SONDE UKA NKE ATO N'OGE NCHETA AHUHU KRISTI Psalter Week 3 Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Exodus 3: 1-8a, 13-15
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 103: 1-2, 3-4, 6-7, 8, 11 (8a)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1 Corinthians 10: 1-6, 10-12
- OziọmaLuke 13: 1-9
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Exodus 3: 1-8a, 13-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Opupu
N'oge ahụ, Mosis na-echekwa igwe atụrụ ọgo ya nwoke, Jetro, onye nchuaja nke Midian. Ọ duuru igwe atụrụ ndị ahụ gaa n'akuku ọdida anyanwụ ozara wee gara na Horeb, bụ ugwu nke Chineke. N'ebe ahụ ka mmụọ-ọma nke Chineke biakwutere ya n'ụdị ire-oku na-enwu n'ime ọjị, ma ọ naghị erepịa ahụhụ dị n'ohia ahụ. Mosis wee kwuo, sị, "Aga m aga nso ma lee ihe ịtụnanya nke a mere na ahụhụ ndị a dị n'ohia, anaghị ere oku." Mgbe Chineke hụrụ ka ọ tụgharịrị ka o hụ ihe na-eme, ọ si n'ime ọjị ahụ kpoo ya oku, sị, "Mosis!, Mosis!" O zara ya, sị, "Anọ m ebe a." Yahweh sị ya, "Abiakwala nso; yipu akpukpo ukwu gị n'ihina ebe ị guzoro bụ ala nso." Chineke gwakwara ya, sị, "Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aizik, na Chineke nke Jekọb." Mosis weere kpuchie ihu ya n'ihina egwu, n'ihi na ọ na-atụ egwu ile Chineke anya n'ihu.Yahweh gwara ya, sị, "Ahụrụ m ahụhụ ndị nke m nọ na Ijipt. Anụrụ m mkpụrụ akwa ha banyere onu a na-echi ha n'ala. Akwado m ịzọpụta ha site n'aka ndị Ijipt, iduputa ha site n'ala Ijipt na iduba ha n'ala ọma ahụ, ala sara mbara, ala juputara na mmiri ara ehi na mmanụ, ala ebe ndị Kenaan, ndị Hit, ndị Amo, ndị Periz, ndị Hiv, na ndị Jebus bi." Mosis jụrụ Chineke, sị, "O buru na m agwa ụmụ Izrel, sị, 'Chineke nke nna unu ha zitere m n'etiti unu,' ha jụọ m, sị, 'Gịnị bụ aha ya? Gịnị ka m ga-agwa ha?" Chineke zara Mosis, sị, "ABỤ M ONYE M BU." Q gwakwara ya, sị, "Gwa ụmụ Izrel nke a, 'Abụ m' zitere m unu. Chineke gwakwara Mosis, sị, "Gwa ụmụ Izrel nke a, 'Yahweh, Chineke nke nna unu ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aizik, na Chineke nke Jekọb, zitere m nye unu.' Nke a bụ aha m ebee, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndudugandu ruo na ndudugandu."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps: 103: 1-2, 3-4, 6-7, 8, 11 (8a)
Azịza: Dinwenu bụ ebere na ihunanya.
1. Mkpuruobi m nye Dinwenu ekele.
Ka ihe niile m ji buru mmadụ gozie aha nso Ya.
Mkpuruobi m nye Dinwenu ekele. E chefukwala ngozi Ya niile.
Azịza: Dinwenu bụ ebere na ihunanya.
2. O bu Ya na-agbaghara mmehie gị niile.
Ya bụ onye na-agwo oria niile;
onye na-esi n'ili a kpoghachi ndụ gị.
Ihunanya na ebere bụ okpu eze ọ nyere gị.
Azịza: Dinwenu bụ ebere na ihunanya.
3. Dinwenu na-eme ihe ziri ezi.
O na-ekpere ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi.
Ọ kuziiri Mosis ụzọ Ya; Gosikwa ụmụ Izrel aka ọrụ Ya.
Azịza: Dinwenu bụ ebere na ihunanya.
4. Dinwenu bụ ebere na ihunanya;
ọ naghị ewe iwe. Ọ bụ oku ebere Ya ebuka.
Otu eluigwe si di anya n'ebe ala dị otu ahụ ka ihunanya
Ya si sie ike n'ebe ndị na-aturu Ya egwu nọ.
Azịza: Dinwenu bụ ebere na ihunanya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: 1 Corinthians 10: 1-6, 10-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbu Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
Achọrọ m ka unu mata, ụmụ nna m, ihe Chineke mere ndị nna anyị ha, ndị soro Mosis n'ozara. Igwe ojii zeere ha ndo, duru ha niile gafee osimiri uhie n'udo. N'ime igwe ojii ahụ, na n'ime oke osimiri ahụ, e tinyere ha niile mmiri Chineke dịka ndị na-eso ụzọ Mosis. Ha niile soro rie otu nri nke mmụọ ahụ. Ha niile soro nuo otu ihe onunu nke mmụọ ahụ. Ha nuru mmiri nke mmụọ nke si n'okwute ahụ na-edu ha pụta, ma okwute ahụ bụ Kristi n'onwe ya. N'ihe ndị a niile, omume ọtụtụ n'ime ha amasịghị Chineke. N'ihi nke a e fesara ọzu ha n'ebe dị iche iche n'ozara. Ugbu a, ihe ndị a niile bụ uru anyị iji dokwuo aka na ntị ka anyị ghara inwe agụ ihe ọjọọ otu ha siri nwee. Mgbu tamuo ntamu dịka ụfọdụ n'ime ha tamụrụ, mmụọ nke mmebi wee laa ha n'iyi.Ugbu a, ihe ndị a niile mere ha dị ka ihe ịdo aka na ntị, ma e dere ha iji wee kuziere anyị ihe, ndị nọ n'ogwu-gwu oge. Ya mere, onye ọ bụla na-eche na ọ kwudosiri ike, ka ọ kpachara anya ka ọ ghara ida.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Dinwenu kwuru, sị:
"Chegharịa, n'ihi na alaeze eluigwe adịla nso."
Alleluia
OZIỌMA :Luke 13: 1-9
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
O nwere ụfọdụ nọ ebe ahụ n'oge ahụ, ndị kọọrọ Jesu maka ndị Galili, ndị Pajlet gburu, were obara ha gwokota n'ihe aja ha. Jesu wee jụọ ha, sị, "Unu chere na ndị Galili ndị a nwụrụ n'ụzọ dị otu a bụ ndị mmehie karịrị ndị Galili ndị ọzọ? Agwa m unu, mba; ma ọ bụrụ na unu echegharịrị, unu niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ. Mobu, kedụ maka mmadụ iri na asatọ ndị ulọnche elu dakwasịrị, tigbuo ha na Siloam, unu na-eche na ha bụ ndị ọjọọ karịrị ndị niile bi n'obodo Jerusalem? Agwa m unu, mba; belụsọ ma unu chegharịrị, unu niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ."Jesu ji ukabuilu gwa ha, sị, "Otu nwoke nwere osisi fiig nke ọ kụrụ n'ubi ya, ọ bịa chọọ mkpụrụ n'elu ya, ma ọ hụrụghị. Ọ wee sị onye na-elekọta ubi ya, 'Lee, kemgbe afọ atọ ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n'osisi fiig a, ma ọ hụrụghị. Ya mere, gbudaa ya, gịnị mere ọ ga-eji na-eriko nri dị n'ala ubi?' Ma o zara ya, sị, 'Nna m ukwu, hapụkwa ya n'afọ a, kam gwuo ala gburugburu ụkwụ ya, wunye ya agwụgbu. Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ n'afọ ọzọ, ọ dị mma, ma ọ bụrụ na ọ naghị mịa, ị nwere ike gbudaa ya.'"
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu