na Jerusalem, ma nwee obiuto n'ebe ndi nke m no; a gaghi anu mkpu akwa ozo n'ime ya, mobu akwa ariri. N'ime ya, a gaghi enwekwa umuntakiri ohuru ndi ga-ano abali ole ma ole, mobu ndi okenye na-agaghi anozu ubochi ha. Inwu n'otu narị afọ bu jirwuchu anwuchu; ma ebirughi otu narị afọ na-egosi abumonu. Ha ga-aru ulo ma birikwa n'ime ha; ha ga-ako ubi osisi vain ma riekwa mkpuru ha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 30: 2 and 4, 5-6, 11-12a and 13b
Azịza: Aga m eto gi, O Chineke, n'ihi na i zoputala m.
Aga m eto gi, O Chineke, n'ihi na i zoputala m,
Ikweghi ka ndi iro m merie m.
Chineke, i zoputala m n'ala mmuo,
Naani m ka ị zoputara na ndi dabara n'onu onwu.
Azịza: Aga m eto gi, O Chineke, n'ihi na i zoputala m.
2. Unu ndi kwudosiri ike na Chineke, kuoronu ya egwu chetanụ,
Ịdi nso ya, ma toonu ya Iwe ya anaghi ete aka,
Ma amara ya na adigide n'oge abali, ịkwa akwa
Na-adi ma ka chi boro anuri na-adi.
Azịza: Aga m eto gi, O Chineke, n'ihi na i zoputala m.
3. Nuru olu m, ma meere m ebere,
Chineke Chineke buru onye enyemaka m.
I meela ka ịru uju m ghoo onu.
Chineke na Chukwu m, aga m eto gi ebeebe.
Azịza: Aga m eto gi, O Chineke, n'ihi na i zoputala m.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Jesu wee si ya, "Abu m mbilite na onwu na ndu,
onye obula kwere na m agaghi anwu ma oli."
Alleluia
OZIỌMA : Jn 4: 43-54
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jon dere
Mgbe ubochi abuo ahu gachara, Jesu siri n'ebe ahu puo gaba Galili. Jesu n'onwe ya gbara akaebe si, "A dighi asopuru onye amuma n'obodo ya." Mgbe o rutere na Galili, ndi obodo ahu nabatara ya nke oma, n'ihina ha onwe ha gara Emume Ngabiga na Jerusalem, hu nnukwu oruebube niile o ruru n'oge Emume ahu. Jesu bjaruru Kena nke di na Galili ozo, ebe o mere mmiri ka o ghoo mmanya. N'obodo Kapanaum o nwere otu nwoke na-ejere ndi ochichi ozi, onye ahu na-adighi nwa ya. Mgbe o nuru na Jesu esila na Judia bia Galili, o gakwuru ya, rio ya ka o bja Kapanaum gwoo nwa ya n'ihina nwa ya no n'onu onwu. Ma Jesu siri ya, "O buru na unu ahughi ihe iribaama na oruebube, unu agaghi ekwe ma oli." Nwoke ahu na-ejere ndi ochichi ozi siri ya, "Nnamukwu, bia ngwa ngwa tupu nwa m anwuo." Jesu siri ya, "Laba, nwa gi nwoke ga-adi ndu." Nwoke ahu kweere n'okwu Jesu gwara ya, wee laba. Ma mgbe o na-ala, umuodibo ya zutere ya n'uzo si ya, "Nwa gi nwoke di ndu." O juru ha oge ahu bidoro diwa ya mma. Ha asi ya, "Unyahu, n'elekere mbu nke ehihie ka ahuoku hapuru ya." Nna nwata ahu wee mata na o bu n'oge elekere ahu Jesu gwara ya si, "Nwa gi nwoke ga-adi ndu." N'ihi nke a ya na ezinuulo ya niile wee kwere. Nke a bu oruebube nke abuo nke Jesu ruru mgbe o siri na Judia bia Galili.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu