Monde Izu uka nke ato n'oge ncheta ahuhu Kristi, Catherine of Sweden Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Kgs 5: 1-15b
-
Abụọma na azịza ya
Ps 42: 2. 3; 43: 3.4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 4: 24-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: 2 Kgs 5: 1-15b
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ndi Eze
Naaman, onye isi agha nke Siria, bụ nwoke di ukwu n'ihu nna ya ukwu, n'ihina site na mgbali ya ka Yahweh ji nye Siria mmeri. Nwoke a bụ dike n'agha, ma ọ bụ onye ekpenta. N'otu n'ime agha ha busoro Izrel na mberede, ndị Siria dotara otu ntakịrị nwaagbogho, onye nke mechara buru odibo nwunye Naaman. Nwata a gwara nne ya ukwu si, "A si na nna m ukwu ga-agakwuru onye amuma nke bi na Sameria! O ga-agwo ya orja ya."Naaman jekwuru nna ya ukwu kosara ya kpomkwem, ihe niile nwatakịrị ahụ kwuru. Eze Siria zara ya si, "Gaba ugbu a, aga m enye gị akwukwozi! Ga-enye eze Izrel." O gabara, were talent ọlaocha iri, puku shekel ọlaedo isii na uwe emume iri. O wetaara eze Izrel akwukwozi ahụ nke ihe e dere n'ime ya bụ, "Akwukwozi a bụ iji gwa gị na ezitere m nwodibo m bụ Naaman ka ị gwoo ya orja ekpenta ya." Mgbe eze ndị Izrel guru akwukwozi ahụ, o dowaa uwe ya kwuo si, "Abu m Chineke onye onwu na ndu dị n'aka mere nwoke a jiri zitere m ozi ka m gwoo onye ekpenta? Hukwanu otu nwoke a si achọ m okwu!" Mgbe Elisha, onye nke Chineke, nuru ka eze ndị Izrel siri dowaa uwe ya, o zigaara ya ozi juo ya si, "Kedu ihe kpatara gị jiri dowaa uwe gị? Gwa nwoke ahụ ka o biakwute m, o ga-amata na e nwere onye amuma n'ala Izrel."Ya mere, Naaman jiri jnyinya ya na ugbojnyinya ya bia guzoro n'ọnụ ụzọ ụlọ Elisha. Elisha zipụrụ onye ozi ka o gwa ya si, "Gaa saa ahụ n'osimiri Jodan ugboro asaa, ahụ gị ga-adịkwa gị mma ọzọ." Naaman jiri iwe na onụma tụgharịa, laba, na-ekwu si, "Echere m nnoo na o gaara apụta, guzoro, kpokuo aha Yahweh Chineke ya, fegharia aka ya n'elu ebe ahụ, gwoo m orja m. O bụ na osimiri Abana na Fapa nke dị na Damaskos adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? O bụ na enweghi m ike ịsa ahụ n'ime ha wee dị ọcha?"Ya mere, o tụgharịa laba n'iwe. Ndi odibo ya biakwutere ya si ya, "Nna anyị ukwu, a sị na ihe onye amuma gwara gị mee bụ ihe siri ike, o bụ na ị gaghi eme ya? Ma nke a bụ na o gwara gị na ị saa ahụ ka ị dikwa ọcha." Ya mere, o gara sunye onwe ya n'ime osimiri Jodan ugboro asaa dịka Elisha gwara ya. Anụ ahụ ya wee dikwa mma dịka ahụ nwatarịrị.Mgbe ahụ, Naaman na ndị ozi ya laghachiri jekwuru onye nke Chineke ahụ si ya, "Ugbu a, amatala m na e nweghi chi ọzọ n'elu ụwa belụsọ n'ala Izrel. Biko nara ihe onyinye ekele sitere n'aka nwodibo gị."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 42: 2. 3; 43: 3.4
Azịza: Akpiri na-akpọ n'okwu maka Chineke, Chukwu nke ndi dị ndụ, kedu oge m ga-ahu ya ihu na ihu?
1. Dika otu agụ mmiri si na-agu nne ele,
otu ahụ ka agụ si na-agụ m maka gị, O Chineke m.
Azịza: Akpiri na-akpọ n'okwu maka Chineke, Chukwu nke ndi dị ndụ, kedu oge m ga-ahu ya ihu na ihu?
2. Akpiri na-akpọ m n'okwu maka Chineke,
Chukwu nke ndi dị ndụ,
kedu oge m ga-enwe ike jee hụ ihu nke Chineke?
Azịza: Akpiri na-akpọ n'okwu maka Chineke, Chukwu nke ndi dị ndụ, kedu oge m ga-ahu ya ihu na ihu?
3. Ziputa ìhè gị na eziokwu gị ka ha na-edu m,
Ka ha dubata m n'ugwu gị dị nso ebe i jiri mere ebe obibi.
Azịza: Akpiri na-akpọ n'okwu maka Chineke, Chukwu nke ndi dị ndụ, kedu oge m ga-ahu ya ihu na ihu?
4. Mgbe ahụ, aga m aga n'ebe nchuaja nke Chineke,
Chineke nke bụ anuri m. Aga m eji anuri were ubo too gị,
Onyenweanyi, Chineke m.
Azịza: Akpiri na-akpọ n'okwu maka Chineke, Chukwu nke ndi dị ndụ, kedu oge m ga-ahu ya ihu na ihu?
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Taa, ọ bụrịrị na unu anụrụ olu ya,
unu akpochila obi unu.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 4: 24-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe Jesu bjaruru Nazaret, ọ gwara ndị mmadụ nọ n'ụlọ nzukọ okwu si: "N'ezie agwa m unu, a naghị anabata onye amuma ọ bụla n'obodo a mụrụ ya." E nwere ọtụtụ umunna na-isi mkpẹ n'Izrel n'oge Elaija. Mgbe e mechiri eluigwe mmiri ezoghikwa afọ atọ na ọnwa isii, mgbe oke ugani dara n'ala ahụ dum; ma ọ naghị ezu onye n'ime ha e zigaara Elaija, ma ọ bụ naani otu nwaanyị ajadu nke bi n'obodo Zarefat, nke dị n'ala Sajdon. Otutu ndị ekpenta nọkwa n'ala Izrel n'oge Elisha; ma ọ naghị ezu onye ọ bụla n'ime ha e mere ka ọ dị ọcha, ma ọ bụ Neeman, Onye Siria."Mgbe ndị niile nọ n'ụlọ nzukọ ahụ nuru okwu ndị a, iwe juputara ha n'obi. Ha biliri, kwapụ ya n'obodo ha, kpuru ya ruo n'otu ugwu nta a rukwasara obodo ha n'elu ya ka ha si ebe ahụ kwadaa ya. Ma O michapụrụ onwe ya n'aka ha, si n'etiti igwe mmadụ ahụ laa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu