IKWUPUTA ITURU-IME NKE ONYENWEANYI

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 7: 10-14; 8: 10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 40: 7-8a, 8b-9, 10, 11
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Heb 10:4-10
- OziọmaLk 1:26-38
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Is 7: 10-14; 8: 10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Yahweh gwakwara Ahaz ozo si ya, "Rịọ Yahweh Chineke gị akara ọbụla; ọ sọọkwa, ya buru nke si n'ala mmụọ ma ọ bụ nke si n'eluigwe." Mana Ahaz kwuru sị, "Mba, agaghị m arịọ ihe ọbụla, agaghị m anwale Yahweh." Ọ wee sị, "Nụrụnụ nke a, unu ụlọ nke David niile! Ọ bụụrụ unu obere ihe na unu na-eme ndị mmadụ ka ike gwụ ha, unu ji bịa ime Chineke m otu aka ahụ? N'ihi nke a, Yahweh n'onwe ya ga-enye gị akara. Lee, otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke; aha ọ ga-akpọ ya bụ Imanụel." Gbaanu izu otu ọbụla masịrị unu, ọ gaghị enwe isi; kwụọnu ihe ọbụla masịrị unu, ọ gaghị ere! N'ihi Chineke anyị nonyeere anyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 40: 7-8a, 8b-9, 10, 11
Azịza: Anọ m ebe a, Onye nwe m, a biara m ime uche gị.
1. Ị naghị achọ ichụ aja, ọ bụ ihe nrúnye kama nti ghee oghere.
Ị naghị achọ aja nsureọkụ, ọ bụ aja maka njọ,
kama ekwuru m sị, "Anọ m ebe a, ana m abia.
Azịza: Anọ m ebe a, Onye nwe m, a biara m ime uche gị.
2. N'ime akwụkwọ iwu e dere na m tosiri ime uche gị.
Chineke m, ahụrụ m iwu gị n'anya, eji m obi m niile hụ ya n'anya.
Ekwupụtara m ezi omume nke Onye nweanyi na nnukwu ọgbakọ.
Lee, emechighị m ọnụ m, ị maara nke a, Onye nweanyi.
Azịza: Anọ m ebe a, Onye nwe m, a biara m ime uche gị.
3. Ọ nwebeghị mgbe m jụrụ ikwuputa ezi omume gị,
kama ekwupụtara m nkwudosiike na enyemaka nzoputa gị.
Ahapụghị m ikwuputa jhunaanya na nkwudosenke gị n'ihu nnukwu ọgbakọ.
Azịza: Anọ m ebe a, Onye nwe m, a biara m ime uche gị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: Heb 10:4-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Ọ bụ ihe agaghị ekwe omume na ọbara oke ehi na ewu ga-asachapu njọ. N'ihi nke a, mgbe Kristi bịa n'ụwa, o kwuru sị, "Ọ bụghị aja na onyinye ka ị chọrọ, kama ọ bụ ahụ ka ị kwadobere m. Aja nsureọkụ na aja mgbaghara njọ anaghị enye gị obi ụtọ. Mgbe ahụ ka m kwuru sị, "Lee, abjara m ime uche gị, o Chukwu, dị ka e dere banyere m n'akwụkwọ nso." O kwuru na mbụ sị, "Aja onyinye, aja nsureọkụ na aja mgbaghara njọ adịghị amasị gị nke ha na-enye gị obi uto" (A chụrụ aja ndị a dị ka iwu si di). O kwukwara sị, "Lee, abjara m ime uche gị." Chineke emebiela aja mbụ iji malite nke abụọ. Site n'ime ya bụ uche Chineke, e mere ka anyị dị ọcha site n'aja ahụ, Jesu ji onwe ya wee chọọ na aṅani otu ugboro.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Okwu ahụ bụụrụ mmadụ wee binyere anyị.
Ọ jupụtara n'amara na eziokwu.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 1:26-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N'onwa nke isii, Chineke zigara Mmuọoma Gabriel ka ọ gaa n'obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwunye ya kwekoritara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n'agbiiru David, ga-alu. Aha nwa agbọghọ ahụ bụ Maria. Mmuọoma ahụ bịakwute Maria sị, "Ekele, i jupụtara na grasia, Oseburuwa nonyeere gị!" Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n'ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere itule n'uche ya ihe ụdị a pụtara. Mmuọoma ahụ siri ya, "Atula egwu, Maria, n'ihina ị nàtala ngozi n'aka Chineke. Lee, ị ga-adi ime, mụta nwa nwoke; aha ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adi ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu. Dinwenu Chineke ga-enye ya ọchieze nna ya David. Ọ ga-achị ezi nụlụ Jekọb ebe ebe; alaeze ya agaghị enwe ogwugwu." Maria jụrụ Mmuọoma ahụ sị, "Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na amaghi m nwoke?" Ma Mmuọoma ahụ zara ya sị, "Mmuo Nsọ ga-abiakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N'ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ ị ga-amu; Onye nso, nwa Chineke. Lee, Elizabet, onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n'agadi ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N'ihina ebe Chineke nọ, ọ nweghị ihe nyiri omume." Maria kwuru sị, "Lee, abụ m òdibo nwaanyị nke Oseburuwa, ka o ree m ka ị siri kwuo." Mmuọoma ahụ wee si n'ebe ọ nọ pụọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu