Wenezde Izu Uka nke Atọ n’oge ncheta ahuhu Kristi Ludger Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dt 4:1.5-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps 147:12-13. 15-16. 19-20
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 5:17-19
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Dt 4:1.5-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ditronomi
Mgbe ahụ, Mosis gwara ụmụ Izrel si, "Dobenu iwu niile m na-akụziri unu. Unu ga-adikwa ndu biri n'ala ahụ Yahweh, bụ Chineke nna unu, na-enye unu. Akụziri m unu iwu ahụ niile, dịka Yahweh, bụ Chineke m, gwara m ka m mee. Dobenu ha mgbe unu ruru n'ala ahụ unu ga-abanye, ibiri n'ime ya. Werenu ikwesi ntukwasi obi dobe ha. Nke a ga-egosi mba dị iche iche na unu ma ihe. Mgbe ha nuru ihe banyere iwu a niile, ha ga-asi, ‘Leekwanu ụdị amamihe na nghọta mba ukwu nke a nwere!’ "N'eziokwu, o nweghi nnukwu mba ọzọ chi ha nọ nso dịka Oseburuwa, bụ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe ọ bụla anyị kpọụrụ ya. O nwekwara nnukwu mba ọ bụla nke iwu niile na-achị ha ziri ezi, dịka iwu ndị a m kuziiri unu taa! "Ya mere, kpachara anya! Hukwanu na ndu unu niile, unu echefughị ihe ndị a unu jiri anya unu hụ. Kooronu ụmụ unu na ụmụ ụmụọrụ unu."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 147:12-13. 15-16. 19-20
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi,
1, Jerusalem too, Onyenweanyi,
Zayon too, Chineke gi,
n'ihi na ọ bụ ya mere onụ̀zo amagi.
niile ka ha sie ike, o na-agozi ụmụ gị niile.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi,
2. O na-etiri ụwa iwu, okwu ya àgazuo ụwa nile ọsọ- ọsọ
O na-atusa mkpuru mmiri ọcha n'ala dị ka ute,
na-efesasi igirigi dị ka ntu.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi,
3. O na-ekpughere ụmụ Jekob okwu ya,
Na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.
O naghi emere mba ndị ọzọ otu a,
Ọ naghi akuziri ha iwu ya.
Azịza: Jerusalem too, Onyenweanyi,
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
O bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ,
kama site n'okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.
Alleluia
OZIỌMA : Mt 5:17-19
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya si: "Unu echekwala na m biara imebi iwu Mosis na nkuzi ndị amụma. Abịaghị m imebi ha; kama abịara m imejuputa ha. "N’eziokwu, agwa m unu, ruo mgbe eluigwe na ala ga-agabiga, ọ dịghị otu ihe ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dikarichara nta, nke a ga-esi n’iwu Chineke wepụ ruo mgbe e mezuru ha niile. "Ya bụ, onye ọbụla ga-emebi otu n’ime iwu ndị a, ọ bụladị nke dikarichara nta, ma kuzikwaara ndị mmadụ ime otu ahụ, ga-abụ onye dikarichara nta n’alaeze eluigwe. "Ma onye ọbụla na-edobe ha, ma na-akuzikwa ha, ga-abụ nnukwu mmadụ n’alaeze eluigwe."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu