Fraide Izu Uka nke Atọ n’oge ncheta ahuhu Kristi: Sixtus III Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hos 14:2-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 81:6c-8a. 8bc-9. 10-11ab. 14 and 17
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 12:28-34
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Hos 14:2-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hoseya
Izrel loghachikwutenu Yahweh Chineke unu; n'ịhịa ọ bụ njo unu wetaara unu iso ngongo. Loghachinu azụ n'ebe Yahweh nọ, ma gwa ya si, "Gbaghara anyi njo anyị niile, nabata ihe dị mma, anyị ga-ejikwa onu anyị kwupụta otito gi." Asiria enweghi ike izoputa anyi, anyị agaghikwa agba inyinya ọzọ, ma kpọọ ihe aka anyị mere Chineke anyị. Na gi ka ndị enweghi nne na nna na-enweta ebere. "Aga m agwa enweghi okwukwe ha. Aga m eji obi m niile hụ ha n'anya, maka na iwe m esila n'ebe ha nọ pụọ. Aga m adakwasị Izrel ka igirigi, ọ ga-achapụ dịka okooko lili, gbasapukwa mgborogwu dịka osisi Sida nke Lebanon. Ọ ga-epụta ome ọhụụ, maa mma dịka osisi Oliv, ọ ga-enwe isioma dịka osisi nke Lebanon. Ha ga-alọghachi azụ buru na ndo m, ha ga-abawanye dịka ọka a kụrụ n'ugbo. Ha ga-achapụtala dịka osisi vain, nwekwara isioma dịka mmanya nke Lebanon. Gịnị ozokwa ka Ifrem ga-eji ụmụ arusi mee ebe ọ bụ m na-aza ekpere ya, na-elekota ya anya? Adị m ka osisi Saipres anaghị agba akwụkwọ. Ọ bụ m na-enye ya mkpụrụ ọ na-amị. Ka onye ma ihe ghọta okwu ndị a. Ka onye nwere uche ghọta ihe ha pụtara, maka na ụzọ nke Yahweh ziri ezi, ndị ezi omume na-aga na ya, mana ndị omenyo na-aso ngongo.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 81:6c-8a. 8bc-9. 10-11ab. 14 and 17
Azịza: Abụ m Oseburuwa Chineke unu, nuruunu olu m.
1. Anụrụ m olu, ma amazighi ka. Ọ na-asi,
"Ebupụrụ m unu ibu aro unu bụ n'ubu.
Anapụrụ m unu ọrụ ndị ahụ unu na-arụ."
Mgbe unu nọ na nsogbu, unu kpọụrụ m; m zọpụta unu.
Azịza: Abụ m Oseburuwa Chineke unu, nuruunu olu m.
2. Esi m n'ebe m zoro n'egbeigwe zaa unu,
anwara m unu na mmiri nke Meriba.
Geenụ ntị, ndị nke m, ka m doo unu aka na ntị!
O Izrel, ọ bụru na unu ga-ege m ntị!
Azịza: Abụ m Oseburuwa Chineke unu, nuruunu olu m.
3. Unu enwela chi ọzọ n'etiti unu;
unu esekpụla chi ndị mba ọzọ.
Abụ m Oseburuwa Chineke unu,
onye duputara unu n’ala Ịjipt.
Azịza: Abụ m Oseburuwa Chineke unu, nuruunu olu m.
4. A sị na ndi nke m ga-ege m ntị,
a si na Izrel ga-eso ụzọ m.
Aga m eji ọka dị mma zuo unu nri,
were mmanụ anụ si n’okwute nyejuo unu afọ."
Azịza: Abụ m Oseburuwa Chineke unu, nuruunu olu m.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndu,
ọ bụ gị ji ozi nke ndu ebighi ebi.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 12:28-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ma otu onye odeakwụkwọ bjarutere nu ka ha na Jesu na-arurita uka. Mgbe ọ hụrụ na Jesu zara ajụjụ ndị Sadusii nke ọma, o jụrụ ya si, "Olee iwu kacha n'ime iwu Chineke niile?"
Jesu zara ya si, "Nke mbụ bụ nke a: 'Nụrụnu, ụmụ Izrel, Oseburuwa Chineke anyị bụ otu. Ị ga-eji obi gị niile, mmụọ gị niile, uche gị niile na ike gị niile hụ Chineke n’anya.' Nke abụọ bụ: 'Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya ka i si hụ onwe gị n’anya.' Ọ dịghị iwu ọzọ ka ndị a." Onye odeakwụkwọ ahụ zara ya si, "Onyenkuzi, ị zara nke ọma, ị kwuru n’ezie na Onyenweanyi bụ Chineke dị otu, na ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wepụ ya; Ị ji obi gị niile, nghọta, na ike gị niile, hụ ya n’anya na ịhụkwa mmadụ ibe gị n’anya ka onwe gị, ka mkpa karịa aja nsureokụ na aja ndị ọzọ a na-achụpụ Chineke." Mgbe Jesu hụrụ na o zara nke ọma, O gwara ya si, "Ị nọghị aka n’alaeze nke Chineke."
Mgbe nke a mechara, egwu ekwekwaghi onye ọbụla juo ya ajụjụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu